N'Oyo Steeti, egbuola onyeisi SARS

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ọchị ehi egbuola onyeisi otu ndị uweojii na-ahụ maka imegide ndị oji egbe ezu ohi akpọrọ SARS n'aha ịchafụ.
Nke a mere oge ya na ndị otu ya na-achọ inapụ ndị ọchị ehi ngwa ọgụ ha ji mgbe ha wakporo ndị ọrụ ugbo na Shaki dị n' Ọyọ steeti.
Akụkọ na-ekwu na ndị uweojii a nwụtara kepukepu na ndị ọchị ehi nọ na Oyo na-eyi ndị bi ebe ahụ egwu ma na-awakpo ụmụnwaanyị ha.
Ndị ọchị ehi ahụ bidoro gbawa ndị uweojii ahụ egbe nke gbagburu onyeisi SARS akpọrọ Sheu Magu.
Otu onye hụrụ ka osi me kwuru na ndị na-achị ehi iwakpo nwaanyị na izu ndị mmadụ ohi abụghị ihe ọhụrụ n'ogbe ahụ.
O kwukwara ndị ọchị ehi Bororo na-arụ arụmana a kemgbe;ha na-ejị egbe ha echekwa ehi ha n'oge ehihie ma were ya gbuo ndị mmadụ n'abalị.
Mana ọ bụ ọnwụ Magu mere nsogbụ a jịrị pụta ihe.
O mere ka ọ meghị?
Mgbe BBC gbara onye na-ekwuchitere ndị uweojii ọnụ n'Oyo bụ Adekunle Ajisebutu,ajụjụ, o kwetere n'ihe mberede a mere na Shaki tara isi onye otu ha.
O sị na ha anwụchiela mmadụ anọ echere nọ ọ bụ ha kpara mkpamkpa a.
"Anyị na-enyocha ya bụ ihe."










