Coronavirus Tips: Ụzọ itoolu ị ga-esi gbalahụ isi nghasa n'ihi 'lockdown'

Ebe foto si, Instagra/mizkimoraprecious
Ọtụtụ ihe onyonyo na-egosi etu ndị mmadụ nakwa mba dị icheiche si aluso coronavirus ọgụ.
Dịka ndị mmadụ nọ n' ụlọ ugbua n'ihi mmachi gọọmentị machiri mkpagharị, ihe kachasị mkpa bụ ọdịmma uche na ụbụrụisi bụ nke Bekee kpọrọ 'mental health'.
Ahamefula Agomoh bụ ọkammuta n'ihe gbasara ụbụrụisi na omume mmadụ (psychiatrist) kọwara na etu ihe siri dị ugbua, ihe kachasị mkpa bụ ịzọ ndụ.


Agomoh kwuru na ọtụtụ ekwetebeghị na ọrịa coronavirus bụ eziokwu.
O kwuru sị: "Ndị mmadụ ekwetebeghi na coronavirus di."
"Ụfọdụ che na ọ bụ asị gọọmenti na-atụ iji nwee ohere ime ihe ha chọrọ ime, bụ nke Bekee na-akpọ 'conspiracy theory'."
Ọ kọwara na ị gaa n'otutu ogbe, ndị mmadụ na-agagharị ma na-egwu egwu etu ọ si sọ ha maka na ha ekwetebeghi na coronavirus dị.
Agomoh kọwakwara na mgbe na-adịghị anya, ndị mmadụ ga-esita na-ekweghị ekwe baa n'iwe, n'ihi na ọ bụ kwa ụbọchị ka ọtụtụ na-akpata ihe ha na-eri.
"Ya atụla onye ọbụla n'anya ma ndị mmadụ mewe ngagharị iwe."
N'aka nke ọzọ, ọkachamara n'ihe gbasara ụzọ ibi ezi ndụ bụ Nnedimma Iwueke kọwara na ọ bụ ndị bi nanị ha, ndị ahụ na-esighị ike, ndị nweburu ọrịa ụbụrụisi nakwa ndị na-aṅụ ọgwụ ike maọbụ oke mmanya bụ ndị mmachi a ga-aka metụta ọnọdụ ahụike uche na ụbụrụ ha.
Kedụ kwanu ụzọ mgbapụ?

Ebe foto si, Instagram/Skibocomedy
Ndụmọdụ nke mbụ ha nyere bụ ka gọọmenti jiri ndị ha na ndị mmadụ na-emekọrịta oge ọbụla kuziere ha maka ọrịa coronavirus.
Ha gụnyere onyeisi otu dịka 'National Union of Road Transport Workers (NURTW), ndị isi ndịahịa dị icheiche na ndị ọzọ.
Ụzọ itoolu ị ga-esi gbanahụ isi nghasa n'oge mmachi a
- Ime ihe ga-akpalie ụbụrụ dịka ịgụ akwụkwọ
- Igwu egwuregwu ime ụlọ dịka 'Ludo' na 'kaadị,' nchọrokọtọ, 'scrabble' wdg
- Ịga n' ịntaneti ka gị na ndị ọzọ kparịta ụka
- Ịkpọtụrụ ndị enyi na ezinaụlọ gị na ekwentị maọbụ soshal midia
- Ige egwu na ile ihe nkiri ga-ebulite mmụọ gi
- Ịba n'ime mmụọ nke a kpọrọ 'meditation' na Bekee
- Ihi ụra nke ọma n'oge mmachi a n'ihi na ọ bụ oge madu na ehi ụra ka ahụ ya na-arụ ọrụ ịdozi ahụ
- Ịmegharị ahụ nke bekee kpọrọ 'exercise'
- Ịmụta ihe ọhụrụ dịka asụsụ ọhụrụ, etu e si esi nri, wdg.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:











