Inec: Ebe ndị ahụ e dere na website abụghị ebe ndebanye aha

Continuous Voters Registration Jan 24,2017

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ọtụtụ mmadụ amaghị na ndebanye aha ntuliaka ga-emechi na ngwụcha Jenụwarị afọ 2018

Otu onye bi n'Abuja bụ Onyinyechi Emeruwa-Okechukwu kwuru na Fesbuk (Facebook) sị: "Agara m ebe a na-edebanye aha n'akụkụ ebe m bi na Gwaripa, Abuja.

Anyị ahụghị ndị Inec ọbụla. Ndị ụlọ akwụkwọ gwara anyị na ọ bụ sọ n'elu igwe okwu radio ka ha nụrụ ya na ha ahụbeghị onye ọrụ Inec ọbụla."

Mgbe onye ntaakụkọ BBC gara na Community Grammar School, Igando dị na Legọs, onweghị onye ọrụ Inec ọ hụrụ.

A A Lawani, onye ọrụ ndị otu ọkaudo a na-akpọ Nigeria Security and Civil Defence Corp na bekee, gwara BBC Igbo na ndị Inec anọghị ọrụ ebe ahụ.

O kwukwar: "Ọtụtụ ndị mmadụ na-abia ebe kemgbe izu ụka gara aga mana anyị ahụbeighị onye ọrụ Inec ọbụla."

Ọtu akụkọ bụkwa ihe mere na ...Falomo, Ikoyi ebe onye ntaakụkọ BBC gara.

ỌsịsaInec nyere

Onye Kọmishọna Inec bụ Obo Effanga, kọwara na ndebanye aha na-aga n'Inec nke dị n'isi ụlọ ọrụ gọọment ime obodo(Inec Local Government offices) na ọ bụghị n' ebe ndị edepụtara na websait Inec.

Effanga sịrị, "Ebe ndị ahụ e dere na website bụ ebe ntụliaka, ọbụghị ebe ndebanye aha. Ndebanye aha na-aga n'ihu n' ụlọ-ọrụ Inec dị n' isi ụlọ ọrụ gọọment ime obodo(Local Government Areas)"

O kwuru ka ndị mmadụ gawa n' isi ụlọ ọrụ gọọment ime obodo dị ha nso. Ọ gara n'ihu kwuo na ndị ọrụ Inec na agagharikwa n'ime ime obodo.

Ndị mmadụ karịrị ndị ọrụ Inec

Mana na St Greory Primary School, Falọmo, ndebanye aha na-aga n'ihu. Ndị mmadụ pụtakwara na igwe idebanye aha. Mana ọtụtụ na-atụ arịrị na ha eeguọla oge karia.

Continuous Voters Registration Jan 24, 2017
Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị mmadụ amaghị na idebanye aha na aga-nihu

Otu onye achọghị ịkpọ aha ya kwuru na ọ biara kemgbe otu izu, ma o nwebeghị ike ideba aha n'ihi ọtụtụ ndị mmadụ pụtara idenye aha ha.

Ụfọdụ kwụrụ na-aha mara ụzọ pụta kemgbe eleker isii nke ụtụtụ mana n' oge ehihie mgbe BBC bịara, azabeghị ha.

Onye ọrụ Inec nọ ọrụ ebe ahụ kwuru sị: "Ọtụtụ ndị mmadụ pụtara idebanye aha. Anyị enweghị ike ị na- aza onye ọbụla otu mgbe."