Ifeoma Abugu: Sineti enyeela iwu e lebanye anya n'ọnwụ nwa ada a n'aka ndị SARS'

Ụlọomeiwu Ukwu, Ifeoma Abugu

Ebe foto si, Senate/Alex Abugu

Ụlọomeiwu nke Ukwu(Senate) enyeela Kọmịtị na-ahụ maka ihe gbasara ndị uweojii na okwu metụtara iwu na ikike dịị onye iwu ka ha nnyocha ihe mere n'okwu Ifeoma Abugu.

Aha onyonyo, 'Etu nwanne m nwaanyị sị nwụọ n'aka ndị SARS'

Nke a mere ụbọchị Tuzde dịka Sinetọ na-anọchite mpaghara Enugu-North n'Ụlọomeiwu Ukwu bụ Chukwuma Utazi bulitere okwu ahụ n'ọgbakọ ha.

Ifeoma Abugu, onye fechara ala nna ya n'afọ 2019, nwụrụ n'ụzọ edobeghị anya n'aka ndị uweojii 'SARS ndị nwụchiri ya dịka ha wakporo ụlọ nwoke na-achọ ịlụ ya n'Abuja n'izu ole na ole gara aga.

Mana Utazi sị na ịkpụrụ Ifeoma ebe a hụghị onye chọrọ ịlụ ya megidere Iwu Naijiria ọkachasị "akụkụ nke Asaa Iwu maka mpụ Bekee kpọrọ 'Criminal Jusctice Act' nke machiri ịnwụchi onye ezinaụlọ maọbụ enyi onye a na-enyo enyo maka ebubo ịda iwu."

Chukwuma Utazi

Ebe foto si, Chukwuma Utazi/Facebook

Ụlọomeiwu Ukwu nyere kọmiti ntuziaka ilebanye anya na ntuziaka onyeisiala nyeburu ka a hazigharịa SARS n'ihi mkpu ọha mmadụ na-etizi maka mkpamkpa ngalaba ndị uweojii ahụ na-akpazi na Naijiria.

'Etu Ifeoma Abugu, nwanne m nwaanyị sị nwụọ n'aka ndị SARS'

Nwanne Ekwutosi Ifeoma Abugu bụ Alex Abugu akọwarala BBC Igbo etu nwanne ya nwaanyị siri ghọọ ozu n'ogige ndị uweojii pụrụ iche a kpọrọ SARS n'Abuja.

Alex, onye jụpụtara n'anya mmiri dịka ya na BBC Igbo na-enwe mkparịtaụka kwuru na ọ bụ n'ekwenti ka a kpọrọ ya gwa ya na nwanne ya nọ n'aka ndị uweojii mana tupu otu abali agaa, a gwa ya na nwanne ya aghọọla onye nwụrụ anwụ.

Alex Abugu

Dịka o siri kọwaa, o rubeghị otu izuụka Ifeoma kpọtaara Afam Ugwunwa bịa gosi ndị ezinaụlọ ha n'obodo bụ Enugwu Ezike dịka onye chọrọ ịlụ , ebe ha hiwere alụmdị hja n'ọnwa Disemba afọ tupu ọdachi a adapụta.

Aha onyonyo, #EndSars: Ekwesiri imechi Sars kpatakpata

Ọ gara n'ihu gwaa BBC Igbo na ọ bụ nwanne ya nwoke ọ tọrọ kpọrọ ya n'ekwentị kọọrọ ya ihe mere.

"Ọ gwara m na ndị uweojii kpụrụ Ekwy Ifeoma Stella na be enyi ya nwoke mgbe ha ahụghị ya n'ụlọ".

Alex onye hapụrụ Legọs ebe o bi gawa Abuja maka okwu a kwuru na a gwara ya Ifeoma na Afam richara nri, Afam na enyi ya nwoke apụọ.

Aha onyonyo, 'Kọntena dagburu nwa m nwaanyị ka ọ na-alọta ọrụ' - Nne Chidinma Ajoku

"Ndị uweojii bịara ịnwụchi Afam mana ha ahụghị ya n'ụlọ, ha hụ Ifeoma kpụrụ ya pụọ."

Mgbe BBC Igbo na enyi ya nwoke bụ Afam Ugwunwa nwere mkparịtaụka, Afam kwuru na aka ndị ilo dị n' ọnwụ "nwunye" ya.

Ọ sị na, "mgbe ọ (Ifeoma) kpọrọ m gwa m ihe mere, agbalịrị ihe niile ịhụ na ọ larụghị n'ime ụlọ nga ma mefuo ihe ruru naira puku narị isii ị hụ na ọ pụtara mana amaghị m ihe a kọrọ n'isi ya".

Aha onyonyo, Ekwustosi Ifeoma Abugu: 'Agbalịrị m ihe niile ịhụ na Ifeoma arahụghị na nga ndị uweojii'

Ha kọwara na ihe ndị uweojii na-asa n'ọnwụ Ifeoma bụ na ha hụrụ ntụ 'cocaine' n'elu tebulu n'ụlọ ahụ ma hụ nwa ada ahụ ka o dina na amaghị onwe ya, ha buga ya ụlọgwụ ebe ndị dọkịta kwuru na ọ nwụọla.

Mgbe BBC kpọtụrụ ndị uweojii n'ekwentị ha kwuru na Bala Ciroma bụ onyeisi ndị uweojii n'Abuja ekwuola ka ebido nyocha banyere ihe a mere ozugbo ozugbo

N'akwụkwọ ozi ha depụtara, ha kwuru na ebidola nyocha nakwa 'nyocha ozu' nwa ada ahụ iji mara etu o si nwụ.

Ha jikwa ohere ahụ zigara ezinaụlọ Abugu ozi iti aka n'obi.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: