Rabiu Garba: Ihe i kwesiri ịma maka DPO a, DJ Switch, Innocent Ideh, Segalink na ndị ọzọ ji isi ghọrọ mgbọ na ngagharịiwe ahụ
Kemgbe abalị asatọ ọnwa Ọktoba afọ 2020, ngagharịiwe EndSars malitere, ụfọdụ ụmụ Naijiria atụnyela ndụ ha, ebe akụnaụba dara nde kwuru nde Naira daraala mmiri.
Dịka onyeisiala Naijiria bu Muhammadu Buhari siri kọwaa, ngagharịiwe EndSars eriela isi mmadụ iri isii na Itoolu gụnyere ndị nkịtị, ndị uweojii na ndị agha dika ọgbaghara sochiri ya bụ ngagharịiwe.
Mana n' ime ọnọdụ tigbuo- zugbo ahụ nke metụtakwara ụlọakụ, ogige ndị uweojii, ụlọntaakụkọ, ọdọ ahịa, e nwere ndị foro ntutu taa ịhụ na ọ bụ ihe e kwuru ka a na-eme na-atụghị egwu ọnwụ.
DPO Rabiu Garba

Ebe foto si, Rabiu Garba
Rabiu Garba bụ onyeisi ogige ndị uweojii dị na Fege ,Ọnịcha Anambara steeti. Onye Yobe steeti, Garba arụọla ọrụ ọtụtụ afọ n' ala Igbo.
Ndị mara ya mara dịka ezigbo mmadụ nakwa onye uweojii na-akwụba aka ya ọtọ ma na-enyekwa ikpemkwumọtọ ma okwu dapụtara n'etiti mmadụ na ibe ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Akụkọ banyere ya chakere dịka ọgbaghara sochiri akụkọ ọgbugbu ndị na- eme ngagharịwe na Legọs.
Akụkọ kwuru na ndị ntorobịa na- eme ngagharịwe kworo na- aga n' ogige ndị uweojii dị iche ise na- agba ya ọkụ ma na-emetụ kwa ndị uweojii ha kwụsịrị ahụ.
Mana, dịka Ọkàiwu Justus Chris Ijeoma si depụta na Facebook, oge ha gụrụ egwu iwe rute n' ogige nke Garba, ndị òtù ya kere nkwụcha ọgụ, mana Garba gwara ha dere jụụ ma wéré ire ọma gwaa ndị ntorobịa okwu medara ha obi. Udo were chịa, a gbaghị ogige ya ọkụ, dịka a na- emebi ihe ndị uweojii.
Lee ụfọdụ dike na agbara ndị ọzọ chakere n' ọgụ EndSARS:

Ebe foto si, DJ Switch, Aisha Yesufu na Innocent IDEH
DJ Switch

Ebe foto si, Instagram/Switch
DJSwitch, onye ezi aha ya bụ Obianuju Udeh bụ onye na- gwọkọ egwu a ma ama nke Bekee kpọrọ "Deejay".
Nwa ada Udi n' Enugwu steeti, so na ndị aha ha chakere na ngaghariiwe EndSARS maka ịka obi n' ihu ọgụ.
E wepụ nwa afọ ahụ gụrụ akwụkwọ na mahadum ' University of Portharcourt', ụwa akaghị ịma nke bụ eziokwu na mwakpo ndị agha Naijiria wakporo ndị ntorobịa nọ na 'Lekki Toll Gate' eme ngagharịiwe ' abalị iri abụọ nke ọnwa Oktoba n' afọ 2020.(20/10/2020).
Kwa ụbọchị tutu o rue ụbọchị mkpamkpa ahụ kpara, DJSwitch na-eji ekwenti ya na- egosi ụwa ihe na-eme n'ebe ha gbakọrọ site n'akara Instagram ya.
O sokwa na-akọwara ndị gbakọrọ ihe ndị ntorobịa chọrọ n' aka gọọmenti iji kwụsị mkpagbu ndị uweojii.
Ọ bụ na ya nụ ọrụ ọ kpọrọ one ya ka ọ nọ ụbọchị ihe mere mana nwa ada ahụ kwesiri ka ụra, na- atụghị egwu.
Ọbụladị oge ndị agha bidoro bịawa ha nso, ọ kpọkuru ndị ntorobịa nọ ebe ahụ ka ha dere jụụ, nọrọ ala ghara ịkpa aghara.
Ntụmadị oge mgbọ na- awụ, nwata nwaanyị a nwere obi dimkpa akwụsighị ihe ngosi ya kama ọ na- eti mkpu enyemaka ma na- ekwupụtakwa ìhe na-eme dịka ọ na-eme.
Ọtụtụ ndị mmadụ mechara too ya maka inwe obi siri ike kwuru ma sete etu ndị agha si gbaa ndị na-eme ngaghariwe egbe, oge ndị ogbo ya riri mbọmbọ ọsọ.
Mana ụfọdụ na- akpọrị ya maka ịgba n' anwụ ihe a chọrọ izo ezo.
Innocent Chukwuma Ideh

Ebe foto si, IDEH CHUKWUMA INNOCENT Instagram page
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 1
Nwaokorobịa a bụ onye na- ahazi Ihe onyonyo' film' na Nollywood ma bụrụ onye nwe ụlọ ọrụ " Onesoulfilms'.
Ideh so na ndị chị ọkụ na ngagharịiwe EndSARS na Lekki, Legọs.
Nwa amadị a bụ onye gụrụ mahadum na 'University of Legos' so na ndị gosiri na Naijiria nwere mmadụ n' ụzọ pụrụ iche.
Dimkpa na-agara obodo ozi, Ideh ji anya ya abụọ hụ kpọrọ kwere na 20/19/2020 na Lekki Toll Gate.
O ji ụgbọala ya bụga ụlọọgwụ ọtụtụ ndị mgbọ ndị agha tụrụ ụbọchị ahụ ọdachị na- agba anyammirị dara na Lekki Toll Gate.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 2
Ọ bụghị naanị nke ahụ, Ideh napụrụ agụ ihe ọ kpụ n' ọṅụ site na igbochi ndị agboro chọrọ ịwakpo ụlọakụ, zuo ohi ma suo ya ọkụ dịka ọgbaghara dapụtara ka ọdachi 20/10/2020 mèchàrà.
N'ihe onyonyo fegharịrị na soshal midịa, a hụrụ Ideh ka ọ na-agwa ndị ntorobịa ahụ jichaa mma na ngwa ọgụ ndị ọzọ na ọ kara ya mma na ha bụrụ ụzọ gbuo ya, kama ha ịwakpo ya bụ ụlọakụ.
Ọ gara n' ihu gwa ha okwu metụtara ha n' obi nke mere ka ha chịsa ọwa, hapụ ihe ha chọrọ ime.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 3
Na mkparịtaụka ya na ndị ụlọakụkọ Channels TV nwere, Ideh sị na ya amaghị ihe kàrà ya obi ịkpaa ụdị àgwà ahụ na- agbanyeghị na ndị agboro ahụ nweliri ike igbu ya.
O kwuru na ihe kpalietere ya nụ na ike ihe na- eme bido n' ọdachi 20/10/2020 gwụrụ ya ma chukwaa ya ụra abalị abụọ dịka ya sorola buru ozu ndị a gbagburu nakwa ndị mgbọ tụrụ buga ha ụlọọgwu.
Aisha Yesufu

Ebe foto si, Aisha Yesufu
Aisha Yesufu, onye Agbede dị n'okpuru ọchịchị Etsako West n' Edo steeti bụ onye a ma n'ihe gbasara ịgba mbọ maka ikike dịrị onye.
Yesufu so na ndị hiwere otu BringBackOurGirls( BBOG), otu tìrì mkpu pụrụ iche mere ka ụwa mata maka ntọrọ a tọrọ ụmụaka ụmụakwụkwọ nwaanyị Chiboknn' afọ 2014
Yesufu bụ onye e ji ikpu nkata n' ihu agwa eze okwu n' okwu gbasara ajọ ọchịchị na mmegbu ọha mmadụ mara.
Ọ pụtara ìhè n' ụzọ pụrụ ' oge mmalite ngagharịiwe EndSARS n' Abuja dịka ọ pụtara soro duo ndị ntorobịa na- eti mkpu maka mkpagbu ndị uweojii SARS.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Mana Yesuf onye togara maha wuru ewukarịa oge foto ya nke otu onye ntakụko sere ebe o weliri aka ka onye na- edu agha wuru na soshal midịa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Dịka ọtụtụ na-eto ya maka anaghị atụ egwu na ịkwụnyere ọha, mana ụfọdụ ndị mmadụ na- akpọ ya ajọ aha.
Ha katọrọ ya sị na ọ na- emegide okpukpere ndị ụka Alakụba bụkwa okpukperechi nke ya.
Mana Yesufu bụ azụanụka. Di ya bụ Aliu,onye akanwụtanti, e jịghị ya achị dịka ọ na- enyekwa ya ezi nkwado.
Ha lụọla onwe ha afọ iri abụọ majidekwa ụmụ atọ.
Falz

Ebe foto si, Getty Images
Otiegwu Folarin Falana, bụ onye a ma dịka Falz so na otu onye a ma ama ji ọkwa dịka onye aha ya na-ada ụda were nye aka n' ọgụ EndSARS.Falz so na ndị pụtara n' ama Lekki Toll Gate mee ngagharịiwe ahụ na- eleghị ihe o ga- eri ya. O jokes akara soshal midia ya gbasaa ozi EndSARS nụzọ pụrụ iche ma kpọkọtakwa ndị mmadụ maka ngagharịiwe.
Ọ kọwapụtara ihe o jirila anya ya hụ n' okwu mkpagbu ndị uweojii na- akpagbu ndị ntorobịa.
Ọbụladị mgbe ụfọdụ ndị ọzọ bu ngagharịiwe ahụ kụlawara bandị azụ, Falz kwuru na, "ịga n' ihu bụ ndụ," na ndị ntorobịa agaghị akwụsị iti mkpu ganye na ha enweta ihe ha chọrọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 4
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 5

End of X post, 6
Segalink

Ezigbo aha ya bụ Segun Awosanya mana eji Segalink mara ya n'elu soshal midia.
Ọ bụ ọnụ na-ekwu maka ọdịmma ọha.
O teelari o ji ekwu na iwu hiwere SARS ataala nchara nke bụ na o kwesiri ịgbanwe nke taa, nke echi.
Segun Awosanya na otiegwu Michael Ugochukwu Stephens eji Ruggedy baba mara bụ ndị mbụ malitere ikwupụte maka End SARS n'afọ 2017.
Segalink kwadoro ndị malitere ngaghariwe End SARS nke ugbua ma na ọ katọrọ etu e si hazi ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 7