Judicial Panel of Inquiry: Steeti Ọwụwa Anyanwụ edepụtala aha ndị ga-enyocha SARS

Ebe foto si, Ikpeazu /Obiano twitter page
Ụfọdụ ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ ekpokọbala otu ga-amalite inyocha ma kpee ndị uweojii SARS a na-ebo ebubo oke ogbugbu na mmekpa ahụ ụmụ Naịjiria.
Gọvanọ Abia steeti họpụtara ndị ga-anọ n'otu a ga-elebanye anya n'ihe gbasara mmegbu ndị uweojii na-eme ndị mmadụ na steeti ahụ.
Ndị Gọọmenti Abia hụpụtara
Ndị Gọvanọ Abịa steeti họpụtara gụnyere:
Ọkaikpe S N Imo (larala ezumiike nka) - Onyeisi ngalaba a
Nwakanma John
Daniel Chinagozi
Ariwa Zuby
Eric Ikwuagwu na-arụ na ministrị ikpenkwụmọtọ
Bishọpụ Sunday Onuoha
John Emejor
Nnanna Nwafor
Mrs Doris Ogala
Ha ga-amalite n'elekere mbụ nke ehihie Fraịde bụ 23 nke ọnwa Ọktoba a.
Ndị Gọọmenti Anambara steeti Họpụtara
Gọọmenti Anambara egbughị oge n'ihibe nke ha.
Kọmịshọna mgbasaozi steeti ahụ bụ Don Adinuba depụtara aha ndị so n'otu 'judicial Panel of inquiry' dịka:
Adinuba gakwara n'ihu depụta aha onyeisi ngalaba ahụ dịka Justice Umeh laalara ezumike nka.
Ndị ọzọ gụnyere:
1. Onye nnọchiteanya ụmụakwụkwọ niile nọ
2.Ndị isi ntoroọbịa atọ si mpaghara atọ n'Anambara
3. Otu onye na-efe ala nna ya na steeti ahụ
4. Onyeisioche otu 'Civil Liberties Organisation' nke steeti ahụ
5. Onyeisioche 'Youth Council of Nigeria', ngalaba dị na Anambara steeti
6. Onye nnọchiteanya ngalaba ndi ntoroọbịa Ohaneze ndịIgbo nke dị na Anambra steeti.
7. Onyeisioche ngalaba jịkọtara otu nke Kraist na Anmbra steeti
8. Onye nnọchiteanya Archibishop ụka Anglikan, nke Niger
9. Onye nnọchiteanya Archbishop ụka Catholic, nke diocese Onistha
10. Onye nnọchiteanya Pentecostal Fellowship of Nigeria, nke Anambra steeti
11. Onye nnọchiteanya onyeisioche otu jịkọtara Anambra State Traditional Rulers Council.
12. Onye ọkaikpe ukwu nakwa kọmishọna na-ahụ maka ikpe kwụ ọtọ.
13. Kọmịshọna na-ahụ maka ndị ntoroọbịa nakwa ọnatarachị
14. Ndị kachasị bụrụ ntoroọbịa n'etiti State Executive Council
15. Onye ndụmọdụ gọvanọ Anambra steeti n'ihe gbasara nchekwa zuru oke
Ndị ọzọ ga-esonye gụnyere
1. Comrade Chijioke Ifediora2. Comrade Chukwuma Okpalaezeukwu3. Comrade Miriam Tochukwu Godspower4. Comrade Henry Chibuike Ugwu,
Akụkọ ka na-abịa dịka anyị ga-ewetara ụnụ aha ndị so na ọgbakọ "Judical Panel of inquiry" na steeti ndị ọzọ.











