#EndSARS: Mgbanwe ọ bịala na ngalaba uweojii a ndị mmadụ kpụ n'ọnụ?

Ebe foto si, AFP
Ndị Naịjirịa amalitela ịchọ ka amachịe ngalaba uweojii akpọrọ SARS n'ịchafụ site na atụmatụ akpọrọ #EndSARS na soshal midia, ọkachasị Twitter.
Cheta na n'ime afọ gara aga ndị mmadụ na soshal midia malitere atụmatụ #EndSARS a ka ọtụtụ mmadụ bidoro ide ihe ha na-ahụ n'aka ndị SARS, ọkachasị etu ha si awakpo ha ma napụ ha ego n'ike.
Mgbe ahụ, akara #EndSARS wuru ewu ọfụma, nke mere ndị uweojii jiri tinye ọnụ na ya bụ ihe na-ese okwu ma kwuo na ha ga-ahazịgharị SARS.
Mana, ka ndị mmadu na-ekwu na soshal midia, nakwa site n'ihe na-emegasị, ụfọdụ ndị SARS ka na-aga n'ihu na-emekpa umu Naịjirịa ahụ.
N'ọnwa Maach nke afọ a, Immanuel James Ibe-Anyanwu tiri mkpu na Facebook na ndị SARS chebiri ya ka osi ụlọaku apụta were chọ iwakpo ya. Mkpu a otiri mere ka ndi mmadụ, ma onye bu ọnụ na ekwuchitere uweojii na Legọs, gbatara ya ọsọ nyemaka. Ndị uweojii mechakwara jide ndị kpara ike a.
Gee etu o siri kọwa njem ya ebe a:
Ka a ka na-ahụ asọ Ibe-Anyanwu gbụrụ n'ala anya, onye ọzọ tikwara udiri mkpu ahụ na Twitter.
Nwaada Ifeoluwa Adegoke, bụ onye ji akara @ife_luv12 na Twitter dere na otu onye uweojii wakporo ya ma yie ya egwu, n'ihi na ọ jụrụ inye ya ego n'agbanyeghị na onye uweojii ahụ kwuru na ọ gaghị ahapụ ya ma ọ bụrụ na o nyeghị ya ego.
Mkpụ a na soshal midia mere ka anwụchịkọ onye uweojii kpara ike a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Mana, agbanyeghi na ndị mmadu dị ka Ibe-Anyanwu na Ifeoluwa Adegoke jizi soshal midia na-eti mkpu na-eme ka ejide ndị aka ha dị na arụ a, akụkọ ndị akpasiri ụdịrị agwa ka na-apụtakwa.
Ngalaba anọghi na gọọmentị na-ahụ maka mmekpa ahụ bụ nke akpọrọ Amnesty International n'asụsụ Bekee dere na nchọpụta ha mere gosiri na ndị SARS na-enufuru iwu obodo isi ma na-awakpo ụmụ Naịjirịa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ha gakwara n'ihu dee na ndị uweojii na-ahụ ikete ọrụ na ngalaba SARS ka ohere iji bụrụ ogalanya, nke mere otu onye n'ime ha jiri kwuo na ha na-akwụ ihe ruru puku naira 300 iji nye aka azụ ka ha nweta ọrụ a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Ka amalitere #EndSARS ọzọ, ihe ndị mmadụ na ajụ bụ ma mkpu nke ugbua ọ ga-eme ka ndị nwere ikike ịhazị ngalaba uweojii a ha a ga-eme ihe ndị a na-akwado atụmatu a chọrọ?
Na mkparịtaụka BBC Igbo mere banyere okwu a na Facebook n'ime izuụka ato gara aga, nwaafọ Igbo bụ ọnu na ekwuchitere ndị uweojii na Legọs steeti bụ Chike Oti kwuru na ọrụ ndị uweojii bụ ichekwa ndị mmadụ. Ọ gakwara n'ihu kwuo na ọ bu eziokwu na o nwere ndị uweojii na-akpa arụ, mana ọ bụ mmadụ ole na ole n'ime ha.
Na ọzọ, o kwukwara na ndị ọrụ uweojii ruru mmadụ puku 400, nke mere mmadụ agaghi ịsị na ndi na-eme mpụ anọghị n'ime ha, ma a na-achụ ha ma achọpụta ihe ha mere.
Oti gakwara n'ihu were si na ọ ka onye uweojii mma na ọ yipụrụ uwe ya wee kpawa ike, makana ọ bụru na onye uweojii kote okwu, o kaara ya mma na-amụghị ya amụ.
Mana, okwu ya ka koro n'elu makana ihe na-ebe ka na-ebe.
#EndSARS ka na-ewukwa na Twitter ka anyị na-ede akụkọ a.

Akụkọ ga-amasi gị:











