Ntorobia na-azọpụta ụmụaka bi n'ezi na Naịjirịa

Ebe foto si, Street Priests
N'akwụkwọ ozi anyị sị n'aka ndị ntaakụkọ mba Afrika, ode akwụkwọ Adaobi Tricia Nwaubani nyochara ka otu ntorobia sị azọpụta ụmụaka bi n'ezi.
James Okina anaghị ezobe ihe njọ niile, mgbe ọ bụrụ ụmụaka: ohi; ohị n'ụlọ ahịa.
"Aka m ba n'ọtụtụ ihe ọjọ," o kwuru.
Okwu nke a bụ nkwuputa njọ na-atụ na-anya.
Nke a bụ maka Okina bụ onye ntorobia.
Mana ọ na-enye ekele maka afọ nke a bụ afọ nke atọ o bidoro ị zọpụta ọtụtụ ụmụaka bi'ezi na Calabar n'ime Cross River steeti.
O kwuru na o bido omume nke a maka: Onye mbu bụ nwannaya, onye nke abụọ bụ otu oberenwa dị afọ iri na atọ ọ hụrụ n'ọgbọ egwuregwu bọọlụ n'afọ ọ gụchasị akwụkwọ sekọndarị.
'Ọtụtụ ihe m kwesịrị ime'
Aha obere nwa nke a bụ Fredrick, o so kwa na ọtụtụ narị umuaka bi n'ezi na Calabar.
Ọtụtụ n'ime ha si Bakassi gbaa ọsọ ndụ gbaba agbataobi ha bụ Cameroon.
Ezinaụlọ di icheiche achụọla ndị ha bo ebubo amusu.
Mana Frederick nwere ezinaụlọ nke ha. Ya na mma ya bi na-otu ime ụlọ. Mana mma ya ahapuola ya. Ugbu a, ọ bụrụ ya na-enye onwe ya nrị.

Ebe foto si, Government House Media
Dịka ụmụaka ndị ọzọ bị n'ezi, Frederick na enyi ha bụ Kelvin na-arịọ arịrịọ ego.
Okina bidoro i hụ ha abụọ na-enyekwa ha nrị.
"Enyi mmu na ha bụ maka mkparịta ụka anyị, ọ bụghị maka ego ma ọ bụ nrị," Okina kwuru.
Mana Okina enweghị ọtụtụ ego.
N'oge ahụ, ọ na-arụ ọrụ n'ụlọ ọrụ maka ejiji. Mana olileanya ha bụ ị bụrụ onye ga-enwe ụlọ ọrụ nke ha."
Mana ọ mara na ndị ụmụaka a chọrọ nyemaaka.
Maka ihe a, ya na otu nwoke akpọrọ Inyang Edem kwetakwa na ya ga-akwụ ụgwọ ụlọ akwụkwọ Frederick na Kelvin.
'Ekwesịghị ị che ka e chịeghị ọchịchị'
Oge ahụ ka Okina nwere mkpebi ị nye ụmụaka a nyemaka.
Oge ahụ ka o bidoro Street Priests Inc.
"Mgbe ndị mmadụ na-ajụ gọọmentị ajụjụ maka ọchịchị ha, ị ga-achọ ị me nyemaka ike gị.
"Ekwesịghị ị che ka e chịeghị ọchịchị, ihe a mere eji akpọ anyi Street Priests," ọ kọwara.

Ebe foto si, Street Priests
Okini jịrị Facebook na ụzọ ndị ọzọ chọpụta ego maka ịkwụ ugwọ akwụkwọ ụmụaka ruru iri ise.
Ọ ka na-aga kwa ile ta umuaka bi n'ezị na Calabar.
Ke mgbe, ụmụaka niile mara onye Okini bụrụ.
Oge ọbụla a hụrụ ya, umuaka hụrụ ha na agbasa ike ga makụọ ya.
'Obi esighi ha ike'
Afọ atọ agafeela, Okina bụ nwata akwụkwọ na-agụ akwụkwọ maka nlekọta akụnauba na mahadum nke Calabar.
Okini dị afọ iri na asatọ rịọ egọ ị kwu ugwọ akwụkwọ ụmụaka ruru 215. Ndị ọrụ ya ruru 50.

Ebe foto si, Street Priests
"Enweghị m echiche ị chọ ọrụ, mana aga m e ji omume nke a wulị aka ọrụ m."
Street Priests ahụọla ihe sịrị ezigbo ike.
Dika otu n'ime ha achọrọ ị gbu makana ozuru ohi.
Ọzọ jịkwa ike gbanashị ọnwụ makana ọ ṅụ ọgwụike.
Ndị atọ ọzọ nwụrụ maka otu oshịshị eletrik dakwashịrị ha.
Onwe otu nwoke gbanahụ ndị ogbu arụ ọbara. A jiri mma gbuka ha ihu.
"Otụtụ mmadụ kwụrụ na ndị umuaka bi n'ezi jiri obi ike, mana mmu wa kwuru na ihe a abụghị eziokwu," Okina kwuru.
"Ihe a mere ndị na-ebi n'ezi jiri si obi ike makana ha hụrụ ka ha sịrị gbu enyi ha. Ha kwuru na uwa ebughị ha n'uche."
Okina mara ihe putara na-onweghị ihe gbasara ya na-emetuta.

Adaobi Tricia Nwaubani

Ebe foto si, Adaobi Tricia Nwaubani
"Ndụ ya dịbụ mma tụgharịrị oge ọ dị afọ asatọ ka nne na nna ya gbara onwe ha alụkwaghị m"

Ndụ nke ya mmere mmebi n'oge o ruru afọ asatọ.
Nne ya hapụrụ ya. Ugbua ka ọ jị ndị ajọ enyi mere enyi. Ọ dara n'ụlọ akwụkwọ, bido kwa i zu ohi.
"Uwa anaghị egbu oge ị nye gi ajọ aha. Ọtụtụ mmadụ anaghị achọ onye ga-agwa ha na ihe a na-eme dị njọ."
'Akwa mmịrị'
Mana nyemaka Okina di nso. Nwa nna ya bi na Lagos kpanitere mmụọ ya.
"O nyere ndị ntorobịa n'akwụkwọ sekọndarị na ụlọ ndị agha akwụkwọ di icheiche. Omume nke a bụ ihe kpalitere m n'obi."

Ebe foto si, Street Priests
Oge ya na nwanna ya nwere mkparita uka, Okina nwere nchekwa na ya ga-enwe nchegharị.
Ọ bidoro itinye uchu n'akwụkwọ ya, n'oge na-adịghị anya ọ laghachịrị n'ịbụ onye nke mbụ na klaasị ya.
"Ọtụtụ ndị na-eso ndị Street Priests arụ ọrụ bụ ndị ụmụakwụkwọ ibe m mara ka omume m sịrị dị n'oge garaaga, ha hụrụ nchegharị nke m. Ha na-enye aka n'ikpanite mmụọ umuaka ndị a."
Nne ya sokwa na ndị na-enye aka n'ọrụ nke a na nkwuzi asụsụ bekee. Nna ya nwuru n'afọ garaaga.
Ugbu a, Street Priests na-enye ndị bi na ogige ndị gbara ọsọ ndụ bi nyemaka.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ikike nwatakịrị kwesịrị ime so kwa na nyemaka ha na-enye.
Nke bụ nke kachasị ọrụ makana ọtụtụ mmadụ anaghị ekwe enyepụ ebe mgbakọta makana mmemme nke a gbasara ndị ụmụaka bi n'ezi.
"Echiche m bụ ị nweta ebe a ga akpọ nke anyị," o kwuru.
N'ọnwa Dezemba n'afọ 2017, Street Priests mere mmemme ị kele ndị n'arụlụ ha ọrụ.
Edem, bụrụkwa onye nyere Okina ego ugwụọ akwụkwọ nke Frederick na Kelvin, nara ekele puruiche, o bere akwa aṅụrị.
"Oge niile o nyere m ego, ọmaghị na ihe ọhụrụ ka o bidoro n'uwa taa," Okina kwuru.








