EndSars Protest: CBN ebola ndị nkwado ngagharịiwe a ebubo 'terrorism', mana lee ihe iwu kwuru...

Onyeisi ụlọakụ etiti bụ Godwin Emefiele

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisi ụlọakụ etiti bụ Godwin Emefiele
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 7

Akụkọ gbasara etu ụlọakụ etiti bụ 'Central Bank of Nigeria' si kpachie akpa ego mmadụ iri abụọ bụ ndị so kwadoo ngagharịiwe e mere na Naịjirịa nwere n'ụlọakụ n'ọdịnso a, abụghịzị akụkọ ọhụrụ.

Nke na-akpọtụ ugbua bụ na ndị CBN gwara ụlọikpe dị n'Abuja na ihe ha ji kpachie akpa ego ndị a ndị ahụ bụ maka na ego ahụ yiri ego e ji akwado iyi ndụ egwu nke Bekee kpọrọ 'terrorism'.

Dịka ụlọntaakụkọ Punch si depụta, CBN gwara ụlọikpe na akpa ego ndị ahụ n'ụlọakụ bụ idebe ihe iwu kwuru.

Ha rụtụrụ aka n'iwu a kpọrọ 'Terrorism (Prevention)(Amendment) Act, 2013'

Iwu megidere iyi ndụ egwu

Ebe foto si, Terrorism Act

Nkọwa foto, Ihe iwu megidere iyi ndụ egwu kwuru

O nwere etu ngagharịiwe si yie iyi ndụ egwu?

Onye na-eme ngagharịiwe

Ebe foto si, AFP

Malachy Ugwumadu, bụ onye ọkaiwu a ma ama, gwara BBC na ihe na-eme n'etiti CBN na ndị nkwado ngagharịiwe 'End SARS' ekwesịghị ekwesị.

Ugwumadu jụrụ ajụjụ sị: "Gịnị kpatara o ji bụrụ ugbua ka CBN chetara na ndị a bụ ndị na-akwado 'terrorism'?"

"Ọ pụtara na CBN mabu na ndị a bụ ndị na-eyi ndụ egwu, ha wee gbachi nkịtị kemgbe?"

Ọ gara n'ihu kwuo hohaa na o nweghị ihe ọbụla jikọrọ ihazi maọbụ isonye na ngagharịiwe na iyi egwu.

Aha onyonyo, 'Ndịagha agaghị agọ na ha agbaghị mmadụ egbe na Lekki Toll Gate n'ihi na e bugara m ọtụtụ ụlọọgwụ'

Dịka iwu Naịjirịa si dị, ihe a ga-akpọ 'terrorism' gụnyere: igbu mmadụ, ịtọrọ mmadụ, iyija gọọmentị, ịwakpọ ụlọ gọọmentị maọbụ ụlọ gọọmentị mba ọzọ dị na Naịjirịa, iji manye gọọmentị ka ha mee ihe dị aghaa mọbụ hapụ ime ihe dị aghaa, nakwa ịkwado ndị mmadụ ka ha mee ihe dị otu a.

"Mana o nweghị ihe dị otu a mere na ngagharịiwe 'End SARS' nke e mere n'ọdịnso a."

Ime ngagharịiwe o megidere iwu Naịjirịaa?

Onye na-eme ngagharíiwe

Ebe foto si, EPA

Malachy Ugwumadu kwukwara na "iwu Naịjirịa nyere onye ọbụla ikike isonye n'otu ọbụla masịrị ya nakwa inwe ọgbakọ etu ọbụla o si masị ya, bụ nke Bekee kpọrọ 'Freedom of Association'".

"Ndi mmadụ nwekwara ikike ikwupụta obi ha etu o si masị ha, nke a kpọrọ 'Freedom of Expression' na Bekee."

Ugwumadu kọwara na e nwere iwu nke a kpọrọ 'Public Order Act' nke kwuru na ndị uweojii ga-enye ndị mmadụ ikike pụrụ iche tupu ha enwee ọgbakọ ọbụla.

Mana n'afọ 2007, Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja kachapụrụ ya bụ iwu, ma kwuo na o sitere n'aka ndị ọcha chịburu Naịjirịa n'oge gboo.

Ugwumadu kwuru sị, "Ka ọ dị taa, o nweghị iwu ọbụla machiri ndị mmadụ ime ngagharịiwe nke udo iji kwupụta obi ha."

Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia

Onye ntaakụkọ bụ Fisayo Soyombo kwuru na ọ bụ CBN na-eyi ndị mmadụ egwu:

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Aisha Yesufu kwuru na ọ ga-aka mma ma eziga onyeisi CBN ka ọ gaa Bornos steeti ebe ndị Boko Haram na-enye nsogbu:

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Faizon Dairo kwuru na onyeisi CBN na-ebutu onwe ya n'ala ịkpọ ndị haziri ngagharịiwe ndị oyiegwu:

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Ụlọọrụ 'National Broadcasting Commission' tara ụlọọrụ ntaakụkọ dị icheiche ahụhụ maka ibu akụkọ gbasara 'End SARS'.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

'Ihe niile gbasara okwu EndSARS na CBN nọ n'ụlọikpe'- Ọnụ na-ekwuru ụlọakụ CBN

Godwin Emefiele na ndị na-eme ngaghariwe EndSARS

Ebe foto si, Getty Images

Ọtụtụ akụkọ apụtala gbasara etu e si achọ imemina ndị isi ngaghariwe EndSARS na Naịjirịa.

Otu n'ime akụkọ a bụ na-akpọchịrị akpaego ụfọdụ ndị so mee ya ngaghariwe ahụ nwere n'ụlọakụ nke Central Bank of Naịjirịa kwuru na ọ bụghị ha mere.

Akụkọ ọhụrụ pụtara na ụlọakụ Central Bank of Nigeria gwara ụlọikpe na ego dị na ọba ego ụfọdụ ndị isi ngaghariwe EndSARS bụ nke e chere eji e yi ndụ mmadụ egwu.

Ọnụ na-ekwuru ụlọakụ CBN bụ Osita Nwanisiobi gwara BBC Igbo na ihe niile gbasara okwu ụlọakụ ha na ndị isi ngaghariwe EndSARS dị n'ụlọikpe nke mere na ọ gaghị ekwunwu ihe ọbụla maka ya.

EndSars Protest: Ihe ndị ị kwesịrị ịma maka END SARS na ebe ọ kwụ ugbua

Ndị na-eme ngagharịiwe EndSars

Ebe foto si, EPA

Na ndị ntorobịa Naịjiria pụtara ime ngagharịiwe kemgbe ihe karịrị ụbọchị iri na abụọ abụghịzị okwu, ihe onye ọbụla na-ajụ bụ maka ndị a gbagburu na ya bụ ngagharịiwe.

Mana dịka a na-ajụ ajụjụ a, ọtụtụ ndị amaghị etu ihe si gagide ije rute etu a.

Lee ihe BBC ma maka ngagharịiwe Endsars nke Ọktoba 2020

Gịnị butere ngagharịiwe Endsars?

A na-ekwukarị maka Endsars kwa mgbe kwa mgbe n'elu soshal midia ọkachasị mgbe ọbụla ndị uweojii gbufuru mmadụ na mpaghara dị icheiche na Naịjiria.

Mana ngagharịiwe Endsars nke Ọktoba 2020 a malitere mgbe ihe onyonyo gosiri ebe ndị uweojii wakporo ma kwatuo otu nwokorọbịa n'ụgbọala ha n'obodo Ughelli dị na Delta steeti.

Ngaghariiwe EndSARS

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị Naịjirịa bi na Kenya na-eme ngaghariiwe EndSARS

Nke a mere ka ndị mmadụ sị na mmegbu ndị uweojii na-eme ndị ntorobia na Naịjiria na ogbugbu a na-egbu ụfọdụ, ezuola, nke mere ha ji kpebie ime ngagharịiwe.

Kedụ ebe ọ bidoro?

Ngagharịiwe a malitere na Legọs wee garuo Abuja, tupu o si ebe ahụ gawa steeti ndị ọzọ dịka Rivas, Enugwu, Abia, Imo, Akwa Ibom, Ekiti na ndị ọzọ, dịka ndị mmadụ nọchiri ụfọdụ ụzọ ndị mmadụ na-esikarị agafe.

Ọ kwụsịghị ebe ahụ, o sikwa ebe ahụ gafee mba ndị ọzọ gụnyere Briten, Kanada, Amerịka, Jamini nakwa Saut Afrịka, dịka ndị Naịjiria bi na mba ahụ tinyere ọnụ ha.

Ndị nọ na soshal midia nọkwa na-eti mkpu nke ha, ka ọha nụrụ olu ha.

Gịnị ka ndị na-eme ngagharịiwe a na-achọ?

Ha na-akpọ oku ka e kposaa ngalaba uweojii a kpọrọ 'Special Anti-Robbery Squad' (SARS), bụ ndị a na-ekwu kacha akpa arụ a megide ndị ntorobia.

Ha kwukwara ka e ṅogharịa iwu jigidere ndị uweojii nakwa na-akwụlite ha ụgwọ.

Skip X post, 5
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 5

Dịka ha na-eme ngagharịiwe ha, ha kwuru na ha agaghị apụ maọbụghị ma gọvanọ steeti ha nakwa onyeisiala Naịjiria apụtara gwa ha okwu banyere ihe ha na-achọ.

Gịnị ka gọọmenti mere maka ya?

N'ụbọchị 12 nke ọnwa Ọktoba, Onyeisiala Naịjiria bụ Muhammadu Buhari pụtara kwuo na e kposaala ngalaba SARS.

Skip X post, 6
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 6

Okwu onyeisiala emeghi ka ndị ntorobia kwụsị ime ngagharịiwe ha, dịka ha na-ekwu na ihe ha chọrọ bụ ka e tinye anya n'ihe ha chọrọ ozugbo ozugbo karịa ikwe nkwa dịka ha si emebu.

Ndị gọvanọ na osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo nwelwara nzukọ ebe ha nọ kpebie ịhọpụta ngalaba ga-elebanye anya na mkpamkpa ndị uweojii na steeti ha dị iche iche.

Ndị ntorobia tuziri aka na e kposabuola SARS n'afọ 2017, 2018, 2019 nakwa na mbido 2020 a mana ihe na-ebe ka nọkwa na-ebe.

N'ebe dị ka Rivas steeti, Gọvanọ Nyesom Wike tiri iwu iji machie ngagharịiwe na steeti ya, mana ndị steeti ahụ pụtara n'igwe, kwechiri sị na ha ga-emerịrị ya bụ ngagharịiwe n'ihi na ọ bụ ikike ruru ha dịka iwu obodo si kwado.

Gịnị mere n'agbanyeghi ihe Onyeisiala kwuru?

Ka ụfọdụ na-eme ngagharịiwe na-enyeghi nsogbu maọbụ mebie ihe ọbụla, ka ụfọdụ ndị omekome pụtara na-akpa arụ.

N'Edo steeti, ndị omekome si n'ụlọmkpọrọ gbaa ọsọ mịpụ.

N'Abuja, ndị omekome malitere imebi ihe ndị mmadụ n'ụzọ, na-awakpo ndị na-eme ngagharịiwe.

Na Legọs, ụfọdụ ndị omekome malitere iwakpo ndị na-eme ngagharịiwe, ndị uweojii nakwa imebi ụfọdụ ihe.

Gịnị mere na Toll-Gate Lekki?

Ndị na-eme ngagharịiwe na Lekki Toll-gate ji obi ọcha ha pụta, dịka ha na-enwe aṅụrị na-agba ma na-egwu egwuregwu ebe ahụ n'ime ụbọchị niile ha nọ na-apụta.

N'ụbọchị Fraịde bụ 16 nke ọnwa Ọktoba, ndị alakụba nọ ebe ahụ mee ekpere ha na-enweghi nsogbu ọbụla; n'abalị Fraịde ahụ, a nọkwa ebe ahụ mee ịmụ anya abalị iji cheta ndị nwụrụ n'aka ndị uweojii; otu ihe ahụ mekwara n'ụbọchị ụka bụ 18, mgbe ụfọdụ ndị fada nke ụka Katọlik nọkwa ebe ahụ duo ụka na oriri nsọ.

Mana n'ụbọchị 20 bụ Tuzde, ihe niile tụgharịrị dịka ndịagha kwanyere mgbọ ka ndị na-eme ngagharịiwe gbakọrọ.

Kedụ etu ihe si ruo etu a?

Gọọmentị Legọs steeti tinyere iwu mmachi ngagharị site n'elekere anọ nke mgbede Tuzde, ụfọdụ ndị lawara be ha, mana ụfọdụ jụrụ ịla dịka ha kwuru na ha ga-anọ ruo mgbe gọọmentị gere ha ntị.

Ka o ji nkeji ole na ole gafee elekere isii nke abalị ahụ, ndị agha rutere ebe ahụ kwawa mgbọ, ebe ndị mmadụ nọ n'ala jide onwe ha aka ma na-efe ọkọlọtọ Naịjiria.

Dịka nke a na-aga ihu, gọọmentị Legọs amagharịkwa ọkwa mmachi ngagharị ha tinyeburu, sị na ha adọtikwuola ya ruo elekere itoolu nke abalị ahụ, ka ndị nọ na kpachi kpachi n'ụzọ nwee ike ịlaru n'ụlọ ha.

Gịnị bụ 'curfew'a ụfọdụ steeti tinyere?

Curfew ma ọ bụ mmachi ngagharị n'asụsụ Igbo bụ iwu gọọmentị tinyere iji hụ na ndị mmadụ apụtaghị ezi na-agagharị etu o si masị ha.

Gọvanọ steeti dị iche iche gụnyere nke Legọs bụ Babajide Sanwo-olu kwuru na ihe mere ha ji etinye mmachi ngagharị bụ iji kwụsị ọgbaghara dapụtara dịka ndị omekome malitere imebi ihe.

Ụfọdụ steeti dịka Imo, kwuru na ha na-etinye ya bụ iwu mmachi ngagharị iji gbochie ihe na-eme na steeti ndị ọzọ ime na nke ha.

Kedụ steeti ebe curfew a dị?

Steeti ndị gụnyere Legọs, Imo, Ekiti, Rivas, Abịa, Enugwu, Ebonyi, Plateau, Edo nakwa Ọshụn abanyela na ya bụ mmachi ngagharị, dịka ha zipuru ndị ọrụ nchekwa ka ha hụ na ndị mmadụ nọ n'ụlọ ha.