Ernest Asuzu: Ihe ise ị maghị maka nwa amadi a lara mmụọ

Ebe foto si, Ernest Asuzu Instagram page
Onye ejije Nollywood a ma dịka Ernest Asuzu anwụọla.
Emeka Rollas bụ onyeisi ngalaba jikọrọ ndị na-eme ejije na Nollywood, gwara BBC Igbo na ọ kubiri daa ma ghara ibilite ọzọ.
O kwuru na e buru ya gawa ụlọọgwụ mana ọ nwụrụ tupu a garuo ụlọọgwụ.
Rollas kwuru na ọ nọ na-arịabu ọrịa, mana ọ gbakere tupu ọdachi a emee.
O kọwaghị ya bụ ọrịa.
Onye ka Ernest Asuzu bụ?
Ernest Asuzu bụ onye na-eme ejije Nollywood, otiegwu, onye na-emepụta ihe nkiri nakwa onye a na-ekiri n'onyonyo kwa mgbe kwa mgbe.
A ma ya dịka onye na-akpakarị agwa dịka ogbu mmadụ n'ejije.
O bidoro wuwe mgbe o mechara ejije Nollywood akpọrọ "Another Campus Queen" n'afọ 90s.
Ọrụ ya ka dịcha ọhụrụ bụ egwu o tiputere ọhụrụ n'afọ 2020 akpọrọ "The Truth."
Asuzu bụ nwafọ Imo steeti mana o toro na Legos dị na Naịjirịa.
Ọkpụrụkpụ ihe maka Ernest Asuzu

Ebe foto si, Instagram Screengrab
- A mụrụ ya n'afọ 1971 na Legọs
- Mana ọ bụ onye Arondizuogu nke dị n'okpuru ọchịchị Ideato North n'Imo steeti
- Ọ gụrụ akwụkwọ Praịmarị na St Patricks Primary School na Yaba
- Akwụkwọ Sekọndịrị ya bụ na Aje Comprehensive Secondary School Yaba
- N'otu oge, Ernest Asuzu rịara nnukwu ọrịa nke metụtara etu o si ekwu okwu
- N'ọnwa Mee 2019, asịrị malitere ifegharị na Ernest Asusu anwụọla ma na ọ pụtara kwuo na ọ ka dị ndụ
- N'ọnwa Nọvemba 2020, o tiputara efere egwu ọhụrụ nke ọ kpọrọ 'The Truth'








