Bitcoin to dollar: Ego ole ka otu bitcoin na-ada na naịra ugbua?

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi & Ikechukwu Kalu
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 8
Ikenna Ogbaraegbe bụ otu onye na-azụ ma na-ere ego igwe a kpọrọ bitcoin akọwaala ego ole ọ na-ada ma a tụnyere ya na naịra nakwa dọla.
Nke a na-abịa dịka ụlọakụ etiti machiri ụlọakụ dị icheiche na Naijirịa itinye aka na Crypto currency n'ụzọ ọbụla
Ogbaraegbe sị na ego ole bitcoin na-ada kwa ụbọchị dabere n'egole dọla na-ada kwa ụbọchị ma a tụnyere ya naịra.
Ọ sị n'iji maa atụ dịka taa ụbọchị 9 Febụwarị afọ 2021, na otu bitcoin (1btn) bụ ihe dịka puku dọla iri anọ na isii ($46,720).
Ebe otu dọla ($1) bụ narị naịra anọ na iri itoolu (N490), ọ bụrụ na ị gbakọọ ya ($46,720 X N490) ọ ga-apụta (N22,892,800).
Nke a pụtara na otu bitcoin bụ nde iri abụọ na abụọ na ụma (1 btn = N22,892,800) dịka ọ dị n'ụbọchị 9, Febụwarị 2021.
Mana Ogbaraegbe sị na ọnụego bitcoin na-agbago ma na-arịtukwa na ọ naghị anọkaarị otu ebe.
Ka m si eji Cryptocurrency enweta mbadamba ego

Ebe foto si, Reuters
Dịka ụlọakụ etiti machiri ụlọakụ dị icheiche na Naijirịa itinye aka na Crypto currency n'ụzọ ọbụla, ụfọdụ ndị ji ya bụ Cryptocurrency akpa ego na-eti mkpụ na ya bụ mmachi bụ ezigbo ọdachi na-ebe ha nọ.
Kama ụfọdụ na-asị na ọ bụ aghọtaghị mere ndị mmadụ ji atụ egwu.
Ndị ntoroọbịa na Naijirịa ekwuola etu ya bụ mmachi siri metụta ha.
Onweghị gọọmentị nwere ike ịmachi cryptocurrency - Augustine Arachie

Ebe foto si, Agustine Arachie
Augustine Arachie bụ onye nkuzi na Mahadum Nnamdi Azikiwe dị n'Ọka Anambra steeti, ma na-azụkwa ahịa Cryptocurrency.
Ọ kọwara na gọọmentị agaghị amachinwu bitcoin maọbụ cryptocurrency ndị ọzọ, kama ha emeela ka ọ siere ndị mmadụ ike iji ya azụ ahịa.
Lee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ n'ihe o kwuru :
- Gọọmentị Naijirịa maọbụ nke mba ọbụla enweghị ikike ịmachị Cryptocurrency
- Ihe gọọmentị Naijirịa mere bụ ịmachi ụloakụ nọ na Naijirịa itinye aka na Cryptocurrency nke bụ Regulation n'okwu bekee.
- Gọọmentị mere ka o siere ndị mmadụ ike isite na ụloakụ wepụta ego ha tinyere na cryptocurrency
- E nwere ụzọ dị iche iche ị ga-esi wepụta ego gị na abụghị ụlo akụ, otu n'ime ha bụ nke bụ Peer-to-peer ebe onye chọrọ ịzụta na onye chọrọ ire ga-ezute onwe ha. Nke a agaghị agbasata ụloakụ ọbụla na Naijirịa.
- Ọ na-esi ike izu ego mmadụ n'atụmatụ a n'ihi na ụloọru ndị na-akwado Peer-to-peer na-egbochi nrụrụaka
- Ọzọkwa bụ na mmadụ nwereike ịga mba dịka Gana na Saụt Afrịka ndị na-amachighị cryptocurrency ma sị ebe ahụ na-azụ ahịa cryptocurrency.
Ụlọọrụ Central Bank of Nigeria akọwaala ihe mere ha ji machie ụlọakụ niile dị na Naịjirịa iji cryptocurrency mee ihe ọbụla.

Ebe foto si, Getty Images
N'akwụkwọ Osita Nwanisiobi bụ ọnụ na-ekwuchitere CBN , ụlọọrụ CBN kwuru na ha machibuola ụlọakụ niile nọ Naịjirịa iji cryptocurrency kamgbe afọ 2017.
CBN kpọpụtara mba dịka China, Canada, Taiwan, Indonesia, Algeria, Egypt, Morocco, Bolivia, Kyrgyzstan, Ecuador, Saudi Arabia, Jordan, Iran, Bangladesh, Nepal na Cambodia amachiela iji cryptocurrency zụọ ahịa makana e nwerike iji ya nye ndị oyi egwu ego, zụọ ego nakwa mee ihe ọjọ ndị ọzọ.
Akwụkwọ ozi ahụ kwuru na ebe ọ bụ na ọ bụ ndị na-enweghị ikike na-enye ya bụ'cryptocurrencies' mere ka ọ ghara ịdaba n'usoro CBN si eme ihe dịka ha depụtara na CBN act (2007) ka ngalaba na-enye ego na Naịjirịa.
CBN kwuru ọ ka na-agbagoju ha anya etu ndị nwe cryptocurrency si ezo ihu nke mere ka ndị mmadụ na-aju ihe mere ha ji ezo ihu ha maọbụrụ na ha ma na iwu kwadoro ihe ha na-eme.
Ha kwuru na mmachị a agaghị emebi ihe ọbụla gbasara iji ego kwụ ụgwọ na intanet maọbụ nwulite FinTech.
Cryptocurrency: Mmachi cryptocurrency ga-eme ka ụbịam karịa na Naịjirịa - Atiku

Ebe foto si, Twitter/Atiku
Osote Onyeisiala Naịjirịa n'oge gara aga bụ Abubakar Atiku etinyekwala ọnụ n'ịkatọ mmachi gọọmentị machiri cryptocurrency na Naịjirịa.
Atiku kwuru nke a site n'akara Twitter ya n'ehihie Satọde.
O kwuru na ugbua abụghị oge gọọmentị kwesịrị itinye atụtamụ dị otu a nke nwere ike ime ka ụbịam kawanye njọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Atiku kwuru na ụzọ ka mma iji soo ihe gbasara 'cryptocurrency' bụ ịchọ ụzọ gọọmentị ga-esi na-ahazi ya, ọbụghị ịkwụsị ya kpamkpam.
Ọ gara n'ihu kwuo na ugbua abụghị oge gọọmentị ga-etinye atụmatụ ga-eme ka ego kwụsị ịbata na Naịjirịa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Oby Ezekwesili, ndị ọzọ akatọọla mmachi cryptocurrency

Ebe foto si, Getty Images
Ụfọdụ naị ama ama akatọọla mkpebi gọọmentị etiti ịmachi bitcoin na cryptocurrency ndị ọzọ.
Otu n'ime ha bụ Oby Ezekwesili onye bụbu mịnịsta agụmakwụkwọ na Naịjirịa
Ezekwesili rụkwara ọrụ dịka otu n'ime ndị isi ụlọakụ mba ụwa bụ 'World Bank', ma sorokwa zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2019.
N'ozi o zipụrụ n'akara Twitter ya, Ezekwesịlị kwuwu na gọọmentị gaara ịgba mbọ ịmụta etu cryptocurrency si arụ ọrụ kama ịmachi ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Onye ọzọ kwuru okwu maka ya bụ Japhet Omojuwa, onye ode akwụkwọ nakwa onye nwere agba na soshal midịa.
Omojuwa kwuru na mbọ niile gọọmentị sị na ha na-agba iji wulite akụnụba Naịjirịa akụọla afọ n'ala n'ihi mmachi a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Mana Boason Omofaye, onye ntaakụkọ bụ ọkachamara maka akụnụba, kwuru ọ gaghị ata ụlọakụ 'Central Bank' ụta maka ịmachi cryptocurrency.
Omofaye kọwara na ọnọdụ akụnụba Naịjirịa esichaghị ike, ọ bịakwa bụrụ na enweghị ezigbo nhazi maka cryptocurrency.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 5
Anyị ga-ahapụzi bitcoin banye na bitcow - Ndị ntorobịa Naijiria

Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ ndị ntorobịa Naịjirịa egosipụtala mwute ha dịka gọọmentị etiti machiri ụlọakụ dị icheiche ịnabata bitcoin na 'cryptocurrency' ndị ọzọ.
Ụfọdụ n'ime ha na-ajụ na Twitter ma gọọmentị ọ chọziri ka ha mebe 'bitcow'?
Nke a na-abịa dịka otu nwoke a ma ama na Twitter bụ Adamu Garba gwara ndị mmadụ ka ha wepụta ego ha na 'cryptocurrency' ma tinye ya n'ahị ịzụ ehi.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 6
Adamu Garba dekwara na ebe a nọ ugbua bụ CowtoCurrency.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 7
Nke a mere ndị ntorobịa ji ewe iwe ma na-ekwu na naanị ihe gọọmentị Naịjirịa na-akpachapụrụ anya bụ ihe gbasara ehi.
Akintomide kwuru na ya ga amalitezi ịzụ ahịa ehi ebe ọ bụ naanị ahịa gọọmentị kwadoro

Ebe foto si, Screengrab
@Marinebabe313 kwuru na ehi dị nnukwu mkpa na Naịjirịa nke mere e ji tinye ya n'akwụkwọ ego narị naịra abụọ

Ebe foto si, Screengrab
Cryptocurrency abụrụla ahịa iwu dịka CBN amachiela ya na Naịjiria

Ebe foto si, CBN
Ụlọakụ etiti nke Naịjiria bụ Central Bank of Nigeria (CBN) na Bekee, amachiela ịzụ ahịa cryptocurrency na Naịjiria.
CBN zipuru ozi mmachi a nye ụlọọrụ ndị na-ahụ maka akụnaụba n'ụbọchị Fraịde, dịka ha nyere ha iwu imechi ọbaego onye ọbụla na-azụ ahịa Bitcoin, Ethereum nakwa Dogecoin dị n'aka ha.

Ebe foto si, Getty Images
Mmachi a mere ka ndị Naịjiria ọkachasị ndị ntorobịa na-eti mkpu na-ekwu na gọọmentị Naịjiria kwesịrị ị na-akwado cryptocurrency karịa ịchọ ụzọ ha ga-esi kpachie ya.
Cheta na CBN dọburu ụlọakụnaụba ndị dị na Naịjiria aka na ntị n'afọ 2017 sị ha etinyela aka n'ihe gbasara ọzụzụ na orire ego ịntanetị dịka cryptocurrency, ruo mgbe a mara ihe e mere ya, "n'ihi na ọ bụghị ezigbo ego dịka Naịra".
Ha kwuru mgbe ahụ na ha na-atụ ụjọ na ndị omekome nwereike iji cryptocurrency a ghọgbuo ndị Naịjiria ma gwuo ha wayo.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 8
Etu ị ga-esi tinye ego gị na Bitcoin, Ethereum ka ọ ghara ịda mmiri

Ebe foto si, Reuters
Cryptocurrency, ọ kachasị nke a kpọrọ Bitcoin bụzi ihe onye ukwu na onye nta kpụ n'ọnụ taa gbasara okwu mmuba akụnụba nke Bekee kpọrọ 'investment'.
Onye ntorobịa ọbụla ị kpara aka n'ọnụ ugbua, ọ sị gị na ya etinyela ego ya na Bitcoin.
Mana gịnị bụ Bitcoin?

Bitcoin bụ ụdị ego anaghị ahụ anya; Bekee kpọrọ ya 'Digital Currency' maọbụ 'Virtual Currency' maọbụ 'Cryptocurrency'.
E wepụ Bitcoin, ha dị ọtụtụ ụdị ego a e nwere. Ndị ọzọ niile ahụ ka a na-akpọ 'Altcoins'.
Mana Bitcoin bụ nke ndị mmadụ kacha mara ma bụrụkwa nke kacha ọnụahịa.

Ebe foto si, Getty Images
Otu mkpụrụ Bitcoin karịrị nde naịra anọ (N4 million)
Ọ bụ n'afọ 2009 ka otu onye kpọrọ onwe ya Satoshi Nakamoto wepụtara atụmatụ Bitcoin, mana onweghị onye ma kpọmkwem onye nwoke ahụ bụ ruo taa.
Etu e si eji Bitcoin azụkọrịta ahịa

Ebe foto si, AFP
N'ihi na Bitcoin abụghị ego a na-ahụ anya, ọ bụ n'igwe kọmputa na ịntanetị ka e si ekesa ya.
Onweghị gọọmentị mba ọbụla maọbụ ụlọakụ ọbụla na-ahazi etu e si eji Bitcoin azụahịa.
Naanị ndị a na-akpọ 'Miners' bụ ndị na-emepụta ya ma na-ahazikwa etu e si eji ya azụkọrịta ahịa.

Etu e si emepụta ụdị ya bụ usoro teknụzụ bụ ọgbaraIgbogharịị a na-akpọ 'Blockchain' na Bekee.
Ịkọwa teknụzụ 'Blockchain' ga-abụ akụkọ nke aka ya.
Nke a kpatara o ji dị mkpa na mmadụ ga-elezi anya nke ọma tupu o tinye ego ya na Bitcoin maọbụ 'cryptocurrency' ndị ọzọ, iji gbaara okwu na ụka ọsọ.
I nwere ike iji Bitcoin zụta ihe na Naịjirịa?
Ọ dịchabeghị mfe mmadụ iji Bitcoin ga zụrụ ọgọdọ maọbụ akpa osikapa n'ahịa Naịjirịa, mana ihe e ji ya eme buru ibu.
Nnyocha gosiri na Naịjirịa bụ mba a kacha e ji Bitcoin eme ihe na mpaghara Afrịka niile.
Ihe e jikarị ya eme bụ ichekwaba ego nakwa iziga ego si otu mba gaa mba ọzọ.
E nwere ụlọọrụ dị icheiche ọrụ ha bụ inyere ndị mmadụ aka ịzụta Bitcoin maọbụ ịgbanwe nke ha nwere nye ha naịra maọbụ dọla.
Mana tupu itinye ego gị, anya saa.
N'aka nke ọzọ, i nwere ike iji Bitcoin zụta ihe na mba dị icheiche dịka Japan, Switzerland, Germany, Singapore dịrị gawazie.
Ihe ndị ọkacha mara kwuru maka Bitcoin

Ebe foto si, Getty Images
Adedayo Adebajo, bụ onye ihe gbasara teknụzụ 'Blockchain' doro anya nke ọma, kọwaara BBC na tupu itinye ego na 'cryptocurrency':
- Mata na ọ yitekwara ụzọ ndị ọzọ e ji amụba ego nke Bekee kpọrọ 'investment'. Ọ pụtara na ego gị nwere ike ịmụba, o nwekwara ike ịla.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 9
- Zeere ndị ọnụ ụtọ na-agwa gị na ego gị ga-amụba n'otu ntabi anya
- Mee nnyocha gị nke ọma gbasara ụlọọrụ ahụ ịchọrọ itinye ego gi na ya
- Mara ma ụlọọrụ ebe ị chọrọ itinye ego gị ha esokwa n'otu ndị dịka: Blockchain Nigeria User Group (BNUG), Stakeholders in Blockchain Technology Association of Nigeria (SIBAN), Blockchain Industry Association of Nigeria, maọbụ FintechNGR.
Bitcoin o ziri ezi n'iwu Naịjirịa?

Ebe foto si, CBN
Ka ọ dị ugbua, onweghị iwu ọbụla machiri mmadụ itinye ego ya na Bitcoin maọbụ 'cryptocurrency' ndị ọzọ na Naịjirịa, mana onwekwaghị iwu ọbụla na-akwado ya.
Ụlọakụ etiti bụ 'Central bank of Nigeria'dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha kpachapụ anya maka ego ndị a anaghị ahụ anya.
Ha kwuru sị: "Onweghi iwu ọbụla na-echekwa ndị ọbụla tinyere ego ha na 'cryptocurrency'.

"Anyị na-adọ ndị mmadụ aka na ntị na cryptocurrency abụghị usoro iwu kwadoro maka azụmahịa na Naịjirịa."
"Onye ọbụla ego ya furu na cryptocurrency, onweghị ebe onye ahụ ga-aga mee mkpesa, ọ pụtara na ego ahụ alaala."
Mana ngalaba 'Securities and Exchange Commission' wepụtara akwụkwọ ozi n'ọnwa Sepụtemba nke na-ekwu na ha ga-amalite ịhazi cryptocurrency iji gbochie ndị mmadụ itufu ego ha.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ebe foto si, CBN
















