Omoyele Sowore: Ụlọikpe enyela iwu ka atọhapụ nwa amadi a

Omoyele Sowore

Ebe foto si, Instagram/@yelesho

Nkọwa foto, Omoyele Sowore

Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja enyela iwu ka atọhapụ Omoyele Sowore.

Onye nyere iwu a bụ Ọkaikpe Ijeoma Ojukwu n'ụbọchị Fraịde, abalị anọ nke ọnwa Ọktoba afọ 2019.

Ọkaikpe Ojukwu nyekwara iwu ka a tọhapụ Olawale Bakare bụ onye e ji ya na Sowore.

Mana ụlọikpe ahụ kwuru na Sowore ga-akwụ otu narị nde naịra ebe Bakare ga-akwụ nde naịra iri ise tupu ha enwere onwe ha.

Ọkaikpe Ojukwu dọkwara mmadụ abụọ ahụ aka na ntị ka ha ghara isonye na ngagharịiwe ọbụla n'ọdịnihu.

Ojukwu kwukwara na Sowore na Bakare ga-anọgiderịrị n'ime obodo Abuja.

Cheta na otu ụlọikpe enyebuola iwu ka a tọhapụ Sowore, mana ndị DSS kachiri ntị ka jide ya.

Omoyele Sowore bụ onye ndu pati African Action Congress

Ebe foto si, Sowore2019/Facebook

Nkọwa foto, Sowore zọrọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka e mere n'ọnwa Febrụawarị afọ a. Ọbụkwa ya bụ onye nhazị ngagharịiwe a kpọrọ 'RevolutionNow'.

Ọbụ ndị uweojii nzuzo a kpọrọ 'Department of State Service' (DSS) jichiri Sowore na Bakare kamgbe onwa Ọgọst.

Ndi DSS boro ha ebubo na ha na-achọ ịkwatu ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buhari.

E bokwara Sowore ebubo iji ụzọ nzuzo bupu ego dị puku kwuru puku dọla.

Mana Sowore na Bakare sị na aka ha dị ọcha n'ebubo ndị ahụ e boro ha.

Akụkọ na-abịa.