Bayelsa and Kogi Elections: Taa bụ oge a kara aka na ntuliaka Kogi na Bayelsa Steeti

Ntuliaka

Ụbọchị ndị bịara tupu ụbọchị ntuliaka jupụtara oke ndọrọndọrọ n'etiti People Democratic Party, PDP na All Progressive Congress, APC bụ pati isi okpokpo abụọ na-ama aka ọkwa gọvanọ na steeti abụọ ndị a.

E nweela ọgbaghaara dị ịche iche n'ihi nke a dịka nke mere n'ọgbakọ ndị PDP na Nembe ebe e gburu ihe ruru mmadụ abụọ ma merụọ ọtụtụ ndị ọzọ ahụ.

Otu ihe ahụ mere na Kogi steeti ebe a wakporo isi ụlọọrụ otu Social Democratic Party, SDP.

Ụfọdụ ndị bu egbe wakporo otu ụlọ ndina ebe gọvanọ Oyo Steeti bụ Seyi Makinde nọ n'ụbọchị Fraide.

Na Kogi Steeti, pati iri abụọ na anọ ga-eso zọọ ọkwa gọvanọ na ntuliaka 2019, mana ndị mmadụ na-ahụta naanị pati abụọ APC (Yahaya Bello) na PDP (Musa Wada) dịka ndị kachasị gbapụta ihe.

Yahaya Bello na Musa Wada nke Kogi Steeti

Ebe foto si, Alhaji Yahaya Bello/Musa Wada/Facebook

Na Bayelsa Steeti, ruo mgbe ụlọikpe kachapụrụ aha David Lyon (APC) na Douye Diri (PDP), ha abụọ bụ ndị kachasị pụta ihe n'ịzọ ọkwa a.

Mana ụlọọrụ Inec sị na pati abụọ ndị a ka so na-azọ ọkwa a.

David Lyon na Diri Douye nke Bayelsa

Ebe foto si, David Lyon/ Diri Douye Facebook

Ndị debanyere aha ịtụ vootu na Bayelsa dị 867,088 ebe 769,609 anatala kaadị vootu ha nke pụtara pasentị 83.35 dịka ụlọọrụ Inec si kwuo.

Ngwa ọrụ e ji eme ntuliaka

Ka ọ dị ugbua, ngwa ọrụ niile e ji eme ntuliaka a erutele ebe niile a na-edebanye aha bụ Registration Area Centres (RAC) n'okpuruọchịchị asatọ dị na Bayelsa Steeti ruo na wọọdụ niile nakwa ebe niile a na-atụ vootu n'okpuruọchịchị iri abụọ na otu dị na Kogi Steeti.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Rice processing: Usoro e ji emepụta osikapa ọdịnala