Lee ihe ndị na-akpatara gị afọ mgbu, na ihe ị ga-eme maka ya

- Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Ọtụtụ mgbe ka afọ mgbu dulara ndị mmadụ mmụọ n'ihi na ha chere na ọ bụ naanị "nwa ntakịrị afọ mgbu".
Mana ndị ọkachamara ekwuola na afọ mgbu nwere ike ịbụ ihe nrụtụ aka maka nnukwu ọrịa dị n'ahụ mmadụ nke e kwesịrị inyocha ma gwọọ kpamkpam ka onye ahụ nwere onwe ya.
Dọkịta Anigbamkpu Obinnaadigo kọwaara BBC ihe o ji dị mkpa ka onye nwere afọ mgbu gbakarịa nkịta ụsa n'ọsọ gaa ụlọọgwụ:
Apendicitis

Ebe foto si, Getty Images
Ihe mbụ na-egosi ọrịa 'appendicitis' bụ na otubo ga-amalite ịfụ onye ahụ ụfụ.
Ụfụ a ga-emechaa gbadata n'akụkụ aka nri afọ onye ahụ.
Oge ụfọdụ, onye ahụ ga-enwe ahụ ọkụ, maọbụ ịnyụ anyụ, maọbụ ịgbọ agbọ.
Ọ bụrụ na ọ gaghị ụlọọgwụ n'oge, ya bụ 'appendix' nwere ike gbawaa n'ime afọ mmadụ.
Nke a mee, ọ ga-eme ka abụ jupụta n'ime afọ, oge ahụ ka afọ niile ga-amalite ịfụ onye ahụ ụfụ.
Mana ọ bụrụ nwaanyị, njirimara orịa 'ovarian cyst' yitere njirimara 'appendicitis'.
Ya kpatara ime nnyocha n'oge ji dị mkpa.
Ọnya afọ (Gastric Ulcer)

Ebe foto si, Getty Images
Dkt Anigbamkpu kwuru na ọnya afọ na-emetụtakarị akụkụ ahụ dị n'etiti obi na afọ mmadụ.
Bekee na-akpọ akụkụ ahụ a 'epigastric region'.
Ihe na-akpata ọnya afọ bụ "mmiri 'acid' nke na-esi n'afọ apụta iji nye aka gbarie nri mmadụ riri".
Anigbamkpu kwuru sị: "Mgbu ọnya afọ na-adị ka ịcha ọkụ maọbụ ebe awụnyere ose n'ime ọnya."
Ihe na-eme o ji aka njọ gụnyere nri ose, ihe e ghere eghe, erighị nri n'oge, dịrị gawazie.
Naanị ndị ọkachamara n'okwu ahụike ga-ekwu ihe ga-enyere onye nwere ọrịa a aka.
Ọrịa Okwute Akịrị (Kidney Stone)

Ebe foto si, Getty Images
Dịka Dkt Anigbamkp si kwuo, ụfụ 'kidney stone' na-afụru na mkpụrụobi.
"Na mgbadata ngụgụ afọ nke aka nrị maọbụ nke aka ekpe ka ụfụ 'kidney stone' kacha emetụ".
"Mana ụfụ a ga-emecha dajụụọ, ọ nọkata, ọ bịakwa ọzọ."
Anịgbamkpu kwuru na 'kidney stone' abụghị ọrịa a na-ahụ kwadaa, mana ọ bụrụ na i nwee ụdị ụfụ a na-akụkụ afọ gị, biko gaa mee nnyocha.
Nsọ nwaanyị

Ebe foto si, Getty Images
Ụfọdụ ụmụnwaanyị na-enwekarị afọ mgbu ma ha nọrọ na nsọ.
Onweghị ihe ọbụla ndị ọkacha mara chọpụtara na-akpata nke a.
Ọ bụ etu chi si kee onye. Mana afọ mgbu a na-akwụsị ma nsọ nwaanyị dị otu a gafechaa.
Ihe gbasara afọ ime

Ebe foto si, Getty Images
Dkt Anigbamkpu kwuru na afọ ime ekwesịghị igbu nwaanyị mgbu.
Mana nke a nwere ike ime ma ọ bụrụ na ihe niile amachaghị kwụrụ.
O kwuru sị: "Ọ bụrụ na nwa anọghị n'ime akpanwa dịka o kwesịrị, ọ ga na-egbu nwaanyị mgbu."
Nke a ka a na-akpọ 'ectopic pregnancy' na Bekee.
Ọzọkwa bụ ma nwaanyị dị ime nwee ọrịa aji-enyi maọbụ ogbeke maọbụ akpụ ime afọ nke Bekee kpọrọ 'Fibroid', o nwere ike ibute afọ ịfụ ịfụ.
Ndị ọzọ

Ebe foto si, Chiagozie Nwonwu
Agụụ bụ otu ihe kacha ebute afọ mgbu. Ya mere, tupu ị chọwa ọgwụ afọ mgbu, irikwaala nri?
Ọzọkwa bụ ajọ mmiri ọṅụṅụ nwere ike ime ka nje baa mmadụ n'afọ.
Bekee na-akpọ ya 'parasites', mana ọtụtụ ndị mmadụ na-akpọkarị ya 'worm'.
Nje ndị a na-akpata ọrịa dị icheiche nke afọ mgbu bụ otu n'ime ha.
Mana buru ụzọ gaa ụlọọgwụ ka e mee gị nnyocha ma gwa gị ọgwụ ị ga-aṅụ iji nweta onwe gị.
Dkt Anigbamkpu kwukwara na ọ dịghị njọ mmadụ ịṅụ ọgwụ 'worm' ihe dịka ọnwa isii ọbụla, ma ọ bụrụ na onye ahụ bi n'okirikiri ebe mmiri ọṅụṅụ adịghị ọcha.
Ihe nkiri ga-amasị gị:



































