Nigerians in Ghana: Gịnị na-esere ụmụ Naịjirịa na ndị Ghana ọzọ?

Ụlọahịa a gbachiri agbachi
Nkọwa foto, Ụlọahịa ụmụ Naịjirịa a gbachiri agbachi na Ghana n'ọgbaaghara dapụtara n'ọnwa Nọvemba

Kamgbe Mọnde, abalị atọ nke ọnwa Disemba, ka ụmụ Naịjirịa na-azụ ahịa na Ghana nọ na gbagharịa ọzọ.

Akụkọ kwuru na ọtụtụ n'ime ha akpọpebeghi ụlọ ahịa ha kamgbe Monde n'ihi na ụmụokorobịa Ghana ji igodo gbachie ha niile.

Ekene Mmadugha, otu onye Naịjirịa nọ na Ghana azụ ahịa gwara BBC Igbo na ya bụ ihe na-akawanye njọ.

N'okwu ya: "Izuuka abụọ gara aga ka ndị isi ahịa gwara anyị na ha nyere anyị otu izuuka ka anyị kwara laa."

Aha onyonyo, Ndị Ghana agbachiela ụlọ ahịa ndị Naịjirịa ọzọ

"Anyị kọsaara ndị uweojii maka nke a mana onweghị ihe ha mere."

"Mgbe anyị pụtara n'ụbọchị Monde, anyị hụrụ na ụlọahịa anyị niile gbachiri agbachi."

"Ụfọdụ gara kụwaa igodo e ji gbachie ụlọahịa ha, nke a mere ka ọgbaaghara daa."

Aha onyonyo, 'Mkpagbu ndị Gana na-akpagbu anyị o nweghị onye na-ebe ya ndị Ghana na Naijiria'

Ụfọdụ ziteere BBC Igbo ihe onyonyoo na-egosi ebe ụfọdụ ụmụ Naịjirịa na-akụpụ igodo e ji gbachie ụlọọahịa ha.

Ka ọ dị ugbua amabeghi ma o nwere onye merụrụ ahụ na ya bụ ọgbaaghara.

Gịnị na-ese?

Aha onyonyo, Ọnọdụ anyị ebe a dị ka ọnụdụ ụmụnne anyị na South Africa - Ndị Naịjirịa nọ Ghana

E nwere iwu mba Ghana nke gbochiri ndị mbịarambịara ire ahịa n'aka n'aka n'ala ha bụ nke a kpọrọ 'retail' na bekee.

Aha iwu a bụ 'Ghana Investment Promotion Act' nke afọ 2013.

Iwu a kwukwara na onye mbịarambịara chọrọ imepe ahịa na Ghana ga-etinye ihr ruru otu nde dọla ($1m) n'ahịa ahụ.

Mana ndị obodo na-ekwu na ụmụ Naiịjrịa nọ be ha azụ ahịa ejizughi otu nde dọla azụ ahịa.

Ya mere ha ji chọọ ka ha niile kwara laa.

Gịnị ka gọọmentị na-ekwu?

Abike Dabiri

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Abike Dabiri katọrọ mmechi ọdụ ahịa ụmụ Naịjirịa na Ghana

Gọọmentị Naịjirịa katọrọ ya bụ mmechị ọdụ ahịa ụmụ Naịjirịa na Ghana.

Abike Dabiri, bụ onye na-ahụ maka ụmụ Naịjirịa bị na mba ofesi kwuru na ya bụ ihe jọgburu onwe ya.

Mana ọ rịọrọ ka onye ọbụla ghara imebi ihe maọbụ gaa ọgụ n'ihi na gọọmentị na-eleba anya n'okwu ahụ.

Alan Kyerematen

Ebe foto si, Twitter/@AlanKyerematen

Nkọwa foto, Mịnịsta Ghana na-ahụ maka azụmahịa na mmepụta ngwaahịa bụ Alan Kyerematen

N'aka nke ọzọ, gọọmentị Ghana ekwubeghị ihe ọbụla.

BBC gbara mbọ ịkpọtụrụ Mịnịsta Ghana na-ahụ maka ahịa bụ Alan Kyerematen.

BBC gbakwara mbọ ịkpọtụrụ onyeisi ndị uweojii na Ghana bụ David Asante-Apeatu.

Mana mbọ ndị a amịtaghị mkpụrụ n'ihi na ozi e zigara n'akara 'e-mail' ha lọghachiri azụ.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Onye kwesiri isi nri n'ụlọ: Di ka ọ bụ nwunye?