Man Utd agwala Tottenham na akpụkpọụkwụ nwere 'size'

Man U na Tottenham

Ebe foto si, Getty Images

Otu egwuregwu bọọlụ Manchester United edulaala Tottenham na asompi enyi na enyi ha gbara taa.

Asọmpi a, a kpọrọ "International Champions Cup" n'asụsụ Bekee, bụ nke e ji akwado maka mmalite afọ ọhụrụ nke egwuregwu bọọlụ.

Anthony Martial bu ụzọ gbakaa neetị na nkeji 21.

Man U

Ebe foto si, Getty Images

Mana Lucas Moura mere garagara saa ya n'agba nke abụọ.

Ka nkeji 80 na-akụrụ ọnụ, Angel Gomez nyere goolu ọzọ wee sị Tottenham taa kpuchie ọnụ.

Mana obi gbawara ndị Manchester oge e bupuru onye otu ha bụ Eric Bailly maka ahụ o merụrụ.