Iran Vs America: Amerịka achọghị ọgụ, anyị chọrọ ọdịnihu Iran- Trump

Trump

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisiala mba Amerika bụ Donald Trump ekwuola na mba Amerịka chọrọ udo dịka o siri gbasa okwu ha na mba Iran.

N'ozi ọ gbasara ụbọchị Wenezde, Trump gwara mba Iran sị: "Ndị Iran na ndị udu ha, anyị anyị chọrọ ka ụnụ nwee ọdịnihu, nnukwu ọdịnihu kwesịrị ụnụ, ọdịnihu ya na ọganihu na otu nkwekọrịta so.

"Mba Amerịka dị njikere ikpe udo."

"Okwu a na-abịa dịka mna Iran zipuru ogbunigwe n'ọnọdụ ndị agha mba Amerịka na mba Iraq."

Okwu a na-abịa dịka mba Iran zigara ogbunigwe n'ebe ndịagha kwara ọnọdụ na mba Iraq.

Ikpeazu, Okowa aghọọla a kwaa a kwụrụ n'oche gọvanọ

Ifeanyi Okowa, Okezie Ikpeazu

Ebe foto si, Ifeanyi Okowa, Okezie Ikpeazu/Facebook

Nke dapụtara n'ehihie Wenezde bụ na ụlọikpe Kachasị na Naijiria enyela Okezie Ikpeazu nke Abia, Ifeanyị Okowa nke Delta mmeri n'ikpe onye meriri ntuliaka ọkwa gọvanọ Abia nakwa Delta e mere n'ọnwa Maach afọ 2019.

Alex Otti nke APGA gbaghara mkpọpụta Inec kpọpụtara Ikpeazu dịka onye meriri na ntuliaka ahụ na traibunal nakwa n'ụlọikpe mkpegharị.

Alex Otti, Okezie Ikpeazu

Ebe foto si, Alex Otti, Okezie Ikpeazu/Facebook,

Mana mkpesa ya kụrụ afọ n'ala nke mere ka o wega ikpe ahụ n'Ụlọikpe Kachasị.

Okowa kwụkwa chị dịka Gọvanọ

Ifeanyi Okowa

Ebe foto si, Ifeanyi Okowa/Facebook

Nkọwa foto, Ifeanyi Okowa bụ gọvanọ nke atọ na-enyocha ọdọ ụgbọelu nke a

Ụlọikpe kachasị nọkwa taa kpebie ka Ifeanyị Okowa nosie ike n'oche ya dịka Gọvanọ Delta steeti.

Great Ogbaru na pati ya bụ APC gbaburu akwụkwọ iji mgbaghaa mmeri Okowa n'ụlọikpe Kachasị.

Gọvanọ Bello nke Niger sokwa

Abubakar Bello

Ebe foto si, Niger State Government

Nkọwa foto, Abubakar Bello

Gọvanọ Niger steeti bụ Abubakar Bello sokwa na ndị isima dịka ụlọikpe Kachasị gwara ya lawa n'ikpe amaghị ya n'ikpe onye meriri n'ọkwa Gọvanọ steeti ya.

Mohammed Nasko nke PDP gbaburu mmeri Bello n'ụlọikpe.

Darius Ishaku nke Taraba Steeti

Darius Ishaku

Ebe foto si, Darius Ishaku- Facebook

Ụlọikpe Kachasị kpebikwara na Gọvanọ Taraba steeti bụ Darius Ishaku kabụkwa onye ji oche Gọvanọ steeti n'ihi dịka ha siri kwuo, APC enweghị onye ha wepụtara ịzọ ọkwa ahụ n'aha pati ha.

Anwuchiela ndị ntọ ise n'Abia

Ndị uweoji Naịjiria

Ebe foto si, Getty/AFP

Nkọwa foto, Ndị uweoji Naịjiria

Aka ndị uweojii agbarala ndị ntọ anọ na otu onye dibia na-agwọrọ ha ọgwụ na Amapụ-Ngwa ebe ha zoro.

Onu na ekwuchitere ndị uweojii n'Abia steeti bụ Geoffery Ogbonna kwuru na a nwụchịrị madụ ise a maka mwakpo ha na-awakpo ndị na-eme njem n'okporo ụzọ sị Umuahia gawa Aba.

Ozu nwatakịrị a hụrụ na 'Air France'

Ọdọ Ugbọelu

Ebe foto si, Press Association

Nkọwa foto, A na-eche na onwere ike ị bụ oyi tugbụrụ nwantakịrị ahụ

A hụtara ozu nwatakịrị gbara afọ iri n'ụgbọelu Airfrance dịka o si Ivory Coast were bia Fransị.

Ndị Airfrance na-akọwa na nwatakịrịa zọfụrụ onwe ya iji ụzọ a were bata obodo Fransị.

Iran Plane Crash: Lee mba ndị kwọpiara n'Ụgbọelu Ukraine dara n'Iran

Iran

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, A na-ekwu onye o nweghị onye pụtara na ndụ na ya bụ ọdachị

Ụlọ nnọchite anya obodo Ukraine dị n'Iran ekwuola na mmadụ otu narị na iri asaa nọ n'ụgbọelu kpọkasiri n'Iran si na mba asaa.

Mmadụ ihe ọdachị a metụtara gụnyere ndị Iran iri asatọ na abụọ(82), ndị Canada iri isii na atọ (63), Ukraine iri na otu(11), ndị Swede iri(10), ndị Britein atọ, Afghan anọ (4), nakwa ndị Germany atọ(3) dịka Praịm

Minista mba ahụ si kwupụta

Ha kwuru na ọ bụ nsogbu engine butere ọdịda ụgbọelu ahụ.

Ụgbọelu

Ebe foto si, Getty Images

Ụgbọelu Ukraine akpọrọ Boeing -737 bu mmadụ narị otu na iri asaa akpọkasiala na mba Iran.

Ụlọrụ Iran Red Cresent kwuru na ha cheghị na ndị mmadụ dị ndụ ga-apụtalị n'ụgbọelu ahụ.

Ụgbọelu ahụ nke ọ bụ Ukraine International Airlines nwe kwọkasiri ka o felichara elu site n'ọdọ ụgbọelu Imam Khomeini Iran nke dị na Tehran dịka ụlọọrụ mgbasaozi 'Fars state news agency' si depụta.

Amabeghị ma ya bụ ọdachị o metụtara esemokwu dị n'etiti mba Iran na US.

Ezigala ndị ọrụ gbata gbata ebe ihe a mere ka ha nye aka.

N'Egwuregwu

Victor Sanchez del Amo

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Victor Sanchez del Amo

Ndị otu egwu bọolụ Malaga nke Spen akwụsịla onye ndụ ha bụ Victor Sanchez del Amo ọru dịka ewepụtara ihe onyonyo gosiri ebe o ji ihe o ji bụrụ nwoke egwuegwu.

Kama Sanchez kwuru sị na nke a bụ nkata iji iyi ya egwu ka a napụta ya ego n'aka.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Aha onyonyo, 'Amụma Fada Mbaka buru maka Hope Uzodinma n'Imo na-eme ihere'