Nnamdi Kanu: 'Ụzọ m sị gbapụ na Naịjirịa adịghị nfe'

Ebe foto si, Getty Images
Nnamdi Kanu agwala ndị ntaakụkọ etu o si zọọ isi onwe ya mgbe ndịagha Naijirịa biara iwakpo ya n'afaraukwu, Ụmụahia, Abia steeti.
Lee ihe iri gbara ọkpụrụkpụ ọ gwara ha:
- Ọ bụ n'obodo Azumiri ka o si gbapụ na Naijirịa.
- O si Azụmiri banye Bene, Togo, Gana, Ịvorị Kost tupu o were rute Senegal.
- O kwuru na ọ meruru ahụ mgbe ndị agha wakporo ụlọ ya nke mere na okwesiri i na aṅụ ọgwụ maka ndụ ya.
- Nnamdị Kanu si na ha nọrọ n'oke oshimiri izuụka abụọ n'ime ntakịri ụgbọ.
- Ya na ndị ya na ya so nọ na oshimiri Atlantik, ma otutu mgbe ka ebili mmiri chọrọ ikpu ụgbọ ha.
- Ụjọ ndị nchekwa Naijirịa na-arụ ọrụ n'ofesi tụrụ ya.
- Kanu si na onweghi ike igwa nwunye ya na ezinulo ya ebe ọ nọ maka ndị nchekwa inye ha nsogbu.
- O sị na ọ bụ Senegal ka o si were gbaba mba Isreal.
- O kwukwara na o were ya afọ atọ i banye mba Isreal.
- 'Na Isreal ka obi m laturu ala ma ndụ m enwee nchekwa' dịka Kanu siri kwuo.
N'aka nke ọzọ, Nnamdị Kanu site n'aka ọkaiwu ya bụ Ifeanyi Ejiofor, gwara ụlọikpe Naijirịa na ọ dị njikere ịbịa zara ọnụ ya ma ọ bụrụ na ha ga-echekwa ya.
Mana ọkaiwu gọọmentị bụ Labaran Shuaibu ekwenyeghi na nke ahụ, bụ nke mere Ọkaikpe Nyako ji buga ikpe ruo ụbọchị iri na isii nke ọnwa Jenụwarị 2020.







