Ọkụ n'Onicha: 'O! Gọọmentị echefuola anyị'

Ebe foto si, Getty Images
Ndị na-azụ ahịa n'mpaghara n'ahia Onicha gbara ọkụ n'izu uka garaaga ka na-ebe akwa na gọọmentị echefụola ha.
Ahịa gbara okụ di na ebe a na-akpọ "Onicha industrial area". Ọ gbara ọkụ na-aka elekere 11 nke abalị na-ụbọchị 14 n'onwa Febụrụwarị.
Otu onye nọ mgbe ihe mberede a mere aha ya bụ Dubem gwara BBC Igbo n'elu ekwentị na ihe ha hụrụ bụ "nnukwu awụlụ ọkụ".
Ha si na onweghị onye mara ebe ọkụ a malitere. Mana ebe ọkụ a na-agbasị ike bụ na-ebe a na-edepụta akwụkwọ, bụ ebe nwere kemikal dị icheiche.

Ebe foto si, Getty Images
"Gọọmentị steetị anyị echefuola anyi, ihe niile na-eme anyi anaghị emetụta ha na-ahụ. N'afọ garaaga, ọkụ gbara ahịa nke a anyi na-ekwu maka ya," Dubem gwara BBC Igbo.
Dubem kwuru: "Ọkụ gbara ahịa nke a ruru nde naira iri na isi. Anyi dere ndị steeti gọọmentị akwụkwọ, rịọ kwa ha maka nyemaka, mana onweghị ihe amere, ruo ugbua."
O kwukwara na ndị na-azụ ahịa na-ebe ka nọ kwa na yabụ ahia.
"Ebe ka ha ga-eje?" Dubem juru.
"A ka nọ na ebe ahụ. Anyị na-arịọ gọọmentị ka ha mere anyị ebere. Onweghị onye ọzọ ga-enwe ike ị zọpụta anyị," Dubem kwuru.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:









