Iyana Ipaja: Kọntena si n'elu daa akwọjipula nwaanyị ụkwụ na Legọs

Ebe foto si, LASEMA
Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na nwaanyị aha a na-amabeghị aha ya na-azọ ndụ ya n'ụlọọgwụ ka kọntena ahụ dagidere ya kwọjipuru ya otu ụkwụ.
Ndị ụlọorụ gbatagbata Lagos State Emergency Management Agency (Lasema) agaruola Iyana Ipaja bụ ebe ihe a mere, ịma etu ha ga-esi nyere aka.
Ka ọ dị ugbua, onyeisi ha bụ Olufemi Damilola Oke-Osanyintolu sị na a kpọgala ya ụlọọgwụ, ma kwukwaa na ha na-agba mbọ ịwepụta ụkwụ nwaanyị ahụ n'okpuru kọntena ahụ nakwa wepụ kọntena ahụ n'ụzọ.
Anyị ga-ebu ọnụ otu izu maka ọkwa Ihedioha - PDP Imo steeti

Ebe foto si, Emeka Ihedioha/Facebook
Ndị otu pati PDP nke Imo steeti na-akwado ibu ọnụ na ime ekpere otu izu bido ụbọchị ụka a bụ ụbọchị itoolu nke ọnwa a ruo ụbọchị iri na isii.
N'akwụkwọ odeakwụkwọ pati ha bụ Nze Ray Emeana zipụrụ, o kwuru na ekpere a bụ ịrịọ Chineke ka o nyere aka mee ka Emeka Ihedioha nwetekwa oche ya dịka gọvanọ Imo steeti.
Ha sịkwa ka ndị mmadụ yiri akwa ojii kwa ụbọchị ekpere a.
Cheta na Ihedioha agaghachịla ụlọikpe kachasị ịma ma o nwere etu ọ ga-esi weghachịtakwa oche o si na ya pụọ.
Ighalo agaghị eso Man Utd gaa Spen

Ebe foto si, Getty Images
Odion Ighalo agaghị eso Manchester United gaa ọgbọ nkwado ha chọrọ ịga na mba Spen maka ụjọ coronavirus.
Ole Gunnar Solskjaer bụ onye nchịkọta otu egwuregwu ahụ sị na ha achọghị ọnọdụ ọ ga-abụ na ha gaa, agaghị ekwe ya banyeghachị na Briten maka etu a ọ ka si Chaịna bịa n'izu gara aga.
Onye agha ewerela egbe baa obodo gbagbuo ihe ruru mmadụ 20

Ebe foto si, Facebook
Akụkọ si Taịland apụta na-akọwa na otu onye agha ji egbe gbagbuo mmadụ iri abụọ (20) ma merụọ ọtụtụ ndị ọzọ ahụ n'obodo Korat dị nso na Bangkọk.
Thomma bu ụzọ gbagbuo onyeisi ya bụ Col Anantharot Krasae, tupu o zuru egbe na ngwaagha ndị ọzọ pụọ.
Ihe ndị mmadụ na-etinye na soshal midia na-egosi na ọ gara n'ụlọahịa ebe ọ nọ na-agwụ ndị mmadụ.
Dịka ndị uweojii siri kwuo, onye agha a zuru ụgbọala n'ọdọ ndịagha tupu o jiri egbe wakpoo ndị mmadụ na ya bụ obodo.
O tinyekwara ihe onyonyo ebe ọ na-akwọ ụgbọala ahụ n'elu Facebook ya.
Ka ọ dị ugbua, a ka na-achọ ijide ya dịka e zipuru ozi "onye a bụ onye a na-achọsi ike" maka ya.
Ọzọdịmgba anọ anwụọla

Ebe foto si, Getty Images
Amụma igwe esegbuola ọzọdịmgba anọ gụnyere otu nke dị ime na mba Uganda.
Ngalaba na-ahụ maka nlekọta ha bụ Greater Virunga Transboundary Collaboration (GVTC), kwuru na nke a dị mwute n'ihi na ụdịrị ọzọdịmgba a na-ahụ naanị n'ugwu ji naanị obere ihe gafee otu puku n'ụwa.
'Anyị achọghị ịhụ ndị ji ọkọrọtọ Biafra n'olili Eze Kanu' - Ndị Uweojii

Ebe foto si, @MaziNnamdiKanu
Dịka Olili nne na nne Nnamdi Kanu na-abịa nso, ndị uweojii n'Abịa steeti ekwusiela ike na ha achọghị ihu onye ji ọkọrọtọ Biafra maọbụ uwe ndị 'Jew' n'ebe ahụ.
Ene Okon bụ onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ etiela aka n'ala sị na ya agaghị anọ ndụ hụ ka nke ahụ mere dịka otu Ipob na-azọ iwu na ha ga-abịarịrị.
N'aka ọzọ, otu ndị ntoroọbịa Ohaneze ndị Igbo arịọla ka gọọmenti gbaghara Nnamdị Kanu ka ọ nwee ike ịbata bịa lie nne ya na nna ya.
Nnamdi Kanu na onwe ya tiri mkpu n'elu Twitter na ndịagha Naịjiria na-akwado ịga n'ụlọoriri na nkwari ndị dị n'Ụmụahịa, ka ha nwee ike "ịkpụrụ ndịisi Ipob nwereike ịbata tupu e mee akwamozu" nne na nna ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ndị uweojii sị na ọbụghị ogbunigwe

Ebe foto si, AFP
Ndị uweojii n'Ekiti steeti ekwuola na ọ bụ ihe eji agbari ogbunigwe gbara na steeti ahụ n'ụtụtụ taata.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Asuquo Amba sị na ọ bụghị ndị omekome mere ihe a mana ha na nyocha ịmata etu o si mee.
Coronavirus na Chaịna

Ebe foto si, AFP/Getty Images
N'ofesi, Hong Kong etiela iwu ga-eme ka onye ọbụla sị mba Chaina bata obodo ahụ ga nọrọ n'ogige ebe ndị ana enyonyo maka Coronavirus ruo izuụka abụọ.
Ya bụ iwu sị ndị mmadụ akwụgharịzịna, maka ịtụ ha mkpọrọ maọbụ iri ha iwu.
Lagos City Marathon

Ebe foto si, @POOJAMEDIA
N'egwuruegwu, onye mba Kenya bịara Nigeria maburu nturuugo nke mwemwe ọsọ nke Legọs Marathon agbara n'ụtụtụ a
David Barmasai Tumo ji awa abụọ, nkeji iri abụọ na tịnkọm tịnkọm isii merie ya bụ ọsọ kilomita iri anọ na abụọ mgbe ọtụtụ ndị ọtụ ya ka nọ n'ụzọ.
Ọ bụkwa onye Kenya ọzọ bụ Sharon Cherop tuuru ugo mwemmwe ọsọ nke ụmụnwaanyị.
Onye nke abụọ na onye nke atọ na ya bụ ọsọ ga-erita $40,000 nakwa $30,000.
Nke a bụ agba nke anọ ya bụ ọsọ malitere n'afọ 2016 bụ nke a na-eme na Legọs.
Kemgbe amalitere ya bụ ọsọ, ndị Kenya emeriela ya ugboro atọ ebe onye Etiopia merigoro otu ugboro n'ọsọ nke ụmụnwoke.
Na nke ụmụnwaany,i ndị Etiopia emeriela ugboro atọ ebe Kenya ji otu.
Trump achụọla ndị iro ya n'ọrụ

Ebe foto si, EPA
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump achuọla Alexander Vindman na Gordon Sondland n'ọrụ.
Mmadụ abụọ a so n'ime ndị zara okwu Ụlọomeiwu Nta nke Amerịka oge ha na-enyocha nrụrụaka ha boro Trump.
Ọchịagha Vindman na-arụ ọrụ na obi gọọmentị Amerịka ebe Nnọchiteanya Sondaland bụ onye na-ekwuru Amerịka na Yurope.
Nke a na-abịa dịka a na-ekwu na Maazị Trump chọrọ ịhazịarị ndị ọrụ ya dịka ndi Omeiwu Ukwu kpebiri na onweghi arụ ọ kpara.
Onyeisiala Muhammedu Buharị nọ Ethiopia maka ọgbakọ

Ebe foto si, Facebook/Femi Adesina
Ụmụibe Onyeisiala Muhammadu Buhari anwuchiela mba Ethiopia ụnyahụ maka nzụkọ ndị isi mba Africa.
Mba iri anọ so eme ya bụ ọgbako ukwu akpọrọ maka ọdịmma ndị Afrịrịka
Ego Abacha

Ebe foto si, NIGERIA HIGH COMMISSION
Ụnyaahụ bụ Fraịde ka ụlọikpe ukwu na Naịjirịa tụghapụrụ arịrịọ ezenaulo na-arịọ ka enye ha ohere ibitu ego otinyere n'ụlọakụ na Briten, Switerzland, Jersey, Liechtenstein nakwa Luxembourg.
Gaurdiola sị na anya ya adịghị na Messi

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuruegwu, Pep Gaurdiola nke Manchester City ekwuola na ya anaghị atụanya Lionel Messi isonyere ya na otuegwuruegwu ya.
Messi na otu onyeisi ha bụ Eric Abidal na-enwe nghọtahie na Barcalona nke ndị mmadụ na-atụ anya na o nwere ike ịpu na otu ahụ.










