Ministerial list: Ụmụ Naijiria akatọọla ndị mịnịsta ọhụrụ

Ebe foto si, Ngige/Ikeakor/Onu/Getty
Ndị mmadụ akatọọla aha ndị mịnịsta ọhụrụ e wepụtara sị ọbụghị ihe a tụụ anya o kwesiri dịka ụmụnwaanyị,ndị na-eto eto nakwa ndị ma ihe a na-akọ n'akụkụ dị iche iche nke akụnaụba esoghị ya.
Onyeisiala Muhammadu Buhari zigarala Ụlọomeiwu Ukwu aha ndị ọ chọrọ dịka Mịnịsta ụbọchị Tuzde.
Nke a na-eme ọnwa abụọ na ụma e dụchara Buhari iyiọrụ n'abalị 29 nke ọnwa Mee, 2019.
N'ime aha mmadụ iri anọ na atọ, Buhari wepụtara, naanị mmadụ asaa bụ ụmụnwaanyị, ebe o nweghị onye pekarịrị afọ iri anọ na ise n'ime ha.

Ọzọ bụ, na agbanyeghị na Buhari kwuburu na ọ ga-eweta ihu ọhụrụ, mmadụ iri na abụọ (12)n'ime iri anọ na abụọ (42) ọ họpụtara bụ ndị rụburu dịka mịnịsta n'agba nke mbụ ya.
Mmadụ isii n'ime ndị a bụbu gọvanọ.
@BenUgbana jụrụ ma Buhari emezurukwara nkwa pasent ole ọ ga-enye ụmụnwaanyị ma o merie?
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
@OlukolaE gogiri obi mwute dịka o jiri ọnụọgụgụ ụmụnwaanyị bụ mịnịsta na Naijiria manyere nke ndị Saut Afrika
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
@Gistiofofo kwuru na ọ bụ ndị ụra gwụrụ n'anya, enweghị ihe ọhụrụ ha ga-ewepụta ka a họpụtara
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
@IddyUdosen kwuru na ihe a hụrụ abụghị ihe a tụrụ anya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
A na-atụ anya na ndị omeiwu ga-ebido ilebanye anya n'aha ndị a ụbọchị Wenezde.
Cheta na ọ bụ mmadụ iri atọ na isii si na steeti iri atọ na isii dị na Naijiria mana o tinyekwuru na họpụtara si na mpaghara isii Naijiria nke mere ha mmadụ iri anọ na abụọ.
Ndị ochie lọghachiri gụnyere:

Ebe foto si, Chris Ngige/ Ogbonnaya Onu-Facebook
1. Senator Chris Ngige- Anambra
2. Ogbonnaya Onu- Ebonyi
3. Geofrey Onyeama - Enugwu
4. Rotimi Amaechi- Rivers
5. Babatunde Fashola- Lagos
6. Adamu Adamu - Bauchi
7. Hadi Sirika - Katsina
8. Lai Mohammed - Kwara
9. Zainab Ahmad - Kaduna
10. Babatunde Fashola -Legọs
11. Abubakar Malami -Kebbi
Ihu ọhụrụ so na ndị mịnịsta gụnyere:

Ebe foto si, Sharon Ikeakor na Uche Ogah
12. Sharon Ikeazor -Anambra
11. Uche Ogah - Abia
12. Emeka Nwajiuba - Imo
13. Senator Godswill Akpabio -Akwa Ibom
14. Festus Keyamo -Delta
15. Sunday Dare -Oyo
16. Senator Tayo Alasoadura- Ondo
17. Olorunnibe Mamora - Lagos
18. Sadiya Farouk- Zamfara
19. Gbemi Saraki - Kwara
20. Isa Pantami- Gombe
21. Akpa Udo- Kros Riva
Aha ndị chịburula dịka gọvanọ sokwa na ndị mịnịsta ọhụrụ a:

Ebe foto si, Twitter/George Akume, Rauf Aregbesola
22. Rauf Aregbesola- Osun
23. George Akume -Benue
24. Timipre Sylva- Bayelsa
25. Adeniyi Adebayo- Ekiti
Ndị mịnịsta ndị ọzọ:
27. Alhaji Sabo Nanono- Kano
28. Bashir Magashi - Kano
29. Baba Shehuri - Borno
30. Paullen Tallen -Plateau
31. Zubair Dada- Niger
32. Maryam Katagun -Bauchi
33. Ramatu Tijani - Kogi
34. Clement Agba- Edo
35. Mohammed Abdullahi -Nasarawa
36. Adamu Adamu - Bauchi
37. Goddy Jedi Agba - Krọs Riva
38. Osagie Ehanire
39. Musa Bello
40. Muhammed Mahmoud - Kaduna
41. Olamilekan Adegbite- Ogun
42. Mohammed Dangyadi-Sokoto
43. Sule Mamman- Taraba








