Inec: Nsogbu dị na mkpọghachị onye omeiwu

Ebe foto si, Getty Images
Site na ihe ọgbaghara dị na mkpọghachị achọrọ ime Sịnetọ Dino Melaye na ọdịda ya, Inec ekwupụtala nsogbu dị n'usoro mkpọghachị ndị umeiwu.
Mgbe BBC Igbo gbara Kọmishịọna ndị Inec nke Enugwu Steeti bụ Emeka Ononamadu ajụjụ ọnụ banyere nke a, o kwuru na usoro mkpọghachị ndị omeiwu gụnyere;
Ndị a ana-achị bụ ndị ga-eru pesentị iri ise na ọma n'ime ndị mere ntuliaka ga-enwe mkpebi na ha chọrọ ịkpọghachị onye omeiwu.
Ha ga-abịa n'ụlọọrụ Inec were akwụkwọ mkpesa bụ ebe ha ga-edeba aha na akara odide ha.

Ebe foto si, AFP
Inec ga-enyocha akwụkwọ mkpesa ahụ, aha ha nakwa akara odide ha ma hiwe ụbọchị a ga-eme ntuliaka mkpọghachị onye ahụ bụ 'Referendum'.
Ọ bụrụ na ndị kwere karịa ndị na-ekweghị, Inec ga-anata onye ahụ Asambodo ọchịchị bụ ' Certificate of Return'.
Inec ga-ahazị ụbọchị ọhụrụ maka ntuliaka onye ga-anọchị anya omeiwu ahụ.
Ononamadu kwuru na ọ bụ ndị omeiwu hiwere usoro a nke mere na ọdịghị mfe ịkpọghachị onye omeiwu n'ọchịchị.
O kwukwara na ọ na-efu ọtụtụ oge nakwa ego iji nyocha ma mee ntuliaka iji kpọghachị onye omeiwu.
Ononamadu kwuru na ọ bụ ma ọtụtụ ndị mmadụ chịkọtara aka ọnụ kwuo na ha chọrọ ịkpọghachị onye ahụ, ga-eme ka o kwee omume.
Gere ihe Emeka Ononamadu kwuru ebe a:









