Nigerian Political Parties: INEC e nwere ikike imechi otu ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa?

Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ ndị mmadụ kpụ ngalaba na-ahazi ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (INEC) n'ọnụ maka ịkachapụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị icheiche n'akwụkwọ ha.
Ọ bụ n'ọgbakọ ha nwere n'ụbọchị Tọzde ka onyeisi INEC bụ Mahmood Yakubu nọrọ kwupụta na Pati nọ na Naịjiria ga-abụzị naanị 18.
Mana nke a edochaghị ndị mmadụ anya nke mere ọtụtụ ji ajụ ma INEC e nwere ikike ịkachapụ aha pati ọbụla.
Na oge mbụ, iwu obodo Naịjirịa enyeghị INEC ikike ịkachapụ aha pati ọbụla.
Mana n'ọnwa Julaị nke afọ 2017, ndị ụlọomeiwu ukwu megharịrị iwu Naịjirịa nke ugboro anọ nke bekee kpọrọ 'fourth alteration'.
N'ebe ahụ ka ha nyere INEC ikike ịkagbu otu ndọrọndọrọ ọchịchị ndị na-emezughi ihe dị iche iwu kwuru.
Gịnị ka iwu kwuru?
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Iwu ahụ kwuru na INEC nwere ike ịkachapụ aha pati ọbụla:
- dara iwu e nyere ha tupu edebenaye aha ha
- na-emerighi ọbụladị pasentị 25 nke vootu niile a tụrụ n'otu steeti na ntuliaka ọkwa onyeisiala
- na-emerighi ọbụladị pasentị 25 nke vootu niile a tụrụ n'otu okpuru ọchịchị na ntuliaka ọkwa gọvanọ
- na-emerighi ọbụladị otu 'ward' na ntuliaka onyeisioche okpuru ọchịchị
- na-emerighi ọbụladị otu oche n'ụlọomeiwu nke steeti maọbụ nke etiti
- na-emerighi ọbụladị otu oche 'councillor' n'otu okpuru ọchịchị.
Ọ bụkwa ihe ndị a ka INEC kwuru mere ha ji kachapụ aha pati 74 ahụ.
Otu n'ime pati ndị ahụ bụ Action Peoples Party (APP) agaala ụlọikpe iji gbochie nkachapụ aha ha.
Gịnị ka pati ndị a kachapụrụ na-ekwu?

Ebe foto si, Facebook/Tope Fasua
Tope Fasua, onyeisi pati 'Abundant Nigeria Renewal Party' (ANRP) kwuru na ihe INEC mere adabaghị adaba.
Fasua sokwa zọọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka gara aga.
O kwuru na INEC kpọrọ ha n'ọnwa Dịsemba 2019 ka ha gosi ihe niile gosiri na pati ha zuru oke.
"Anyị gosiri ndị isioche anyị na steeti dị icheiche, gosi akwụkwọ ọbaego anyị, gosi akwụkwọ ndị otu anyị, gosi akwụkwọ anyị ji kwụọ ụgwọ ụlọọrụ anyị, gosi ihe niile."
"Obi tọrọ anyị ụtọ makana anyị chere na anyị etozuola oke dịka iwu INEC si dị."
Fasua kwuru na ha ga-aga ụlọikpe ịgbagha ihe ahụ INEC mere.

Ebe foto si, Facebook/Chekwas Okorie
N'aka nke ọzọ, Chekwas Okorie, onyisi otu United Progressive Party (UPP) gwara ndị ntaakụkọ Punch na ha ahụbeghị akwụkwọ ndị INEC iji gosi na a kachapụla aha pati ha.
O kwuru na ha ga-ama ihe ha ga eme ma ha nweta ozi ndị INEC nke ọma.
Ka ọ kwụ ugbua, ọtụtụ patị ndị a ekwuola na ha ga-agba Inec akwụkwọ n'ụlọikpe maka atụmatụ a.









