END SARS: Angela Okorie na-eme ejije sonyere ngagharịiwe END SARS n'Ebonyi steeti
Dịka ngagharịiwe maka ịkwụsị ngalaba uweojii bụ Special Anti-Robbery Squad (SARS) na Naịjirịa banyere n'ụbọchị itoolu, ndị Ebonyi steeti etinyekwuola ọnụ ha.
Angela Okorie bụ onye ejije Nollywood a ma ama, pụtara dọnyere ha ukwu dịka ndị ntorobịa na-agagharị na-ekwu uche ha gbasara ịkwụsị mmegbu ndị uweojii.
Okorie so ndị ntorobia ndị ọzọ na-ekwu na ha chọrọ ka ndị uweojii mara na ihe dịka ibu isi dada, iji ekwentị dịtụ ọnụ apụtaghị na onye ahụ bụ onye ori.