David Lyon nke APC emeriela PDP n'okpuru ọchịchị 6 n'ime 8 dị na Bayelsa steeti

Ebe foto si, @iamLyondavid
Onye zọrọ ọchịchị n'okpuru pati "All Peoples Congress" (APC) na Bayelsa Steeti bụ David Lyon ejirila vootu 352552 buru onyeisi na ntuliaka eji họpụta aka ga-achị steeti ahụ ruo afọ anọ n'abịa.Onye gbara nke abụọ bụ Diri Duoye zọrọ ọchịchị n'okpuru pati "Peoples Democratic Party" (PDP) bụ onye nwetere vootu 133172.
Ya bụrụ na Inec akpọ ya dịka onye meriri, David Lyon ga-anara Maazị Serike Dickson ọkwa dịka gọvanọ nke ise ga-achị steeti ahụ kemgbe ọchịchị onye kwuo uche ya laghchitere n'afọ 1999.

Ebe foto si, @IamDouyeDiri
Njem Maazị Lyon na ntuliaka a mere ka ihe bịara na njedebe tupu Ụlọikpe Mpesa pụtara n'ụbọchị nke 15 nke ọnwa Nọvemba sị ka Inec ghara ịnabata mkpebi Ụlọikpe Ukwu na Bayelsa sị ka Inec wepu aha ha.
Ka ọ kwụ ugbua, Inec kpebiri na aha pati APC ga-esonye na ya bụ ntuliaka makana adịghị enwe aha mmadu na akwụkwọ ntuliaka.
Dịka Ụlọikpe siri kwuo, na-agbanyeghi ihe ọbụla, Lyon ka bụ onye na-efere APC ọkọrọtọ na ntuliaka nke pụtara na o bụ ya ga-anara asambodo mmerị.
Ihe bụ mbụ a ga-anapụ ọchịchị n'aka PDP na Bayelsa kemgbe 1999.
Akụkọ ka na-abịa.





