End SARS: Ụlọikpe enyela CBN ikike ikpachi akara ọbaego ndi so kwado ngagharịiwe

High court
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ụlọikpe dị n'Abuja enyela nkwado ka ụlọakụ etiti (Central Bank of Nigeria) kpachie akara ọbaego ndị so kwadoo ngagharịiwe 'End ARS'.

Ọkaiwu Ahmed Mohammed nyere iwu a n'Abuja n'ụbọchị Fraịde dịka CBN gbara ndị ahụ akwụkwọ.

Ụfọdụ ndị ya bụ ihe metụtara gụnyere: Adegoke Pamilerin Yusif, Umoh Grace Ekanem, Babatunde Victor Segun, Mulu Louis Teghenan, Mary Oshifowora, Winifred Akpevweoghene Jacob, Victor Solomon, Idunu A. Williams na Mosopefoluwa Odeseye.

Ndị ọzọ bụ: Bolatito Racheal Oduala, Chima David Ibebunjoh, Mary Doose Kpengwa, Saadat Temitope Bibi, Bassey Victor Israel, Wisdom Busaosowo Obi, Nicholas Ikhalea Osazele, Ebere Idibie, Akintomide Lanre Yusuf, Uhuo Ezenwanyi Promise nakwa ụlọọrụ Gatefield Nigeria Limited.

Ụlọikpe ahụ kwuru na a ga-akpachi akara ọbaego ndị ahụ ruo ụbọchị otu narị na iri asatọ (180 days) ruo mgbe ndị CBN ga-emecha nnyocha ha na-eme.

Nigeria Immigration Service

Ebe foto si, Twitter/Immigration Service

Nke a na-abịa dịka ngalaba na-ahụ maka ọpụpụ na mbata na Naijirịa bụ 'Nigeria Immigration Service' kọwara na ihe ha jichie akwụkwọ njem nwaada Modupe Odele n'ọdọ ụgbọelu Legọs bụ maka na a na-eme ya nyocha.

Ha kwuru na aha nwa ada a pụtara dịka onye na-ekwesịghị ime njem ọbụla maka nnyocha kama ha ekwughị onye na-eme nwaada a ya bụ nnyocha.

Cheta na Odele bụ onye ọkaiwu so nye ndị mere ngagharịiwe 'End SARS' nkwado.

Kama Odele gwara BBC na mgbe ha naara ya akwụkwọ njem ya, ha gwara ya na ọ bụ ndịagha na-enyocha ya.

Odele mechara kwuo n'akara Twitter ya na ndị ọrụ NIS agwala ya ka ọ bịa were akwụkwọ njem ya kama ọ gwara ha na ọ bụ n'ụbọchi Mọnde ka ọ ga-abịa were ya.

Modupe Odele

Ebe foto si, Twitter/Mochievous

Nkọwa foto, Modupe Odele ji ọrụ ọkaiwu ya gbaa mbọ ịgbapụta ndị na-eme ngagharịiwe ndị uweojii nwuchiri

Cheta na akụkọ na-ekwu na ụfọdụ ndị so hazie ngagharịiwe 'End SARS' nke mere n'ọdịnso a na-ekwu na gọọmentị Naịjirịa amalitela imekpa ha ahụ.

Otu onye n'ime ha bụ Modupe Odele kwuru na gọọmentị machiri ya ime njem gaa mba ofesi.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ebe mmadụ abụọ ọzọ aha ha bụ Akintomide Yusuf na Bassey Israel kwuru na gọọmentị akpachiela ọba ego ha nke na ha enwekwaghị ike ịdọrọ ego n'ime ya.

Aha onyonyo, 'Ndịagha agaghị agọ na ha agbaghị mmadụ egbe na Lekki Toll Gate n'ihi na e bugara m ọtụtụ ụlọọgwụ'

Modupe Odele, onye e ji @Mochievous mara na Twitter kwuru na ọ bụ n'ụbọchị Sọnde, abalị mbụ nke ọnwa Nọvemba, oge ọ chọrọ ime nje gaa mba Maldives ka ndị ọrụ 'Immigrations' nwụchiri ya ma kwuo na ọ gaghị eme ya bụ njem.

Odele bụ onye ọkaiwu nke gbara mbọ ịnọchite anya ndị mmadụ ndị uweojii nwụchiri oge a na-eme ngagharịiwe 'End SARS.'

Ndị na-eme ngagharị iwe

Ebe foto si, Getty Images

Ọ kọwara na oge ha tinyere aha ya n'igwe kọmputa ha, onyonyo ya pụtara nke na-egosi na ọ bụ onye a na-enyocha enyocha.

Ndị ọrụ ahụ jigidere ya nwa oge ma mechaa tọhapụ ya, mana ha ekweghị enye ya akwụkwọ njirimara ya (passport).

Ha gwara ya ka ọ kpọrọ ndị ọkaiwu ya lọghachi n'ụlọọrụ ha n'echi ya.

Mana ka ihe niile a na-eme, o nweghi onye gwara ya ihe o mere e ji nwuchie ya.

Mochievous

Ebe foto si, Twitter

Ka echi ya ruru, ya bụ n'ụbọchị Mọnde, abalị atọ nke ọnwa Nọvemba, Modupe laghachiri n'ụlọọrụ ndị 'immigration' mana ha ekweghị enye ya akwụkwọ njirimara ya.

O kwuru na ha gwara ya na ọ ka bụ onye a na-enyocha enyocha, mana ha ekweghị agwa ya ihe o mere e ji enyocha ya.

Mochievous

Ebe foto si, Twitter

BB kpọrọ akara ekwentị ndị ọrụ nchekwa mbata na ọpụpụ na Naịjirịa, onye zara oku ahụ kwuru na "ọ bụghị eziokwu na akwụsịrị onye ọbụla ime njem n'ihi na o sonyere na ngagharịiwe 'End SARS'.

Onye ahụ na-ekweghị ekwu aha ya gara n'ihu kwuo na "o nwerịrị ihe ọzọ kpatara e ji kwụsị onye ahụ ime njem, ọ bụghị maka ihe gbasara 'End SARS'.

"Ihe onye ahụ ga-eme bụ na ọ ga-ede akwụkwọ mkpesa degara isi ụlọọrụ anyị dị n'Abuja ka e lebaa okwu ya anya."

Ịkpachị ọbaego ndị mmadụ

@AsiwajuLerry

Ebe foto si, Twitter

Onye ọzọ aha ya bụ Akintomide Lanre Yusuf kọkwara etu e si kpachie ọbaego ya dị n'ụlọakụ 'First Bank' n'agwaghị ya ihe ọbụla kpatara nke a.

O kwuru na ọ bụ n'abalị iri na asaa (17) nke ọnwa Ọkutoba ka ọ chọpụtara na a kpachiela ọba ego ya.

Oge ọ jụrụ ihe kpatara ya, ndị 'First Bank' gwara ya na ọ bụ na ụlọakụ etiti (Central bank) ka e si nye iwu ahụ.

Kamgbe ahụ, o deela akwụkwọ degara ndị 'Central Bank mana onwebeghi ihe ọbụla nwere isi.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Onye ọzọkwa aha ya bụ Israel Bassey kọọrọ ndị ntaakụkọ 'Punch' na a kpachikwara ọbaego ya dị n'ụlọakụ 'Access Bank'

Bassey kọwara na ya bụ onye dibia bekee ma bụrụkwa onye so na-elekọta ndị merụrụ ahụ na ngagharịiwe 'End Sars' na Pọtakọt.

O kwuru na ọ bụ n'abalị iri na ise nke ọnwa Ọktoba ka ọ chọpụtara na a kpachiela akpa ego ya n'ụlọakụ.

Oge ọ jụrụ ese, ha gwakwara ya na ọ bụ ndị CBN nyere iwu ahụ.

Bassey kwuru na mbọ niile ọ gbara ka a kpọpeere ya akpa ego ya enwebeghị isi.

Mimi Ade-odiachi

Ebe foto si, Twitter

Nkọwa foto, Mimi Ade-Odiachi kọwakwara etu ụlọakụ GTB si kpachie akara ọbaego ya

Na nke dị ka ibe ya, otu ụlọọrụ a kpọrọ 'Gatefield Nigeria Ltd' gbara ụlọakụ 'Access Bank' akwụkwọ n'ụlọikpe maka ịkpachi akara ọbaego ha.

Dịka ụlọntakụkọ 'Bloomberg' siri kwuo, ụlọọrụ Gatefield so na ndị gbara onya ego iji nweta ego ha jiri kwado ndị ntaakụkọ kwụrụ onwe ha n'ọrụ ịchụ nta akụkọ metụtara 'End SARS'.

BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị CBN, o kwuru na ya amaghị maka iwu ọbụla e nyere iji kpachie akpa ego ndị mmadụ n'ụlọakụ.

Kemgbe okwu a na-ewu na soshal midia, o nwebeghị onye ọbụla nọ na gọọmentị kwuru ihe ọbụla gbasara ya.

Cheta na ngalaba gọọmentị etiti na-elekọta ndị mgbasaozi, a kpọrọ 'National Broadcasting Corporation', tara ụlọntaakụkọ dị icheiche ahụhụ maka ịgbasa ozi gbasara 'End SARS'.

Mana ọtụtụ na-ekwu na ha agaghị eji maka mmekpa ahụ gọọmentị na-emekpa ndị mmadụ kwụsị ikwu okwu maka ọdịmma Naịjirịa.