Pati nọ na Naịjiria ga-abụzị naanị 18 - Inec

Onyeisi Inec

Ebe foto si, Inec/Twitter

Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ nke Bekee kpọrọ Independent National Electoral Commission (Inec) ewetuola ọnụọgụgụ otu pati nọ na Naịjirịa site n'iri itoolu na abụọ ruo iri na asatọ.

Onye kwuru nke a bụ onyeisi Inec bụ Mahmood Yakubu n'Abuja taa bụ ụbọchị isii nke ọnwa Febrụwarị, 2020.

N'ọgbakọ ha nwere n'Abuja taa, Inec kwuputara ka ihe siri kwụrụ n'ọnọdụ otu pati ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa ya na ka ụbọchị ntuliaka ndị gọvanọ na-abịa ga-esi gaa n'Edo na Ondo steeti.

Okwu ha metụtakwara ndọrọndọrọ ọchịchị ndị nke fọrọ na steeti dị icheiche akpọrọ "by-election' na Bekee.

Dịka ọrụ nchịkọta pati ndọrọndọro ọchịchị si dị n'aka Inec, ha kwuru na ọ bụ pati iri itoolu na abụọ (92) bụ ihe dị n'akwụkwọ ha mgbe e mere ndọrọndọro nke 2019.

Onyeisi Inec kwukwara na akwụkwọ iwu nyekwara ha ikike iwepụ pati ọbụla ụkwụ esighi ike n'ala, dịka;

Pati na-ewetezughị ihe a chọrọ mgbe ha debara aha n'akwụkwọ.

Pati na-enwetezughị ihe ruru vootu ruru pasentị 25 mgbe e mere ntuliaka onyeisiala na steeti ọbụla.

Pati enweteghị mmeri n'otu wọọdụ mgbe e mere ntuliaka onyeisioche okpuru ọchịchị.

Pati na-enweteghị otu oche n'ọgbakọ ụlọomeiwu maọbụ nke nnọchiteanya imeobodo.

Ihe ndị a ka Inec lebachara anya wee kpochapụ pati 92 ahụ hapụzịa naanị 18 dịka ndị ụkwụ siri ike n'ala.

Pati ndị a hapụrụ gụnyere:

  • Accord Party (AP)
  • Action Alliance (AA)
  • African Action Congress (AAC)
  • African Democratic Congress (ADC)
  • African Democratic Party (ADP)
  • All Progressives Congress (APC)
  • All Progressives Grand Alliance (APGA)
  • Allied People's Movement (APM)
  • Labour Party (LP)
  • New Nigeria People's Party (NNPP)
  • National Rescue Movement (NRM)
  • Peoples Democratic Party (PDP)
  • Peoples Redemption Party (PRP)
  • Social Democratic Party (SDP)
  • Young Progressive party (YPP)
  • Zenith Labour Party (ZLP)

Booty Party (BP) na Action People's Party (APP) ka nwere ihe ọ fọrọ tupu ha etozuo oke wee banye n'ọnụọgụgụ.

Nke a pụtara na pati dị iri asaa na anọ (74) esoghizi n'ọnụọgụgụ na Naịjirịa.

Ọzọ, Inec mere ka ndị mmadụ mata na ntuliaka nke gọvanọ n'Edo steeti ga-abụ na Satọde, ụbọchị nke iri na itoolu nke ọnwa Septemba (19/09/2020), ebe nke Ondo ga-abụ na Satọde ụbọchị iri nke ọnwa Ọ‘ktoba afọ 2020(10/10/2020).

Usoro ntuliaka ndị a dị n'akara soshal midia ha.

Yakubu jikwa ọnọdụ ahụ dọọ aka na ntị maka ndị na-ebute ọgbaaghara na ntuliaka ọbụla ka ha kpachara anya ha.

Akụkọ ga-amasị gị