Brighton vs Tottenham: Asapụla tottenham ọcha ka azụ ite

Ebe foto si, Getty Images
Oke anya ajụ na-apa ndị Tottenham site n'ọkpụ goolu atọ a na-asataghị otu ndị Brighton ji saa ha isi.
Dịka asọmpi melitere na nkeji 3, Brighton ji otu ọkpụ goolu sị n'aka Neal Maupay sị ndị Tottenham 'Unu abịala'?
Tupu Tottenham ahọta ihe egwu na-akụ, Aaron Connolly nke Brighton nyere ha goolu ọzọ na nkeji 32.
Nke a tinyere Tottenham na gbagharịa dịka ha enweteghi onwe ha ruo na ngwụcha ọkara mbụ.
N'ime ọkara nke abụọ na nkeji 65, nwa amadị Aaron mere onwe ya aha ọzọ mgbe o mezuru goolu ha ọkpụ atọ.
Tottenham siri ọnwụ niile ha nwereike ka ha nyeta ọ bụ naarị otu ọkpụ goolu mana Brighton foro ntụtụ taa na nke a agaghị eme.
Cheta na Bayern Munich gbara Tottenhem ọkpụ goolu asaa asatara abụọ n'ụlọ n'asọmpi Uefa Champions League n'ime izuụka a.
Mmeri a e meriri Tottenham dosara ha na ndị isii n'ogogo tebụlụ Premier League.










