Death by exercises: Ị ma na o nwere mgbe 'exercise' nwereike idula gị mmụọ?

Ebe foto si, Getty Images
Imegharị ahụ kwa mgbe, bụ nke bekee kpọrọ 'regular exercise' bụ otu ụzọ e si ewulite ahụike.
Mana ị ma na enwere mgbe ya bụ 'exercise' nwere ike idula mmadụ mmụọ?
Amanda Oru bụ onye na-eme ejije Nollywood, kọrọ akụkọ etu o si nwee ihe ọdachi oge o mechara 'exercise'.
N'abalị anọ nke ọnwa Jenụwari ka Amanda mechara 'exercise' nke ọ na-eme kwa mgbe, o teghi aka ọ daa.
Oge ọ dara, ọ kụrụ isi n'ala, kupee eze ya, egbugbere ọnụ ya agbawaa, ọ makwaghị ebe ọ nọ ma ncha.
Ndị nọ nso oge ya bụ ihe mere gbatara nyere ya aka ma buru ya gaa ụlọọgwụ.

Ebe foto si, Instagram/Amanda Oruh
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Amanda kwuru sị: "Ekele dịrị Chukwu na ọbụghị naanị m nọ oge ihe a mere, nke ka njọ gaara ime."
Mana Amanda kwuru na oge ọ garuru ụlọọgwụ, dọkịta nyochara ya mana ọ rara ha ahụ ịkọwacha ihe kpatara ya bụ ihe.
O kwuru sị: "Dọkịta kwuru na shuga dị n'ọbara m dị mma, amaghịzi m ihe kpatara nke a."
Otu nwaada ọzọ aha ya bụ Chioma, kọkwara akụkọ etu otu onye agbataobi ya si daa dịka ọ gbachara ntakịrị ọsọ ụdị nke bekee na-akpọ 'jogging'.
"Tupu e buru nwoke ahụ ruo ụlọọgwụ, ọ bụrụ na ọ laala mmụọ," Chioma gwara BBC.
Ihe nwere ikeime ka ajụ butuo mmadụ oge ọ na-eme 'exercise'

Ebe foto si, Getty Images
Dịka ndị ọkachamara si kwuo, ọtụtụ ihe nwere ike ime ka ajụ butuo mmadụ dịka ọ na-emegharị ahụ.
Ọ bụrụ na-akpachapụghị anya, ya bụ ihe nwere ike kawanye njọ maọbụ metụta etu obi mmadụ si akụ.
Nke a nwere ike ibute ọnwụ ma ọ bụrụ na onye ahụ enwetaghị enyemaka n'oge.
Ihe nwere ike ibute nke a gụnyere:

Ebe foto si, Getty Images
- Ọ bụrụ na shuga dị n'ọbara mmadụ agbatuo (Low blood sugar) - Gbaa mbọ rie nri nwere mgbadoume (carbohydrates) tupu ị malite ịmegharị ahụ
- Ọ bụrụ na mmiri dị mmadụ n'ahụ agbatuo (Dehydration) - I kwesịrị ị na-aṅụ mmiri ugboro ugboro dịka ị na-emegharị ahụ
- Ọbara anaghị agazu n'ahụ mmadụ otu o kwesịrị (Low blood pressure) - Ọ bụrụ na ị na-enwe ọrịa ọbara mgbalielu maọbụ ọbara mgbatu ala, kpachara anya etu i si eme 'exercise'
- Anaghị eku ume nke ọma oge ị na-emegharị ahụ - Gbaa mbọ na-eku ume nke ọma dịka ị na-emegharị ahụ
- Ị na-emefe 'exercise' oke karịa ole ahụ gị chọrọ - Mara ole ahụ gị ga-ebuli; I metụ, i zutu ike
Ihe ndị ọzọ nwere ike ịnọchị anya 'exercise'

Ebe foto si, Getty Images
Imegharị ahụ dị oke mkpa mana ọ bụghị iwu na ọ ga-abụrịrị n'ụdị ịgba ọsọ, maọbụ ibu igwe na-anyị arọ.
Lee ihe ndị i nwere ike ị na-eme dịkwa ka 'exercise' nke ga-enyere gị aka:
- Ịgba egwu
- Zeere ịnọdụ ala otu ebe ogologo oge
- Ọ bụrụ na-ebe ị chọrọ ịga etechaghị aka, hapụ ịba moto maọbụ ọkada, jiri ụkwụ
- Ị chọọ ịgbago ụlọelu, hapụ 'lift' were ụkwụ si na 'staircase' gbagoo
- Ịnya igwe (bicycle)
- Ime yoga













