Ebonyi State: Ihe mere ụmụnwaanyị ji gbara ọtọ mee ngagharịiwe

Ụmụnwaanyị ewela iwe

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Foto a abụghị nke ụmụnwaanyị Ebonyi

Akụkọ pụtara na ụfọdụ agadi ụmụnwaanyị ruru otu narị sị na Agubia dị n'Ikwo gbaọtọ ma buru ngagharịiwe gaa n'isi ọchịchị Ebonyi steeti.

Akụkọ sị na Ụmụnwaanyị a kpọrọ oku sị ka gọvanọ Dave Umahi nye iwu ka ndị uweojii tọhapụ ụmụ ha bụ ndị uweojii nwụchiri.

Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ebonyi steeti bụ Loveth Odah sị na o juru ya anya ịhụ ụmụnwaanyị a na-eme ngagharịiwe.

Ọ sị na a nwụchiri ụmụ ha maka ọgbaghara mere n'izuụka atọ gara aga ebe ha kpọrọ ụfọdụ ụlọ nakwa ụgbọala ọkụ. Na okwu ha ka nọ n'ụlọikpe ugbua.

Ọ sị ngaghariiwe a na-egosi na ụmụnwaanyị a na-akwado ihe ọjọọ ụmụ ha na-eme.

BBC Igbo kpọrọ gọọmentị Ebonyi Steeti mana ha sị na ha anụghị maka nke a.

Ihe anyị ga-eji kwado mbite ego - Onyeisi ụlọomeiwu

Senate President Ahmed Lawan

Ebe foto si, Twitter/@DrAhmedLawan

Nkọwa foto, Onyeisi ụlọ omeiwu ukwu bụ Ahmed Lawan kwuru na nkọwa Buhari nyere maka mbite ego ahụ doro ha anya

Onyeisi ụlọ omeiwu ukwu bụ Ahmed Lawan akọwaala ihe ha ga-eji kwadoo arịrịọ maka mbite ego ọhụrụ bụ nke onyeisiala Muhammadu Buhari rịọrọ ha.

Lawan nyere nkọwa a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Abuja n'ụbọchị Mọnde.

Ọ kọwara na ha bụ ndị omeiwu ga-akpachapụ anya iji hụ na ego ahụ ga-aba n'ọrụ.

Cheta na ụlọomeiwu nke gara aga ekweghị akwado ka Buhari bite ego ahụ.

N'oge ahụ, Bukola Saraki onye bụ onyeisi ụlọ omeiwu ukwu na ndị otu ya jụwara isi na gọọmentị agaghị ebite ego ahụ.

Bukola Saraki na Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Bukola Saraki akwadoghị mbite ego ahụ oge ọ bụ onyeisi ụlọ omeiwu

Mana Buhari weghachiri arịrị ahụ azụ n'abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Nọvemba.

Lawan kwuru na ihe kpatara ndịomeiwu ji kagbuo atụmatụ mbite ego ahụ n'oge gara aga bụ maka na onyeisiala akọwaghịrị ha ọfụma.

O kwuru sị, "ugbua, ha akọwaala ya nke ọma. O doola anya ihe ha chọrọ iji ego ahụ mee."

Ụlọikpe akụchapụla akwụkwọ a gbara Ganduje

Governor of Kano State Abdullahi Umar Ganduje

Ebe foto si, kanostate.gov.ng

Nkọwa foto, A na-ebo gọvanọ Ganduje ebubo ịna aka azụ

Ụlọikpe na Kano akụchapụla akwụkwọ otu onye ọkaiwu gbara gọvanọ Umar Ganduje gbasara ebubo iri ngari.

Ọkaiwu ahụ chọrọ ka ụlọikpe nye iwu ka EFCC nyochaa Ganduje, mana ụlọikpa kụchapụrụ ya n'ihi na iwu Naịjirịa akwadoghi inyocha onye ji ọkwa Gọvanọ.

Ọgụ adaala na Pako dị n'Aguda, Surulere

Pako Aguda dị na Surulere

Ọtụtụ mmadụ anwụọla n'ihi tigbuo na zogbuo dapụtara n'ebe a na-akpọ Pakọ, Aguda dị na Surulere Lagọs.

Onye ntaakụkọ BBC bi nso n'ebe ahụ sị na ọ bụ ndị na-azọ onye ga-abụ onyeisi ndị ntoroọbịa na-alụ ọgụ.

O kwuru na a lakwara ọtụtụ ngwongwo na ụlọ obibi ndị mmadụ n'iyi.

Otu onye ọzọ bi na gburugburu ebe ahụ sị na ụlọọahị niile sị n'ebe ahụ agbachiela.

Okwe Champions League agbaala

Ịtụakwụkwọ champions league

Ebe foto si, AFP/Getty Images

N'egwuregwu, a tụọla akwụkwọ nke Champions League taa ị mata ndị ga-ezute ibe ha na agba nke otu egwubọọlụ iri na isii foduru.

N'ime ya Borussia Dortmund nke Germany ga-ezute Paris Saint Germain nke France, Real Madrid nke Spain ga-ezute Manchester City in England.

Atalanta BC nke Italy ga-ezute Valencia CF nke Spain.

ClubAtletico de Madrid nke Spain ga-ezute Liverpool FC nke England.

Chelsea FC nke England ga-ezute FC Bayern Munchen nke Germany.

Olympique Lyonnais nke France ga-ezute Juventus nke Italy.

Tottenham Hotspur nke England ga-ezute RB Leipzig nke Germany, ebe SSC Napoli nke Italy na ndị FC Barcelona nke Spain ga-agwu.

N'otu aka ahụ ka Arsenal, Celtic nakwa Manchester United ga-amata ndị ha ga-agba n'asọmpị Europa League mgbe a ga-atụ akwụkwọ ha n'ehihie taa bụ Monde.

A ga-amalite ịgba Champions League n'ọnwa Febụwaị afọ 2020.

Ụmụejima anọ awuchie n'Enugwu

Ụmụejima

Ebe foto si, Cajethan Adiela/Facebook

Ụzụ tụrụ na Mother of Christ Specialist Hospital Enugwu ụbọchị Satọde mgbe otu nwaanyị mụrụ ejima anọ.

Akụkọ anyị nụrụ bụ na Enugwu gbara ụmụaka ahụ nkiri ka akụkọ ha banyere obodo ahụ.

Ụfọdụ n'ime ha gakwara ebe ahụ ịkụrụ ya bụ onyinye nke mkpụrụ afọ n'aka nne ha.

Nna ụmụ ejima ahụ bụ Cajetan Adiele sị na ọṅụ jụrụ ya afọ ọkachasị ka isi nwụnye na ụmụ ya gbara iche n'udo.

Adiele sị na nke a bụ afọ ime mbụ kemgbe ha gbachara akwụkwọ na ọnwa ọktoba 2018.

Ọkụ agbaala n'Ibadan

Ọkụ ọgbụgba

Ebe foto si, Getty Images

N'ime abalị sọnde ka ndị mmadụ na-ekwo ụra ka ọkụ tapịara ngwa ahịa dị nde kwuru nde nke ụmụ mmadụ n'Ibadan dị n'Oyo steeti.

Ndị mmadụ na-eche na ọ bụ mgbe ndị 'Ibadan Electricity Distribution Company' wetere ọkụ bụ mgbe ya bụ ọkụ bidoro.

Ọgbaaghara n'India

India

Ebe foto si, Getty Images

N'ofesi, Onyeisiala mba India bụ Narendra Modi arịọla ka udo chiaa maka ọgbaghara na-arị ibe ya elu na mba ahụ kemgbe abalị ise.

Ndị mmadụ malitere ngagharị iwe maka iwu ọhụrụ etiri n'India bụ nke nwere ikike ka ndị abụghị ndị ụka alakụba nwee ike ịbata na India.

Lee ka o si kwuru na Champions league afọ a

Akwa akwụọla ọzọ n'OAU

OAU

Ebe foto si, European Photopress Agency

Ah! Onyenkuzi ọzọ bụ Victoria Adeniyi alaala mụọ nke mere ya onyenke atọ n'ime otu izuụka.

Victoria tupu ọ laa mmụọ bụbu osote onyeisi na ngalaba mahadum ahụ na-amụ maka ejije bụ Department of Dramatic Arts.

chetakwa na ndị omekome gbagburu Jerome Elusiyan abalị atọ gara aga.

Tupu nke a eme, ahụrụ Dr Nicholas Igbokwe ebe ọzu ya dọ na ọfis ya.

Dịka ọ dere n'akwụkwọ, onye na-ahụ maka mekọrịta Mahadum ahụ na ndị ọzọ bụ Abiodun Olanrewaju, o kwuru na " ọ dị anyị nwute ka ọnwụ sịrị napụ anyị onyenkuzi ọzọ aha ya bụ Victoria Oluwaremilekun Adeniyi ka o ruchabeghị abali abụọ Jerome Elusiyan hapuru."

Akụkọ kọrọ na ọ bụ Victoria hazichara ihe ejije ndị mahadum ahụ gosiri abali anọ gara aga ma sokwara mee ngagharị ngosi ndị ọkankuzi mere ha jiri pụta ọgbọ na nzuko nke iri anọ na anọ nke mahadum ahụ.

Ndị NIMC akwadoola abụbụ ọrụ

Akwụkwọ njirimara Naịjirịa

Ebe foto si, @nimc_ng

Ndị ọrụ ngalaba Goomentị na-ahu maka njirimara bụ National Identity Management Commission ekwuola na ha adịla njikere igba abụbọ ọrụ maka ụgwọ eji ha na nleghara anya gọọmetị leghara ha.

Onyeisioche ndị ọrụ a bụ Lucky Asekokhai gwara ndi ntaakụkọ na ha na-enye gọọmentị ụbọchị iri atọ na otu nke ọnwa desemba 2019 imegharị ọnodụ ha ma ọbụghi ya ka ha ga dọghachị azụ.

Edgar Lungu sị Amerika laa be ha

Onyeisiala Zambia

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Edgar Lungu onyeisi mba Zambia

Onyeisiala Zambia bụ Edgar Lungu agwala ndị Amerịka ka ha kpọrọ onye nnọchite anya ha n'obodo ahụ bụ Daniel Foote maka okwu okwuru megide nga ha turu ụmunwoke abụo maka mmeko nwoke na nwoke.

Lungu sị na ọchọghị ndi dika foote na mba ha .

Ma cheta kwa na iwu Zambia megidere mmeko nwoke na nwoke.

N'egwuregwu

Manchester City na Arsenal

Ebe foto si, European Photopress Agency

Nkọwa foto, Mgbe Manchester City mere Arsenal mmiri chukwu na be ha (Emirate) ụbọchị ụka

Otu egwu bọọlụ Manchester City ejirila iwe gbanye ndị Arsenal kpakpando n'anya dịka ha ji ọkpụ goolu atọ ha asataghị chaa chaa merie ha.

Mmeri a budatara Arsenal n'ọnọdụ ndị nke itolu na Premiership.

Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Akụkọ ga-amasị gị