Miss World and Miss Universe: Ụwa ekwerela na ụmụnwaanyị isi ojii bụ sọ mma?

- Onye dere ya, Chiagozie Nwonwu
- Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2
Ọ bụ n'abalị iri na anọ nke ọnwa Dicemba ka Toni-Ann Singh bụ nwaafọ Jamaịka tuuru ugo dịka nwaanyị kachasị mma n'asọmpi Miss World.
Mmeri nwaada Singh mere ya ugo ise pụrụche ndị isi ojii ritere n'afọ a.
Ụbọchị abụọ tupu Singh eturu ugo ya, Zozibini Tunzi nke Saụt Afịrịka tutere ugo dịka nwaanyị kacha mma n'ụwa n'asọmpi Miss Universe.
Na mba Amerịka, Cheslie Kryst bụ Miss USA, Kaliegh Garris bụ "Miss Teen USA" ebe Nia Franklin bị "Miss America".
Ihe a bụ mbụ ndị isi ojii ji ọkwa ndị a n'otu oge.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 1
Ihe ntụrụ ugo ndị a jiri bụrụ ọpụrịche bu maka na ha mere n'ogige ebe anaghị ahụkarị ndị isi ojii dịka ndị eji ama atụ mma nwaanyị.
Cheta na nwaafọ Naịjirịa Agbani Darego bụ onye isi ojii mbụ tụru ugo dịka "Miss World" nke o ritere n'afọ 2001.
Ọ bụ Janelle Commissiong bụ onye isi ojii mbụ ritere ọkwa "Miss Universe" n'afọ 1977, dịka Vanessa Williams bụ onye isi ojii mbụ nwetere ọkwa Miss America n'afọ 1983.
Carole Anne-Marie Gist bụ onye mbụ e nyere ọkwa Miss USA n'afọ 1990.
Ibinabo Fiberesima bụ onye na-ahazị ntụrụ ugo "Miss Earth Nigeria" gwara BBC Igbo na ọ bụghị maka mma sọsọ ka ndị isi ojii jiri nọdụ n'ọkwa a ugbua.
Ọ sị: "Ihe mere bụ na ndị mmadu aghọtala ihe ndị na-ahazi emume ọkacha mma nwaanyị na-achọ.
"Ọzọ bụ na ụmụada a gbara ezigbote mbọ ịhụ na ha pụtara n'isi."

Ebe foto si, PA Media
Ọ gakwara n'ihu kwuo na ọbụghị eziokwu na ụfọdụ na-eche na ndi isi ojii amaghi mma.
"Onye Naịjirịa gara emume Miss Earth pụtara n'ime ndị iri. Nke a bu mbụ Naijirịa ruru ọkwa a.
O gosiri na ndị mmadụ na amụta etu esi asọ mpị a ọfụma."
Ọkammụta May Ikeora gwara BBC Igbo na mmeri ndị a ga-enye ọtụtụ ụmụ nwaanyị isi ojii ikike ikwenye na mma ha, ọkachasị ugbua ndị mmadụ na-etinye ọnụ na oke agbụrụ Bekee kpọrọ "Colourism".
Ọ sị: "Ihe a mere dị mma, mana ebe ọ na-emetụ m n'obi bụ ya bụrụkwa ihe ga-esi etu a gawa.
"Ya abụkwana ọnọdụ ibinye aka, ka ọ bụru na a na-eme. Ya bụrụkwa nke ziri ezi."
Ọ gakwara n'ihu kwuo na ihe a na-egosi nnabata n'ụzọ pụrụiche na agwa agbụrụ ojii na ntutu ha bu ihe mara mma.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 2
Fiberesima tinyekwara ọnụ n'agwa onye nọchitere anya Naịjirịa bụ Nyekachi Douglas kpara mgbe e thunyere Singh ugo "Miss World".
Ọ sị na o gosiri obiọma ndi Naịjirịa.
"Nwa ada nọchịtere anya Naịjirịa na Miss Universe bụ Olutosin Araromi kpakwara ụdịrị agwa a oge Zozibini Tunzi nke Sawụt Afịrịka nwetara mmeri.
"Ihe a bu njirimara ndị Naịjirịa. Anyị na-enwe ọṅụ ma ndị mmadụ nwee mmeri."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post









