Nigeria Election 2019: Oby Ezekwesili ga-etinye anya na nwulite akụnaụba obodo
Akụkọ dị mkpa

Oby Ezekwesili ekwuola na ihe kachasị mkpa ọ ga-eme bụ iwepu ntụkwasị Naịjirịa nwere na mmanụ agbịdị dịka ahịa na-ewebata ego.
O kwuru na ọ bụ akụnaụba obodo na-agbatu bụ ihe na-ebute nsogbu niile e nwere na obodo Naịjirịa
"Aga m eme ka Naịjrịa nakwa mba ndị ọzọ jịkọọ aka luso ndị na-eyi ndụ egwu agha" ka o kwukwara dịka o kpughere ya bụ usoro n'Abuja taa.
N'agbanyeghi na Oby Ezekwesili bụ aha ama ama, naanị ụfọdụ mmadụ ole na ole bụ ndị pụtara ịkwado ya.
Ọzọ,

Ebe foto si, Magnus Abe/Tonye Cole Facebook
Otu ụlọikpe kachasị na Rịvas steeti akagbuola ntuliaka imeụlọ abụo otu ndọrọndọrọ APC mere na steeti ahụ nke pụtara na onweghi onye ga-anọchị anya APC n'ịzọ ọkwa gọvanọ na ntuliaka na-abịa.
Mmadụ abụọ ihe a metụtara bụ Magnus Abe na Tonye Cole, bụ ndị malitere ịchụ nta vootu tupu ụlọikpe e mee mkpebi a.
N'otu aka ahụ, ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ Inec, edepụtala ozi kwuru na ndị denyere aha maka ntuliaka 2019 karịrị mmadụ nde iri asatọ na anọ.
N'okwu ego
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ngalaba na-ahụ maka nchịkọta ụtụ isi na Naịjirịa bụ FIRS ekwuola na ego ha ritere n'afọ 2018 niile gafere naịra tarị ise n'ọma.
Na mba ofesi,

Ebe foto si, Gabon TV
Gọọmentị mba Gabon ekwuola na ha anwuchiela ndị agha ise bụ ndị chọburu ị nara ọchịchị n'ike.
N'uche ndị agha ahụ ha chọrọ ịme ka obodo Gabon nwee ọchịchị onye kwuo uche ya
N'egwuregwu,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Otu bọọlụ Delta Force arịọla ndị nso ha mgbaghara dịka otu Bendel Insurance ji ọkpụ goolụ atọ merie ha n'asọmpị Nigeria National League.
Akụko BBC Igbo na nkeji
Ndị agha apụọla n'ụlọọrụ ntaakuko Daily Trust dịka gọọmenti etiti gwara ha

Ebe foto si, Daily Trust
Ọnụ na-ekwuchitere Onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Garba Shehu kwuru na esemokwu ọbụla dị n'etiti ndị agha na Daily Trust bụ ihe ekwesiri iji mkparịtaụka mezie.

Ebe foto si, Uthman Abubakar/Ibrahim Sawab/Facebook
Amabeghi ma ahapụla ndị ntaakukọ Daily Trust abụo ndị agha nwuchịrị.
Ngalaba "Lafia Dole" enwetala ndị ọchịagha ọhụrụ

Ebe foto si, Getty Images
N'akụkọ ọzọ metụtara nke a, ndị agha Naịjirịa ahọpụtara ndị ọchịagha ọhụrụ ha si ga-enye aka ịhụ na-emeriri BOKO Haram.
Akụkọ a si n'ọnụ ọchịagha Sani Usman bụ ọnụ na-ekwuru ndị agha Naịjirịa .
Ọchịagha Usman sị na ndị ga-arụ ọrụ na ngalaba Lafiya Dole.
N'ofesi,

Ebe foto si, Getty Images
Ndị aka ha dị n'ihe nkiri na Hollywood mere emume ntụrụ ugo a kpọrọ "Golden Globe Awards n'abali.
N'emume ahụ, ihe nkiri 'Bohemian Rhapsody' tụrụ ugo dịka ihe nkiri kachasị mma, ebe Onye nkiri Rami Malek so n'ihe nkiri ahụ tụrụ ugo dịka ọkacha eme ihe n'ihe nkiri n'afọ 2018.
Golden Globes bụ ohere ndị nkiri ji akụrụ ndi mere ọfụma n'ihe nkiri n'afọ gara aga aka.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Ọnụ na-ekwuchitere ọgba bọọlụ bụ Wayne Rooney ekwuola na ihe mere eji nwụchie ya n'ihi ịṅụbiga mmanya oke bụ maka enweteghi onwe ya oge ọṅụchara ọgwụ ụra.
A nwụchiri Rooney na Disemba 2018 n'ọdọ ụgbọelu Dulles dị na Virginia ebe e mechara rie ya iwu ọnụ ego dị dọla iri abụọ na ise.
Gee akụkọ ndị a ebe a:
































