Conditional Cash Transfer: 'Nye ndị ntorobia N1m' - Peter Obi
N'uche ya, Peter Obi kwuru na ọ bụ ndị ntorobia gụchara Mahadum ka ego ahụ ga-aka baara uru maka iji hazie onwe ha.
O kwuru na ọ bụghị inye ndị mmadụ puku naịra ise (N5000) maọbụ puku naịra iri (N10,000) ga-egbo mkpa ụbịam na ndụ ndị mmadụ.
O kwuru na ihe kwesịrị Naịjirịa ugbua bụ ndị isi ga-ahazi ya bụ obodo na-abụghị ndị ga na-emefu ego ka o si masị ha.
'Conditional Cash Transfer' bụ atụmatụ ọhụrụ gọọmentị etiti manyere iji nyere ndị ụbịam aka nakwa kesaa ego Abacha e si mba ofesi bulata.
Obi na-ekwu na ihe rụrụ pasentị iri isii na ndị ntorobia gụchara mahadum enweghị ọrụ, na ọ bụ ha kwesịrị enyemaka.
O kwuru na Naịjirịa ga-ebili ọzọ ma o nwee ndị na-achị ya ọfụma.









