Justice for Chima: Anyị na ndị uweojii ekpebibeghi - Ezinaụlọ Chima Ikwunado

Chima Ikwunado

Ebe foto si, Chima Ikwunado/Facebook

Nkọwa foto, Chima Ikwunado nwụrụ n'ebe ndị uweojii jichiri ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ezinaụlọ Chima Ikwunado bụ nwoke a na-ekwu nwụrụ n'aka ndị uweojii na Pọtakọt ekwuola na ha na ndị uweojii ekpebibeghi ihe ọbụla.

Nke a na-abịa ka ndị mmadụ na-eche ihe ha na onyeisi ndị uweojii nke Rivas steeti bụ Mustapha Dandaura, kpara.

Obinna Ezirim bụ nwanne Chima gwara BBC na Dandaura kpọrọ ezinaụlọ ha oku ka ha kpaa dịka okwu na-efegharị na ndị uweojii kpọrọ ha oku ha ajụ ịza nakwa na ezinaụlọ ha kwuru na ha degara akwụkwọ na ha chọrọ ịhụ ya mana o nweghi isi.

Ezinaụlọ Chima Ikwunado
Nkọwa foto, Ezinaụlọ Chima Ikwunado

Obinna kwuru na ha na ndị uweojii kpebiri ịhụ ozu Chima nke ka dị n'aka ndị uweojii nakwa nke a ga-eme nyocha na Mọnde nke izu na-abịa.

"Kọmishọna uweojii sị anyị kpọta onye nnyocha nke anyị ụbọchị Mọnde, hanwa ga-akpọtakwa onye nke ha, e mezie nnyocha ahụ.

"Kọmishọna kwukwara na ọ di mma etu ezinaụlọ Chima si bịa, mana gọọmentị ga-elebarịrị anya na ya."

Ọrịa Coronavirus

Dkt. Li tinyere foto ebe ọ nọ n'elu akwa na soshal midia

Ebe foto si, Dr Li Wenliang

Nkọwa foto, Dkt. Li tinyere foto ebe ọ nọ n'elu akwa na soshal midia

Ọzọ bụ iwe ndị mmadụ na mba Chaịna maka etu ọrịa coronavirus si gbuo Li W bụ dọkịta bu ụzọ kwuputa maka ya na Disemba.

Ọtụtụ n'ime ha na-asị ka gọọmentị rịọ mgbaghara maka iji ndị uweojii gbọchie Li ọnụ, nke mere ka ọrịa a bụrụ ibu na-anyị danda ugbua.

N'egwuregwu,

Raheem Sterling nke Manchester City

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Raheem Sterling si Liverpool gafee Manchester City n'afọ 2015

Raheem Sterling nke Manchester City agaghị eso ha gbaa bọọlụ n'ime izuụka ole na ole na-abịa dịka ọ dọwachara akwara ụkwụ ya.

Ebe Daley Blind ga-alọghachịta ma soro ndị Ajax gbaa bọọlụ n'ụbọchị Satọde, ka a chọpụtachara na o nwere ọrịa obi.

'Supreme Court' sị Jolly Nyame gaa zuo ike afọ 12 na nga

Jolly Tavoro Nyame

Ebe foto si, EFCC

Nkọwa foto, Jolly Tavoro Nyame chịrị steeti Taraba na Naịjirịa site afọ 1999 ruo 2007

Ụlọikpe kachasị ekpebiela sị ka Jolly Nyame bụ aka chịburu Platu steeti ka nọrọ na mkpọrọ ruo afọ iri na abụọ a tụkpuburu ya.

Ngalaba na-ahụ maka nrụrụaka na Naịjirịa bụ Economic and Financial Crimes Commission gbara ama mkpebi ụlọikpe n'akara Twitter ha.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ebubo EFCC boro Nyame bụ na aka ya dị n'otu ijeri naịra na ọma e mefuru n'aka Taraba steeti oge ọ na-achị steeti ahụ.

Ndị ọkaiwu ise nke Mary Odili nọ n'isi ya, kachapụrụ nha ụlọikpe mkpegharị sị ka Nyame kwụọ.

Ọ bụ n'afọ 2007 ka ikpe a malitere.

Anyị arụghị ụlọekpere ndị alakụba - Gọọmentị Enugwu

Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi

Ebe foto si, Ifeanyi Ugwuanyi/Facebook

Kọmisọna na-ahụ maka mgbasaozi n'Enugwu steeti bụ Nnanyelugo Aroh ekwuola na o nweghi oge gọọmentị ha jiri hibe ụlọekpere maka ndị Alakụba.

Maazị Aroh sị na ọ bụ ndị asịrị na-ekesa ya bụ akụkọ ma kwukwa na ọ bụ arụrụala kpatara ha ji akpa ụdịrị agwa ahụ.

Ọ sị na akụkọ a bụ iji megide ọrụ gọọmentị Enugwu steeti na-arụ.

Uzodinma so Buhari aga Njem

Hope Uzodinma na Muhammadu Buhari

Ebe foto si, facebook.com/SenatorHopeUzodinma

Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-aga mba Etiopia taa bụ Febrụwarị 7 2020, maka ọgbakọ ndị mba Afịrịka na-aga n'ihu n'isiobodo mba ahụ bụ Adis Ababa.

Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodinma ga-eso Buhari na njem ga-abụ mbụ o so ya aga kemgbe Ụlọikpe Ukwu nyere ya ọkwa gọvanọ Imo.

Ị chọrọ ịza ogbu enyi?

Enyi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị mmadụ na-ahụta enyi dịka eze ụmụanụ niile

Mba Botswana na-enye ndị mmadụ ikike igbu enyi narị abụọ n'afọ 2020.

Mana, ya bụ ikike abụghị n'efu dịka ọ bụ puku dọla iri na asatọ ka e ji enweta otu.

A ahọpụtala ndị enwereike tugo na AMVCA

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ndị na-eme ejije n'Afịrịka na-ahazi onwe ha maka emume ntụrụugo akpọrọ African Magic Viewers Choice Awards.

Ọtụtụ n'ime ha na-enwe nchekwube na ha ga-etụta ugo maka mbọ ha gbara n'ejije ihe nkiri dị iche iche n'afọ gara aga.