Chadwick Boseman: Cancer egbuola onye mere ejije Black Panther

Chadwick Boseman

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Boseman ekwubula maka ọrịa kansa
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ezinaụlọ ome ejije si mba Amerịka aha ya bụ Chadwick Boseman ekwuola na ọ nwụọla site n'ọrịa cancer.

Maazị Boseman dị afọ 43 tupu ọ laa mụọ.

Ọ bụ otu n'ime ejije Black Panther o mere ka e ji mara Maazị Boseman karịa.

Nwamadị a ekwughi maka ihe ọ na-agabiga n'ezi tupu ọnwụ ezute ya.

Ezinaụlọ Boseman sị: "Ezigbote onye agha, Chadwick diri ihe niile, ma wetere unu ihe ejiji unu bịara hụ n'anya ọfụma."

Ha kọwara na Boseman mere ejije dị ka "rom Marshall, Da 5 Bloods, August Wilson's Ma Rainey's Black Bottom" na ndị ọzọ ka ọ na-anata ọgwụgwọ banyere cancer a.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Boseman bu ụzọ sepute isi mgbe o mere ejije a kpọrọ 42 n'afọ 2013 nakwa ejije a kpọrọ Get on Up n'afọ 2014, mana ọ bụ Black Panther ka a ga-eji cheta ya karịa.

Kedụ ụdị Kansa gburu nwa amadị a?

Ọrịa gburu Boseman bụ nke Bekee na-akpọ, bụ nke gunyere kansa niile na-eme n'ime eriri afọ.

Aha a na-akpọ ọrịa na-esi ebe ọ na-eme mmadụ. Bkee na-akpọ ụfọdụ "bowel cancer" nakwa "rectal cancer" nke na-egosi ebe ọ na-eme onye ahụ.

Ọ bụ "bowel cancer" ka a kacha afụ na mba Briten.

Ọkankụ ndị a na-ahụ ọrịa n'ahụ agageela afọ 60. Lee akụkọ na-ekwu maka ọtụtụ ọrịa na-emekarị ụmụ nwoke: Ọrịa isii kacha emetụ ụmụnwoke karịa ụmụnwaanyị