Orji Kalu: Ihe iwu Naịjirịa kwuru maka oche onye omeiwu ikpe mara

Ebe foto si, Orji Uzor Kalu/Facebook
Okwu na-atụrụ aka chiburu Abia steeti bụ Orji Uzor Kalu mkpọrọ afọ 12 maka nrụrụaka abụghị ihe a ka na-akọrọ onye ma ihe na-eme na Naịjirịa.
Mana, okwu ihe ga-eme oche ya ka bụkwa ụkwa akpụ n'ọnụ.
Maazị Kalu napụru Mao Ohuabunwa oche dịka onye na-anọchịta anya Abia Nọt n'Ụlọ Omeiwu Ukwu na ntụlịaka nke 2019.
Maazị Ohuabunwa gbajọrọ mkpebi Inec were ga kpesara ụlọikpe ntulịaka.
Ohuabunwa chọbụru ka akagbuo ntuliaka emere na Bende na Isikwuato mana n'ubọchị 11 nke ọnwa Nọvemba Ụlọikpe mkpesa kwadoro mmeri Kalu.

Maka onye a mara ikpe, iwu Naịjirịa sị na onye ahu agaghị azọnwụ ọchịchi ruo afọ iri.
Kedu ebe Kalu nọ n'iwu a?

Ebe foto si, Orji Uzor Kalu/Facebook
Ọkaiwu Chijioke Ikeh gwara BBC Igbo na okwu ihe ga-eme oche Orji Uzor Kalu na Ụlọ Omeiwu Ukwu kwụ ọtọ dịka ihe iwu Naịjirịa kwuru bụ na onye ọbụla a mara ikpe n'ụloikpe maka nrụrụaka na mpụ ndị ọzọ agaghị azọ ọchịchị maọbụ kwụrụ ka ndị mmadụ tunyere ha vootu ruo afọ iri.
N'otu aka ahụ, Ọkaiwu Ikeh sị na ugbua ikpe mara Maazị Kalu onwekwarụ ebe iwu Naijirịa dewere ya.
Ọ sị; "Ihe iwu Naịjirịa kwuru bụ na Kalu ka bụkwa omeiwu makana ikpe mara ya oge emechara ntụlịaka ma hopụtaya dịka omeiwu.
"Ihe iwu kwuru bụ na etu ọ nọ mkpọrọ, ọgaghị abịanwụ bịa nọchite anya ndị ọ na-anọchite anya ha ruo ihe gafere ọkara oge a na-ezukọ n'ime afọ, onyeisi Sineti nwere ike kwuo na mmadụ anaghị anọchite anya mpaghara ya."
Ọ gara n'ihu si na ihe a ga abụzị na-enwereike mee ntụliaka ọzọ ji nwete onye ọzo ga-anọchite anya mpaghara o si.
Afọ ole ka Kalu nwereike ịno na mkpọrọ?
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Ka ọ kwụ ugbua, a na-ele anya na Kalu nwereike chọ mkpegharị dịka ọ ka nwere ohere ya, mana ya bụrụ na ọ chịtaghị aja na ya bu mkpegharị, onwereike nọdu ruo afo 12 na mkpọrọ.
Nke a mee, ihe Ọkaiwu Ike kwuru nwereike mee, nke ga-apụta na a ga-azọgharị oche Abia Nọt a n'azụ Kalu.
BBC Igbo gbara mbọ inụta n'ọnụ Mao Ohuabunwa ịmata ma o nwere okwu maka atụmatu ahụ adabaghi.









