Nnamdi Kanu: 'Ụzọ m sị gbapụ na Naịjirịa adịghị nfe'

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Getty Images

Nnamdi Kanu agwala ndị ntaakụkọ etu o si zọọ isi onwe ya mgbe ndịagha Naijirịa biara iwakpo ya n'afaraukwu, Ụmụahia, Abia steeti.

Lee ihe iri gbara ọkpụrụkpụ ọ gwara ha:

  • Ọ bụ n'obodo Azumiri ka o si gbapụ na Naijirịa.
  • O si Azụmiri banye Bene, Togo, Gana, Ịvorị Kost tupu o were rute Senegal.
  • O kwuru na ọ meruru ahụ mgbe ndị agha wakporo ụlọ ya nke mere na okwesiri i na aṅụ ọgwụ maka ndụ ya.
  • Nnamdị Kanu si na ha nọrọ n'oke oshimiri izuụka abụọ n'ime ntakịri ụgbọ.
  • Ya na ndị ya na ya so nọ na oshimiri Atlantik, ma otutu mgbe ka ebili mmiri chọrọ ikpu ụgbọ ha.
  • Ụjọ ndị nchekwa Naijirịa na-arụ ọrụ n'ofesi tụrụ ya.
  • Kanu si na onweghi ike igwa nwunye ya na ezinulo ya ebe ọ nọ maka ndị nchekwa inye ha nsogbu.
  • O sị na ọ bụ Senegal ka o si were gbaba mba Isreal.
  • O kwukwara na o were ya afọ atọ i banye mba Isreal.
  • 'Na Isreal ka obi m laturu ala ma ndụ m enwee nchekwa' dịka Kanu siri kwuo.
Aha onyonyo, Ihe Charly Boy kwuru maka ndị ndọrọndọrọ na ndị ntoroọbịa

N'aka nke ọzọ, Nnamdị Kanu site n'aka ọkaiwu ya bụ Ifeanyi Ejiofor, gwara ụlọikpe Naijirịa na ọ dị njikere ịbịa zara ọnụ ya ma ọ bụrụ na ha ga-echekwa ya.

Mana ọkaiwu gọọmentị bụ Labaran Shuaibu ekwenyeghi na nke ahụ, bụ nke mere Ọkaikpe Nyako ji buga ikpe ruo ụbọchị iri na isii nke ọnwa Jenụwarị 2020.

Aha onyonyo, Nnamdi Kanu: Azikiwe tinyere ndi Igbo n'ọmị ha nọ na ya

Akụko ga-amasị gị