Anambra state: Tank mmiri adagbuola ụmụakwụkwọ abụọ na Nkpọr-agu, Anambra state

Ebe foto si, Haruna Mohammed
Ọdachi dakwasara ụmụaka abụọ si be nne na nna ha gawa akwụkwọ n'ụtụtụ Wenezde ka nnukwu ugbommiri Bekee kpọrọ tank mmiri juru na ya dakwasara n'elu ụlọakwụkwọ ha.
Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Haruna Mohammed si dee, ya bụ arụ mere mgbe o ji nkeji iri na ise gafee elekere iri na otu nke ụtụtụ, na Royal Kings Foundation Nursary and Primary School dị na Nkpor-Agu nke dị n'okpuruọchịchị Idemili Nọt n'Anambara steeti.
Dịka o si kọọ, ya bụ ugbommiri dị galọn 800 si n'ụlọ dịketere ụlọakwụkwọ ahụ dabata n'ime ụlọakwụkwọ were dakwasa n'elu ụlọakwụkwọ ahụ.
Nke a metụtara ụmụakwụkwọ anọ bụ nke ebu gawa ụlọọgwụ Idemili dị na Nkpor, bụ ebe mmadụ abụọ n'ime ha nọ nwụọ.

Ebe foto si, Haruna Mohammed
Mmadụ abụọ ahụ bụ Wisdom Ezewudo gbara afọ atọ nakwa nke nwaanyị gbara afọ abụọ bụ nke amatabeghị aha ha ugbua.
Mmadụ abụọ ndị ọzọ na-erubeghị afọ abụọ na-anabata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ ka ọ dị ugbua.
Ndị uweojii ka na-enyonye anya n'ihe butere ọdachi a.
Ụgbọelu ndị njem akpọkasịala na mba Turkey

Ebe foto si, Getty Images
Otu ụgbọelu bu mmadụ 171 chipuru n'ụzọ ya kpọkaa n'ala n'ọdọụgbọelu dị n'Istanbul, isiobodo mba Tọki.
Ya bụ ụgbọelu kụjara ụzọ atọ ma merụọ mmadụ iri abụọ na otu ahụ.
Enweghị onye nwụrụ na ya bụ ihe mberede mere na mgbede taa bụ ụbọchị ise nke ọnwa Febrụwarị 2020, dịka Minista na-ahụ maka njem bụ Mehmet Cahit Turhan kwuru.
Gọvanọ steeti ahụ bụ Ali Yerlikaya sị na mmadụ 21 ahụ merụrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ.
Ya bụ ụgbọelu ndị njem nke ndị Pegasus Airlines si ọdịda-anyanwụ mba ahụ bụ Izmir bata Istanbul ka oke mmiri na-ezo.
A kpọpụtachara ndị nọ na ya bụ ụgbọelu gụnyere ndị ọrụ ha mmadụ isii, na ndụ.
Ihe nkiri ndị mmadụ na-eke na soshal midia gosiri ọkụ na-agba n'ime ụgbọelu a, mana ndị ọrụ mmenyụ ọkụ bịara menyụọ ya ozugbo.
'Snow' ekpugidela mmadụ 38

Ebe foto si, Reuters
Mmadụ iri atọ na asatọ anwụọla ebe ihe karịrị mmadụ iri ọzọ na-eche ka a gbatara ha ọsọ enyemaka dịka nnukwu snow dara ọzọ ma kpuchite ha n'ugwu dị na mba Tọki.
Ka ọ dị ugbua, ihe ruru mmadụ narị atọ na-agba mbọ inyere ndị mmadụ aka, dịka a na-ekwu na ọnụọgụgụ ndị ihe a gburu nwereike ịrị.
Maka ụmụnwoke 47 a na-ekpe ikpe mmekọrịta
Ụlọikpe dị na Legọs eyigharịkwaala ụbọchị ha ga-ekpe ikpe dimkpa nwoke iri anọ na asaa e boro ebubo mmekọrịta nwoke na nwoke ibe ya n'ezi.
Ọkaikpe nọ n'elu ikpe ahụ kwuru sị na ọ ga-akụpụ ikpe ahụ mgbe ọzọ ha ga-agbakọta ma ọ bụrụ na ndị gbara dimkpa ndị a akwụkwọ akpọtaghị akaebe ga-eme ka ikpe a gaa n'ihu.
Fada Mbaka na-abara Emeka Ihedioha mba
Ụkọchukwu na-elekọta Adọration Mịnịstrị n'Enugwu bụ Fada Ejike Mbaka ewerela olu ike baara gọvanọ Imo steeti pụrụ apụ bụ Emeka Ihedioha mba.
Mbaka gwara Ihedioha ka ọ kpachara anya ya na 'ganị ganị' niile ọ na-akpọ kemgbe a chụpụrụ ya n'oche, ma ọ bụrụ na ọ chọghị iga ụlọ mkpọrọ.
Gụọ ihe o kwuru n'uju ebe a: "Ihedioha kwado ịga mkpọrọ" - Fada Mbaka
Ighalo na Manchester United
Odion Ighalo gbabuuru Naịjirịa bọọlụ akọwaala ihe mere o ji kwere isi Shanghai Shenhua dị na Chaịna bịa ịgbara Manchester United bọolụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
Ighalo kwuru na ọ bụ maka etu o si anụ ya ọkụ n'obi mere o ji kwere ka Man Utd ghara ikwuzu ya ụgwọ, ma ya bụrụ na ọ gbaara ha bọọlụ.
Amalitela ịna 7.5% VAT maka oku na ozi ekwentị

Ebe foto si, Getty Images
Ọnụahịa ịkpọ oku nakwa izikọrịta ozi n'ekwentị agbagoola.
Nke a bụ maka na ụlọọrụ ekwentị amalitela ịna ụtụisi VAT pasentị asaa na ụma ise maka oku ọbụla ha kpọrọ nakwa ozi ọbụla ha ji ekwentị zipu.
BBC Igbo chọpụtara nke a n'ụbọchị Wenezde mgbe ya bụ ihe malitere iwu na soshal midia Twitter.
Ọtụtụ ndị mmadụ gbarụrụ ihu maka ya bụ ihe, na-ekwu na nke a gosiri n'ihe na-esiwanye ike na Naịjirịa.
Iji maa atụ, ozi 'sms' a na anabu naịra anọ bụzị naịra anọ na kobo iri ugbua n'ihi VAT.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Cheta na onyeisiala Buhari binyere aka n'iwu a kpọrọ 'Finance Act' n'ọnwa Janụwarị.
Iwu ahụ kwuru na a ga-ebuli ụtụisi 'value added tax' (VAT) site na pasentị ise ruo pasentị asaa na ụma ise.
Iwu ahụ malitere n'uju n'abalị mbụ nke ọnwa Febrụwarị a.
Anambra steeti enweela ụlọikpe mkpegharị

Ebe foto si, Anambra Broadcasting Service
Gọvanọ Willie Obiano nke Anambara steeti emgheela ụlọikpe mkpesa ọhụrụ n'ọka.
Nke a bụ nke mbụ Anambra steeti ga-enwe ụlọikpe mkpesa kamgbe afọ iri abụọ na itoolu e kewara steeti ahụ na Enugu.
Obiano kwuru na ihe kpatara ọchịchị ya ji malite ịrụ ya bụ ụlọikpe mkpegharị bụ iji belata oke mgbagharị ndị ọkaiwu steeti ahụ na-agbagharị n'okporo ụzọ.
O kwuru na ọ bụ n'Enugwu ka a na-ebuga ikpe niile si Anambra steeti maka mkpegharị.
Na Lesotho

Ebe foto si, AFP
Taa ka a ga-amalite ikpe nwunye praịm mịnịsta mba Lesotho bụ Maesaiah Thabane ikpe maka ebubo igbu nwunye di ya.
Ndị uweojii Lesotho na-enyokwa praịm mịnịsta ahụ enyo maka ọnwụ nwunye ya nke mbụ bụ onye ya na ya na-esebu okwu.
Maesaiah gbaburu ọsọ gbaga mba Saụt Afrịka nke mere ka ndị uweojii Lesotho wepụta aha ya dịka ọnye a na-achọ achọ.
Mana a nwụchiri ya ụbọchị Tuzde oge ọ gara kpee onwe ya n'aka ndị uwe ojii.
Otooto C Ronaldo
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ụwa niile kpụ Cristiano Ronaldo n'ọnụ ugbua dịka ọ na-eme emume ncheta afọ iri atọ na ise ya.
Ọtụtụ na-ajụ mmụọ na-akụrụ Ronaldo egwu nke o ji akpa ike niile ọ na-akpa n'egwuregwu bọọlụ.
Onye bọọlụ ọzọkwa na-eme ncheta ọmụmụ ya n'ụbọchị Wenezde bụ Neymar nke mba Brazil.
Trump na Pelosi

Ebe foto si, Reuters
Obi akpọ dị n'etiti onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na onyeisi ụlọomeiwu nta bụ Nancy Pelosi dịka ọ na-akawanye njọ.
Ha abụọ gosiri ụwa niile n'ụbọchị Tuzde na ha esighi otu ụzọ aga.
Trump gara ụlọomeiwu ịgwa ndị Amerịka okwu nke a kpọrọ 'State of the Union, mana ọ jụrụ ikwe Pelosi n'aka.
Pelosi n'onwe ya dọriri akwụkwọ okwu Trump nke e nyere ya.
O kwuru na onweghi otu mpụrụ eziokwu ọ hụrụ n'ime ya.

Ebe foto si, Reuters
N'okwu ya, Trump kwuru na ọchịchị ya emeela ka Amerịka nwee ugwu ọzọ.
O kwuru na ihe ruru nde mmadụ asaa nwetara ọrụ kamgbe ya banyere n'ọchịchị.
Oge Trump na-ekwu okwu, ndị otu pati ya bụ 'Republican' nọ n'etu ya aha, ma na-ekwu na ọ ga-achị afọ anọ ọzọ.
NLC adọọla gọọmentị etiti aka na ntị

Ebe foto si, Getty Images
Otu jikọrọ ndịọrụ na Naịjirịa bụ 'Nigeria Labour Congress' adọọla gọọmentị etiti aka na ntị ka ha ghara ịkpatụ ego e ji akwụ ndị lara ezumike nka ụgwọ aka.
Onyeisi otu a bụ Ayuba Wabba kwuru nke a n'ụbọchị Tuzde n'ihi kepukepu a na-anụ na gọọmentị etiti chọrọ igbaziri tarị Naịra abụọ n'ime ego 'pension'.
Ayuba kwuru na anya NLC dị n'ego 'Pension' ahụ maka na ọ bụ ọbara na ọsụsọ ndị ọrụ.
O kwuru na gọọmentị ka ji ndịọrụ lara ezumike ụgwọ ruru narị ijeri naịra anọ (N400 billion).
'Customs' anwụchiela nde dọla asatọ

Ebe foto si, Channels TV
Ngalaba na-ahụ maka mbubata na mbupu ngwaahịa na Naịjirịa bụ 'Customs' ekwuola na ha jichiri nde dọla asatọ na ụma bụ nke ndị omekome chọrọ iji ụzọ aghụghọ bupu na Naịjirịa.
Onyeisi Custom bụ Hameed Ali gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụ n'ọnwa Janụwarị ka ya bụ ihe mere.
Ali kwukwara na ha nwụchiri mmadụ abụọ na-arụ ọrụ n'ọdọụgbọelu dị na Legọs n'ihi ya bụ okwu.
Ọ kọwara na ọ bụ ndị ekperima, ndị na-ebu ọgwụike maọbụ ndị nrụrụ aka na-achọkarị ụzọ ibupu ego n'ụzọ di otu ahụ.
Ali dọrọ aka na ntị ka onye ọbụla na-eme njem ịpụ na Naịjirịa gbaa mbọ hụ na ọ gwara ndị ọrụ nchekwa ma ọ bụrụ na o ji ihe karịrị puku dọla iri n'akpa ya.
Ụmụaka Liverpool enwetala mmeri

Ebe foto si, Reuters
Otu egwuregwu bọọlụ Liverpool agafeela n'agba nke ise nke FA cup oge ha ji otu ọkpụ goolu merie Shrewsbury Town n'abalị Tuzde.
Mmeri a tụrụ ndị mmadụ n'anya n'ihi na Liverpool ji naanị ụmụaka wee gbaa ya bụ bọọlụ maka na ndị nnukwu nọ ezumike.
Ro-Shaun Williams nke Shrewsbury nyere onwe ha goolu na ya bụ asọmpi.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:












