International Poverty Eradication Day: Lee ụzọ ị ga-eji were ekwentị gị kpatawa ego

Ebe foto si, Iwaria.com
- Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Ụwa na-agbanwe n'ike n'ike dịka tekịnụzụ na-akawanye mma kwa ụbochị.
Ịntaneetị so n'otu n'ime ihe wetara mgbanwe pụrụiche n'ụwa nke mere ọtụtụ ji ekwu n'ụwa ugbua dizi ka otu obodo (Global village).
N'ihi mgbanwe a ịntanetị wetara, ohere buru ibu mmadụ ị nọ n'ụlọ ya, were igwe kọmputa maọbụ ekwentị ya na-akpatara onwe ya ego.
Ụbọchi 17 nke ọnwa Ọktoba ọbụla bụ ụbọchị otu 'United Nations' wepụtara iji kwalite mbọ a na-agba ikpochapụ ụbịam n'ụwa niile.
A na-akpọ ụbọchị a na bekee "International Day for the Eradication of Poverty", bụ nke a malitere afọr iri atọ na ise gara aga, na 1987.
Isiokwu emume a nke afọ 2022 bụ "UGWU DỊỊRỊ NDỊ ỌRỤ NIILE: Mbọ anyị na-agba maka oke ruuru onye, udo nakwa ọdịmma ụwa."
Nnyocha egosila na otu ihe nyere aka n'ibelata ụbịam n'ụwa bụ ịntaneetị, maka na o mepeela ọtụtụ ohere nke mmadụ nwere iji nyere ndụ ya aka.
Iji maa atụ, ekwentị a mmadụ na-eji akpọ maọbụ na-aza oku nwere ọtụtụ uru ọ bara iji nyere mmadụ aka kpọpụ onwe ya n'ụbịam.
Ọkaiwu Anulika Enemuo bụ onye ihe gbasara ịkpata ego n'ịntaeeti (online business) doro anya, kọwaara BBC Igbo ụfọdụ ihe mmadụ nwere ike iji ekwentị ya na-eme iji na-akpata ego.
1. Cryptocurrency

Ebe foto si, Reuters
Onye ntoroọbịa ọbụla ị kpara aka n'ọnụ ugbua, ọ sị gị na ya etinyela ego ya na Bitcoin.
Bitcoin bụ ụdị ego anaghị ahụ anya; Bekee kpọrọ ya 'Digital Currency' maọbụ 'Virtual Currency' maọbụ 'Cryptocurrency'.
Iwu Naịjirịa amachighi mmadụ itinye aka n'ụdị ego a, mana ọ dịkwa mkpa ka mmadụ mara ụlọọrụ ọ na-etinye ego ya n'aka ha.
Ọkaiwu Enemuo dọkwara aka na ntị ka mmadụ hie asaa n'anya ugbua tupu i tinye aka na 'crypto', maka na ọtụtụ adịgboroja dị nke nwere ịnapụ mmadụ nwa ntakịrị ego nke o nwere enwe.
2. Ire ahịa n'ịntaneetị (Online retail business)

Ebe foto si, Screengrab
Ọtụtụ ụlọahịa dị n'ịntaneeti ebe mmadụ nwere ike idebanye aha ma malite ire ahịa.
Otu onye achọghị ka a kpọpụta aha ya kwuru na ya nwere ụdị ụlọahịa a ebe ọ na-eresi ndị mmadụ ihe dị icheiche dịka akwa, akpụkpọ ụkwụ, ntutuisi aka mere, dịrị gawazie.
O kwuru sị: "Ihe m na-eme bụ itinye foto ihe ndị a n'akara Instagram, facebook, nakwa Whatsapp, mana ọ bụghị na azụtala m ha."
"Kama ọ bụrụ na mmadụ chọọ ịzụ ihe ndị ahụ, aga m aga n'ahịa zụta ya, ma tinye obere ego n'elu (uru) ya iji resi onye ahụ."
"Ana m ewegara onye ahụ ngwaahịa ahụ n'ụlọ ya maọbụ n'ụlọọrụ ya, nke pụtara na ọ gaghị enye onwe ya nsogbu ịgawa ahịa."
Ọtụtụ ndị na-enweghịkwa ego ịchọrọ ụlọahịa, nwere ike zụta ngwaahịa ndị a debe n'ụlọ ha, ma werezie ekwentị ha na ịntaneetị na-egosipụta ya ka ndị mmadụ hụ ma zụrụ.
Imirikiti mmadụ esila n'ụzọ dị otu a kpata ego nke ha ji nwetazie ụlọahịa nke ha, ma malite nke bụ ịtụ mgbere ahịa.
3. Ikuzi ihe (Coaching)

Ebe foto si, Anulika Enemuo
Ọkaiwu Anuli kwuru na nkuzi so n'otu ihe mmadụ nwere ike iji ekwentị ya na-eme iji kpata ego.
Ọ kọwara sị: "'Coaching bụ ikuziri mmadụ ihe n'ụzọ onye ahụ ga-enwe ike itinye ya na ndụ ya ka ọ mịtara onye ahụ mkpụrụ."
"E nwere ụdị 'coaching' dị icheiche dịka: Ikuziri mmadụ maka ọdịmma ahụike (fitness coach), ikuzi maka nchịkọta akụnụba (financial coach), ikuzi maka mkpata ego na azụmahịa (business coach), ikuzi asụsụ (language coach)."
"Ụdị ihe ndị a bụ ihe mmadụ ga-ejinwu ekwentị ya mee, mana onye ahụ kwesịkwara ịma nke o riri tupu ọ malite ikuzi ya."
4. Ide nakwa ire akwụkwọ nkuzi (Online courses)

Ebe foto si, Getty Images
Nke a yitekwara 'coaching' mana ọ bụchaghị ya.
Ọkaiwu Anuli kwuru na mmadụ nwere ike ide akwụkwọ gbasara etu e si eme otu ihe maọbụ nke ọzọ, ma na-ere ya n'ịntaneetị.
5. Inyere ndị mmadụ aka ree ngwaahịa ha (Affiliate Marketing)
Dịka Ọkaiwu Anuli si kọwaa, mmadụ nwere ike inyere onye ọzọ aka ire ngwaahịa ya, dịka akwụkwọ, ude, ọgwụ maọbụ ihe ọbụla nke ọ chọrọ ire.
"Mmadụ nwere ike inyere mmadụ aka ree ngwaahịa ya n'ịntaneetị iji nata obere ọmụrụnwa nke bekee kpọrọ 'commission'."
"Iji maa atụ, ha abụọ nwereike kwekọrịta na ọ ga-akwụ ya otu narị naịra maka otu ngwaahịa o rere."
"Onye ahụ ga-agbazi mbị iji ekwentị ya ree ngwaahịa ndị iji nara ọmụrụnwa ahụ ha kwekọrịtara."
6. Ahịa onye nụ ọ kọọrọ ibe ya (Network Marketing)
Ihe ọzọ a na-akpọ 'Network marketing' bụ 'Multi-Level Marketing'.
Nke a bụ mmadụ idebanye aha n'otu ụlọọrụ na-arụpụta ngwaahịa ma nyere ha aka na-agbasa ozi maka ngwaahịa ahụ ma na-erekwa ya.
"Dịka ị na-ere ngwaahịa, ị ga na-akpọtakwa ndị mmadụ ka ha na-esonyere ụlọọrụ ahụ," Ọkaiwu Anuli kwuru.
"Etu onye si gbaa mbọ ire ahịa nakwa ịkpọta ndị ọhụrụ ka ego ụlọọrụ ahụ na-enye ya ga-esi na-agbali elu."
"Onye ọbụla nwere ekwentị ga-esinwu n'ụzọ dị otu a na-akpata ezigbo ego.
7. Ise foto ekwentị (Mobile photography)

Ebe foto si, Iwaria.com
Dịka ọtụtụ ji ise onyonyo mere akaọrụ, ndị ọzọ jikwa ise onyonyo nke ekwentị mere aka ọrụ.
Ọtụtụ ekwentị juru n'ahịa ugbua nke ose foto (camera) dị na ha siri ike karịa igwe ose foto ndị ọzọ.
Enwere ọtụtụ ọba ozi ga-akwụ gị ụgwọ iji zụrụ foto mara mma nke i sere.
Ndị ọzọkwa na-eji ekwentị ha ese ihe ejije eji akụzi ihe maọbụ akpa ọchị ma tinye ha na soshal midia dị icheiche iji kpata ego.
A na-akpọ nke a 'social media content creating'.
8. Onye enyemaka anaghị ahụ anya (Virtual Assistant)

Ebe foto si, Iwaria
Dịka mmadụ si enwe onye enyemaka n'ụlọọrụ, nke a kpọrọ 'personal assistant, otu a kwa ka e si enwe onye enyemaka anaghị ahụ anya nke bekee kpọrọ 'virtual assistant'.
Ọrụ ha gụnyere: "Ihazi ozi email, ime nnyocha (intaneeti), ide akwụkwọ anamachọ ihe (proposals), dịrị gawazie.
Lee ihe ọzọ nwere ike inye gị ego site n'ekwentị gị:
- Onye oti mkpu soshal midia (Social media influencer)
- Egwuregwu ịntaneetị (Online game)
- App mwulite ego (Investment apps)
- Ile onyonyo nakwa ịkpagharị n'ịntaneetị
- Isonye na nnyocha ịntaneetị ka akwụọ gị ụgwọ (paid surveys)
Mana chetakwa...

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụghịzi ihe ọhụrụ na ọtụtụ ndị ekperima juru n'ịntaneetị na-ezu ndị mmadụ ohi.
Ya mere o ji dị mkpa ihi asaa n'anya tupu itinye akara ọbaego na webụsaịt ọbụla.
N'otu aka ahụ, mmadụ kwesịkwara ịkpachapụ anya maka nke bekee na-akpọ 'pyramid scheme'.
Ụdị nke a bụ ndị na-asị gị weta otu puku naịra ka ha nye gi puku naịra iri n'ime awa atọ.
Ọkaiwu Anuli kwuru sị: "onye ọ bụla kwere gị nkwa ibute ụkwa n'osisi ụkpaka, biko gbalaga."













