Imo State: 'Ọ bụ PDP ka ọ dịrị ịsa Mbaka okwu' - Onye mgbasaozi Ihedioha

Ndị mmadụ na-ekwu etu inwe ndị nnọchịteanya otu pati dị iche iche n'ụlọomeiwu Imo steeti ga-esi emetụta nkwekọrịta n'ọchịchị Emeka Ihedioha.

Ebe foto si, Emeka Ihedioha/Facebook

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Odeakwụkwọ mgbasaozi akachiburu Imo steeti bụ Chibuike Onyeukwu‎ sara Rev. Fr. Ejike Mbaka nke Adoration Ministry okwu ọ gwara Emeka Ihedioha.

Ọ sị na ha 'agaghị asa Mbaka okwu ọbụla gbasara ihe ahụ o kwuru maka na ọ bụghị ha ka ọ diiri ịsa ya bụ okwu'.

Ọ sị na ọ bụ pati ha bụ PDP ka ọ bịịrị ịsa ya bụ okwu.

N'oziọma o ziri n'Adoration ministry n'izu a, Mbaka dọrọ Ihedioha aka na ntị ya kpachara anya maka ihe ọ na-ekwu gbasara ọchịchị ya ụlọikpe kachasị kpagburu.

Mbaka sị na ọ bụrụ na Ihedioha akpachaghị anya, ọ gaa mkpọrọ maka okwu ya.

Sineti ahọpụtala ndị ga-etinye anya n'akwụkwọ iwu Naịjiria

E bughi m ọkwa ụlọomeiwu gbapụ

Ebe foto si, @NGN Senate/Facebook

Onyeisioche ụlọomeiwu ukwu bụ Ahmed Lawan akpọpụtala aha mmadụ iri ise na isii (56) dịka Kọmitii ndị otu ya hibere ilebanye anya na maka ịhazigharị iwu Naịjria.

Lawan kwuru nke a n'ọgbakọ ndị Sineti taa bụ Tọzde, ebe ọ nọ kwuo na esetechere mmadụ n'ọgbọnta vootu dị icheiche ime ka ndị ọbụla nwee ndị nnọchiteanya na ya bụ kọmitii.

Ndị nwere agba na ya bụ kọmitii gụnyere:

Osote onyeisoche Sinet bụ Ovie Omo-Agege (Onyeisioche kọmitii); Onyendu Sineti, Yahaya Abdullahi; Osote onyendu, Ajayi Boroffice; Onyeisi pati ndị ejighị ọchịchị, Enyinnaya Abaribe; Osote ọchọudo nke Sinet akpọro Deputy Whip, Aliyu Sani Abdullahi; Onye na-esote onyeisi ndị pati na-anoghị n'ọchịchị, Emmanuel Bwacha; Ọchọudo nke ndị pati na-anọghị n'ọchịchi bụ Minority Whip, Philip Aduda; na osote ya bụ Deputy Minority Whip, Sahabi Alhaji Ya'u.

Ndị omeiwu ahọtara na mpaghara dị icheiche bụ:Theodore Orji, Abịa; Aishat Ahmed, Adamawa; Bassey Akpan, Akwa Ibom; Stella Oduah, Anambara; Haliru Jika Dauda, Bauchi; Biobarukuma Deji-Eremenyo, Bayelsa; Gabriel Suswam, Benue; Abubakar Kyari, Borno; Gershom Bassey, Krọs Riva; James Manager, Delta; Samuel Egwu, Ebonyi; Matthew Urhoghide, Edo; Opeyemi Bamidele, Ekiti; Ike Ekweremadu, Enugwu; na Mohammed Danjuma Goje, Gombe.

Ndị ọzọ bụ: Rochas Okorocha, Imo; Sabo Mohammed, Jigawa; Uba Sani, Kaduna; Kabiru Gaya, Kano; Baba Ahmed Kaita, Katsina; Mohammed Adamu Aliero, Kebbi; Smart Adeyemi, Kogi; Suleiman Sadiq Umar, Kwara; Oluremi Tinubu, Legọs; Abdullahi Adamu, Nasarawa; Mohammed Sani Musa, Naịja; Ibikunle Amosun, Ogun; Nicholas Olubukola, Ondo; Surajudeen Ajibola, Ọshụn; Teslim Folarin, Ọyọ; Hezekiah Ayuba, Platu; George Thompson Sekibo, Rivas; Aliyu Wamakko, Sokoto; Yusuf A. Yusuf, Taraba; Ibrahim Geidam, Yobe; nakwa Mohammed Hassan, Zamfara.

Ndị nnọchịteanya ọgbọnta sineti bụ: Bala Ibn Na'Allah na Ibrahim Shekarau, Nọt-Westị; Kashim Shettima na Lawal Yahaya, Nọt-Ist; Tanko Al-Makura na Yakubu Oseni, Nọt-Sentralụ; Abdulfatai Buhari na Biodun Olujimi, Saụt-Westị; Lilian Uche Ekwunife na Chukwuka Utazi, Saụt-Ist; Rose Oko nakwa Akon Eyakenyi, Saụt-Saụt.

Ndị Red Cross akwadola maka Coronavirus

Nigerian Red Cross

Ebe foto si, Nigerian Red Cross

Nkọwa foto, Nigerian Red Cross sị na ha nwere ndị ji aka họpụta onwe ha inyere aka ma ọ bụrụ na ọrịa coronavirus mechaa tinye isi na Naịjiria

Ngalaba gbatagbata maka ahụike bụ Nigerian Red Cross, ekwuputela na ha agwala mmadụ otu nde ka ha saa anya mmiri maka ịkwụsị mgbasa ọrịa coronavirus na Naịjiria.

Abubakar Ahmed Kende bụ odeakwụkwọ ha, kwuru na ha na ụlọọrụ Nigerian Centre for Disease Control na-arụkọ, ịhụ na ha busoro ọrịa agha.

Coronavirus adịbeghi na Gana

Ndị mba Gana ekwuola na ha achọtaghị ọrịa coronavirus n'ahụ mmadụ abụọ a na-enyochabu maka ya na mba ha.

Mmadụ abụọ ahụ bụ otu onye Chaịna na onye Ajentina, ji aka ha gaa ụlọọgwụ ka ha na-arịa ọrịa dị ka o yiri coronavirus tupu e nyochawa ha.

Naịjiria nwezịrị naanị pati 18

Onyeisi Inec

Ebe foto si, Inec/Twitter

Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ nke Bekee kpọrọ Independent National Electoral Commission (INEC) ewetuola ọnụọgụgụ otu pati nọ na Naịjirịa site n'iri isii na asaa ruo iri na asatọ.

Onye kwuru nke a bụ onyeisi Inec bụ Mahmood Yakubu n'Abuja taa.

Trump ga-achiri gawa

Donald Trump

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisiala Amerịka Donald Trump

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump nwetere ohere ịchịri gawa n'ihu dịka ndi omeiwu kpebiri na o metaghi ihe a ga-eji chụọ ya n'ọrụ.

Ndị sineti Amerịka mere ntuliaka n'abalị Wenezde iji mara ndị kwadoro ka Trump rituo n'ọchịchị maka ebubo nrụrụaka Ụlọ Omeiwu Nta boro ya ma jiri mee ya ihe Bekee kpọrọ "Impeachment".

Ka e mechara ntuliaka a, mmadụ 52 ekwenyeghị ka a chutuo Trump ebe mmadụ 48 kwenyere.

Naanị otu onye otu ndọrọndọrọ ọchịchị Repọblikans, bụ nke Trump nọ na ya, kwenyere ka a chutuo onyeisiala ahụ maka nrụrụaka Ụlọ Omeiwu Nta kpebiri na o mere site n'isi Onyeisiala Yụkren nyochawa Maazị Joe Biden na nwa ya nwoke Hunter.

Aha ya bụ Mitt Romney.

Mitt Romney sị na ọ bụ maka iyi ya nwụrụ n'ihu Chineke mere ya agaghi ahụ eziokwu sị na o bụ asị.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Mana, n'atụmatụ ọzọ banyere igbochi nyocha ndị Ụlọ Omeiwu Nta na-eme maka nrụrụaka ha sị na Trump mere, Maazị Romney sị na nke ahụ adabaghị maka ndị Omeiwu Nta emeghị ihe nnile na kwesiri ime maka ya.

Nke a pụtara na mmadụ 47 kwenyere ka achụọ ya n'atụmatu ahụ ebe mmadụ 53 si ka ahapụ ya.

Atụrụ vootu ndị n'usoro pati, dịka ndị Democrat tụru ka Trump puọ ebe ndị Repọblịkan sị ya nọdụ.

Trump nwetere ọchị n'okpuru patị Repọblịkan.

Ntuliaka 2020

Trump na-akwado iso zọọ ọkwa onyeisiala nke ugboro abụọ na ntuliaka a ga-eme n'afọ a.

Otu nta vootu ya kwuru na mmeri a gosiri na Trump ga-eturukwa ugo ọzọ.

Trump n'onwe ya kwuru na ya ga-etinye ọnụ n'okwu ahụ n'ụbọchị Tọzde.

Etu ndị mmadụ si nabata ya

Ụfọdụ ndị mmadụ na soshal midia na-aṅụrị ọṅụ maka mmeri Trump n'ụlọomeiwu ukwu.

Ha kwuru na nke ahụ gosiri na aka onyeisiala ha dị ọcha.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Mana ndị ọzọ kwuru na ya bụ ikpe agazighi nke ọma.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Ndị omekome agbatughị ụgbọelu anyị - Ndị uweojii

Frank Mba

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Frank Mba bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii

Ndị uweojii Naịjirịa sị na ọbụghị eziokwu na ndị omekome gbaturu ụgbọleu Helicopter ha na steeti Kaduna.

Akụkọ malitere ifegharị n'ụbọchị Wenezde na ndị omekome gbaturu ụgbọelu ndị uweojii oge ha gara ibuso ha agha.

Mana Frank Mbah bụ ọnụ na-ekwuru ndi uweojii si na ọ bụ eziokwu na mgbọ tụrụ ya bụ ụgbọelu maka ọ daghị.

Ọ sịkwa na ha gburu ihe ruru ndị omekome narị abụọ na iri ise n'agha ụgbọelu ahu gara.

Tanker agbaala ọkụ na Legọs.

Tanka na-agba ọkụ

Ebe foto si, LASEMA

Nkọwa foto, Ọkụ ahụ egbughi mmadụ maọbụ merụọ mmadụ ahụ

Ndị ọrụ gbatagbata nke Legọs state kwuru na otu ụgbọala bu mmanụ petrol dara ma nwuru okụ na mpaghara Abule Osun na steeti ahụ.

Mana onweghị onye nwụrụ maọbụ merụọ ahụ na ihe mberede ahụ.

Ha kwukwara na ndịọrụ ha na agba mbọ ịgbanyụ ọkụ ahụ ma mepee ụzọ ka ndị mmadụ gafewe.

Ntuziaka maka akara ekwentị

Dr Isa Ali Pantami

Ebe foto si, Twitter/Pantami

Nkọwa foto, Dr Isa Ali Pantami

Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi ekwentị bụ Isah Pantimi enyela ntuziaka ọhụrụ maka akara ekwentị.

O kwuru na tupu mmadụ edenye akara akwantị ya, onye ahụ ga-enwerịrị akara njirimara bụ National Identification Number.

Pantimi kwukwara na otu onye agaghị enwekarị akara ekwentị atọ bụ nke e debanyere n'aha ya.

Ọ gara n'ihu kwuo na a ga-akpọchị akara ekwentị ọbụla nke onye nwe ya jiri mee ihe ọbụla na-adabaghị n'iwu.

Kirk Douglas alaala mmụọ

Kirk Douglas na nwa ya bụ Michael Douglas

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Kirk Douglas na nwa ya bụ Michael Douglas

Onye eji ihe onyoonyoo Hollywood mara bụ Kirk Douglas anwụọla ka ọ gbara afọ otu narị na atọ.

Kirk Douglas bụ nna Michael Douglas onye bụkwa onye a ma ama na Hollywood.

Akwa ọhụrụ ndị 'Super Eagles'

Akwa ọhụrụ ndị ụlọọrụ Nike rụpụtara maka ndị otu egwu bọọlụ 'Super Eagles' nke Naịjirịa na-ekpo ọkụ ebe niile.

Ajụjụ ọtụtụ ndị mmadụ kpụ n'ọnụ ugbu bụ ma ọ ka nke ochie mma.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, "Ịgba egwu Salsa zọrọ ndụ m" - Emeka Adindu