Coronavirus : A na-eke ihe 'palliative' hapụ ndị nọ na Ndịda Naijiria - Frank Nweke

Frank Nweke

Ebe foto si, Frank Nweke Jr/Facebook

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onye bụbu Mịnịsta na-ahụ maka mgbasaobi bụ Frank Nweke akpokuola gọọmenti etiti ka ha mee ndị ndida ihe e mere ndị Ugwu n'okike ihe enyemaka maka nsogbu ọrịa coronavirus.

Nweke, onye kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere ụbọchị Tọzde sị na-emeghị onye ka e mere ibe ya n'okịke nri na ihe anyamaka gọọmenti etiti kere maka Covid-19.

Ọ sị na e lere anya n'ihu na ike ihe mgbadoume ahụ dịka boro ebubo na ndị Ugwu ka rite elele ahụ karịa ndịda.

"Ile anya n'ihe mere , ebe a kpọchiri bụ ebe ọrịa ahụ batara na Legọs, Ogun na Abuja, mana e bidoro kewa ihe n'Ugwu ebe ekere mpopo ego n'abalị abụọ, hapụ ebe ihe metụtara kpọmkwem."

2. Ịchụ n'ọrụ n'ihi coronavirus

N'okwu nkụda akụnaụba nke mere ọtụtụ n'ụlọọrụ ji achọ ịchụ ndịọrụ, Nweke tụnyere alo ka "Gọọmenti Naijiria kpọọ ọgbakọ nke ndị nweụlọrụ ka ha kpaa ụdị enyemaka ha chọrọ iji hụ na ha achụghị ndị ọrụ ha n'ihi coronavirus."

3. 'Ọ dị mkpa ịtụ ndị ọzọ 'gap''

Nweke, onye sị na 'o nweghị ihe aga ere ndụ mmadụ agaghị ego ya' nyere ndị Igbo ndụmọdụ maka mgbochi coronavirus sị, " A sị na ka ekwezighị n'aka, na anyị ga-atụ onwe anyị 'gap', ọ ga-aka mma.'

"Etu asị azụ ahịa. Azọtagodi ndụ, ekwuwezie etu a ga esi rie ndụ."

4. Mmanụ agbidi na mwulite akụnaụba Naijiria

"Coronaviqrus biara akụnaụba anyị daa, abụghị izizi ọ na-eme.

" Anyị aṅụburuọ iyi na ọ bụghị sọ na mmanụ ka anyị ga-atụkwasị obi were na-achị obodo mana ihe mecha anyị alaghachi azụ.."

Nweke onye kwuru na Naijiria nwere ndị ntorobia, nwee ala, nwekwa nka dị iche iche ha kwesiri ilebanye isi nweta ego, hapụ ilekwasa anya na naanị mmanụ.

Skip Facebook post, 2

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post, 2

"Tupu nke a mee, anyị mara n'ihe gbasara mmanụ na-agbada sir=te n'okwu climate change' dịka e kwuru na ọ na-emebi ikuku nke na mmiri anaghị ezozi ka o si ezo, maọbụ mmiri ezowe n'oge ọkọchị."

" Ihe anyị nwere ike ime n'ala anyị anyị nweziri ike ime ga."

N'okwu mpụ na-izu ego gọọmentị, Nweke sị na "ihe a na-ezu adịghịzị, ọ ka mma ka ndị na-achị achị mere ndị mmadụ ebere."

Ọ gara n'ihu kpọọ oku ka gọọmentị" tinye uche na ihe ndị ndị mkpa maka iwulite obodo dịka ụlọọgwụ, ụlọakwụkwọ na okporoụzọ.

5. Ndịiche dị na PDP na APC

Nweke kwuru na APC anaghị anabata echiche si na ndị anọghị n'ọchịchị dịka PDP nke o kwuru nyere ndị mmadụ ohere ikwu uche.

N'okwu ya tulee etu PDP na APC si eso ndị anọghị n'ọchịchị, Nweke sara sị, "Ogoli lụọ dị abụọ, ọ mara nke ka mma."

Akụkọ ndị ga-amasị gị: