Donald Trump: Ihe mere Trump ji ewusi ike na Naịjirịa

Donald Trump

Ebe foto si, Reuters

    • Onye dere ya, Chiagozie Nwonwu
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Na nyocha ngalaba "Pew Research Center" (PRC) mere nke BBC jiri dee akụkọ n'ọnwa Jenụwarị 2020, Naịjirịa pụtara dịka nke anọ n'ime mba ndị kachasị hụ Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump n'anya.

Ịhụnanya a, n'agbanyeghị na ọ na-agbagwoju ọtụtụ mmadụ anya, pụtakwara n'ihe dịka atụmatụ ichutu Trump na-enwu ọku n'Amerịka.

Ka Trump mechara nweta mkpebi ọ ga-eji wee ka nọrọ n'ọkwa dịka onyeisiala Amerịka, ndị mmadụ na Naịjirịa pụtakwara n'igwe na-enwe aṅụrị maka ya.

Alexander Otti, otu onye a ma dịka onye na-akwado Trump ọfụma na Facebook sị na mmeri Trump bụ mmeri banyere ndị ọ kpọrọ "Swamp".

Okwu Otti bụ ihe ọtụtụ mmadụ, ọkachasị ndị si ọwụwa anyanwụ Naịjirịa na-ekwu.

Tchidi Chimezim sọkwa n'otu aka ahụ enwe aṅụrị maka mmeri Trump meriri.

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Ọnụ okwu bụ ihe anaghị achọ achọ na soshal midia nke Naịjirịa; maọbụ na Twitter, Facebook na WhatsApp.

Mana, ajụjụ so ya wee bụrụ, ọ ginị mere o jiri dị etu a? Ọkachasi ma e tinye anya n'etu ọtụtụ ndị mmadụ na-ede ma na-ekwu na Trump bụ onye na-akpa oke agbụrụ nke ukwu.

'Trump bụ onye ụka'

Trump na ndị isi ụka

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọtụtụ ndi isi ụka na Amerịka na-akwado Trump

Ide Ben Bennet Udeogu, bụ onye ihe Trump na-amasị nke ukwu bi n'Ugwu Awụsa gwara BBC Igbo na ihe mere ndị si Ọwụwa Anyanwụ ji na-akwado Trump abughị ihe kwesịrị ị na-agbagwoju ndị mmadụ anya.

Ide Udeogu sị: "Ọtụtụ ndị agbụrụ anyị bụ ndị na-eso ofufe Kraịst. Trump na onwe ya bụ onye na-ekwu na ọ ga na-agba mbọ ịhụ maka ọdịmma ndị ofufe Kraịst."

Ọ gakwara n'ihu kwuo na Trump egosila na ọ ga-emezu nkwa o kwere.

Akara ntụ-ntụ
Trump vs other world leaders graphic

Ebe foto si, AFP

Akara ntụ-ntụ

"Leenu etu Trump siri gwa Onyeisiala Muhammadu Buhari oge ọ gara njem n'Amerịka na ya agaghi anọ hụ na emekpara ndị ofufe Kraịst ahụ na Naịjirịa."

Ide Udeogu, n'ịsa ajụjụ maka mmachi Trump machiri ndị Naịjirịa ịbata Amerịka ịbịa obibi, sị na ọ bụghị Trump ka nke a dị n'aka.

"Ọ bụ ọnọdụ Naịjirịa nọ butere atụmatụ ahụ."

Mana onye ọzọ bụ nwaafọ Naịjirịa bi na Nọt Karolịna dị n'Amerịka bụ Kommanda Ezu ekweghi na Trump bụ onye ụka.

Ọmasịghi ụfọdụ ndị na-akwado Trump na Naịjirịa oge o zutere Onyeisiala Buhari n'Amerịka

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ọ masịghi ụfọdụ ndị na-akwado Trump na Naịjirịa oge o zutere Onyeisiala Buhari n'Amerịka

"I nnyochaa etu ndị uka si akpa agwa, ị hụ na Trump abụghịdị ya ma ncha."

N'agbanyeghi nke a, ọ sị na ọ ga-amalite ikwado Trump.

"Ọ bụ Hillary Clinton ka m tụnyeere vootu n'afọ 2016. Mana ugbua, ọ bụ Trump ka m ga-atụnyere."

Maazị Ezu sị na ihe kpatara nke a bụ na Trump na-emezu ihe o kwuru.

"Ihe niile Trump kwuru na ọ ga-eme tupu ọ rigoo n'ọkwa ka ọ na-eme ugbua."

Maazị Ezu sịkwa na n'agbanyeghi na o kwenyere na Trump so na-akpata oke agbụrụ n'Amerịka, ọ ga-atụrụ ya maka na "o nweghi onye ga-emerinwu ya n'ogige ndị Demokrat".

Maka mmachi ndị Naịjirịa, ọ sị na ndị ọ dị n'aka bụ ndị na-achị Naịjirịa.

"Ọ bụ Naịjirịa ka Trump sị ndị Naịjirịa ghara ịbata? Ọ kwa Amerịka? Ọ bụrụ na Naịjirịa dị mma, dị mmadụ a ga-achọ ịkwaga Amerịka?"

'Trump kwenyere na Biafra'

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ihe ọzọ na-eme ka ọtụtụ ndị ọwụwa anyanwụ jiri na-akwado Trump bụ okwu Biafra.

Ndị na-akwado Biafra na-apụtakarị na soshal midia etinye foto Trump maọbụ ihe onyonyo ya.

Oge Trump meriri na 2016, ndị na-akwado Trump mekwara ngagharị ọṅụ na Pọt Hakọt.

Ide Udeogu rụtụkwara aka na nke a mgbe o kwuru maka njem onyeisi otu na-acho Biafra bụ Nnamdi Kanu gara n'Amerịka.

"Trump kwenyere n'ihe ndị na-achọ Biafra na-eme. Ọ bu ihe mere o jiri kpọọ Nnamdị Kanu ka ọ bịa ebe ọ na-achụ nta vootu ka ọ hụ etu ihe si aga."

Nke bụ eziokwu bụ na ndị mmadu ka ga na-akwado Trump na mpaghara a, n'agbanyeghi na o nweghi ihe ọbụla gosiri na Trump ma maka ha maọbụ kwenyere na ha.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị: