2019 BUDGET: Kedu etu bọjeti siri metụta steeti ndị n'ala Igbo?

Ebe foto si, gettyimages
Amụma mkpata na mmefu ego na-abụkari ihe omume omenafọ nke gọọmenti ọbụla n'emekarị iji gosipụta ndị ha na-achị ọrụ dị iche ha ga-abagide na-afọ ahụ.
Dịka afọ 2019 na-ebiri ọkụ taa, ọtụtụ mmadụ na-atụ anya na gọọmenti steeti dị iche iche ga-agba mbọ itinye amụma mkpata na mmefu ego nke steeti ha dị iche iche n'ọru, iji mee ka ọnọdụ ndị ha na-achị dịkawanye mma.
BBC Igbo mere nnyocha iji mara ka ọnọdụ mkpata na mmefu nke afọ 2019 na steeti dị iche iche n'ala Igbo siri dị.
Ebonyi

Ebe foto si, Ebonyi state Government/Facebook
Dịka onye Kọmịshọna na-ahụ maka ego na steeti Ebonyị bụ Obinna Nwachukwu siri kwuo, Gọvanọ Dave Ụmahị e binyela aka ka ọbụrụ iwu, na bọjetị nke steeti ahụ pụtara Otu Ijeri narị naịra na Iri asatọ na-asatọ na ụma isii (N188.6b) n'ụbochị iri abụọ na anọ nke ọnwa Disemba, 2018.
Enugu

Ebe foto si, Enugu state govt/fb
Na steeti a ka anyị nwetara akụkọ na mkpata na mmefu ego nke steeti ahụ pụtara Otu Ijeri narị naịra na Itoolu (N109b) ka bụkwa nke nọ n'ụlọ omeiwu steeti ahụ dịka Kọmịshọna steeti ahụ bụ Eucharia Ọfọ siri kwuo.
Abịa

Ebe foto si, Abia state govt/fb
Dịka akụkọ si Enugu siri kwuo, gọọmenti steeti a ka na-ele anya na ndị ụlọ ọgbakọ omeiwu nke Abịa steeti ga-eleba anya na amụma mkpata na mmefu ego nke 2019, pụtara Otu Ijeri narị naịra na iri atọ na itoolu (N139b) na mgbe adịghị anya.
Imo

Ebe foto si, Getty Images
Mgbe BBC Igbo kpọrọ onye Kọmịshọna steeti ahụ na-ahụ maka ego bụ Oriakụ Ugochi Nnanna-Okoro, ọjụwara isi inye nkọwa gbasara ọnọdụ mkpata na mmefu ego nke steeti ahụ nke afọ 2019.
Anambra

Ebe foto si, Anambra state govt/fb
Mbọ niile BBC Igbo gbara ịkpọtụrụ onye Kọmịshọna na-ahụ maka ego na steeti ahụ bụ Ifeatụ Onejeme, n'ekwe ntị, bụ nke kụrụ afọ n'ala n'ihi na ọzaghị oku ekwe ntị ya.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị









