Daily Trust: Mwakpo ndịagha mere megide ha ezighi ezi n'ọchịchị ọhakarasị - Eddie Iroh

Ntaakụkọ

Ebe foto si, Daily Trust

Onye bụ bụ ọnyeisi n'ụlọọrụ Radio Naịjirịa, bụ Dọkịnta Eddie Iroh, akatọọla etu ndị agha Naijiria si wakpo ụlọọrụ mgbasaozi Daily Trust.

O kwuru na ọ bụ eziokwu na ụlọọrụ Daily Trust emeghị ọfụma site n'iwepụta ozi nzuzo ndịagha ji awakpo ndị iro Naijirịa dịka akụkọ si kwuo, ma mwakpo ndịagha Naịjirịa ezighị ezi n'ọchịchị onye kwuo uche ya.

Iroh gwakwara BBC Igbo n'ekwenti na ọ bụrụ n'obodo ebe a na-eme ihe nkeọma, mwakpo a kwesiri ịbụ ọrụ ndị uweojii makana ndịagha na-eji ike eme ihe ha.

O kwukwara na ndị uweojii kwesikwara inweta akwụkwọ ikike site n'ụlọikpe tupu ha emee ihe ọbụla, bụkwa nke a ga-eme n'ụzọ ziri ezi.

Na ntụziaka ya, o kwuru na ọbụrụ na ihe ndị Daily Trust depụtara bụ nke e chere na ọ gahiere ụzọ iwu nchekwa obodo Naijiria, ha kwesiri ka ha mee nkọwa gbasara nke a.

Aha onyonyo, Cyber Crime Law kpụgara m ụlọ mkpọrọ

N'aka ọzọ, onye otu ọrụ ntaakụkọ bụ Maxim Ụzọatụ, katọrọ agwaa ndị agha kpara, ma kọwaa ya dịka nke e mere iji tinye egwu n'ime ndị na-arụ ọrụ ntaakụkọ na Naijiria.

Ọ gakwara n'ihu dụọ ndị ntaakụkọ ọdụ ka ha hie asaa n'anya, ma nyochaa akụkọ ọbụla ha nwetara iji gbanahụ akparamagwa dị otu a.

Ka ọdị, ọnụ na-ekwuru otu agha Naijiria bụ Sani Usman enyela nkọwa, ihe mere ndị otu agha jiri mee mwakpo a megide ụlọọrụ Daily Trust.

O kwuru na ụlọọrụ a dara iwu site n'ibipụta akụkọ gbasara atụmatụ ọrụ ndị agha ji n'aka megide ndị otu Boko Haram, bụ nke o kwuru megidere iwu nchekwa obodo Naijiria,

Akụkọ ndị ga-amasị gị: