Headache Symptoms: Ị ma na isi na-awa gị nwere ihe ọ na-atụ aka?

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Jessica Nwankwo
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, BBC Igbo, Lagos
Mgbakasị ahụ bụ ihe ọtụtụ mmadụ na-agabiga kwa ụbọchị ọ kachasị ndị okenye.
Nke a na-ebutekarị ike ọgwụgwụ, isi ọwụwa maọbụ ahụ ọkụ n'ahụ ndị mmadụ.
Mana ọ bụghị isi ọwụwa ọbụla ka ekwesiri ịṅụrụ "Paracetamol" dịka dọkịta Zubair Abdullahi gwara BBC Igbo.
Ọ kọwara na isi ọwụwa dị n'ụdị abụọ nke bụ: isi ọwụwa pramarị na isi ọwụwa sekọndrị.
Ihe dị iche n'isi ọwụwa abụọ ndị a

Ebe foto si, Getty Images
Isi ọwụwa pramarị
Anaghị amacha ama ihe na-ebute ụdịrị isi ọwụwa a.
Ọ bụ ebe a ka pasentị iri itoolu n'isi ọwụwa niile na-awa mmadụ banyere.
Ọ dịkwa ụzọ anọ nke Bekee kpọrọ:
- Isi ọwụwa 'Tension'
- Isi ọwụwa Cluster
- Isi ọwụwa Migraine

Ebe foto si, Getty Images
Isi ọwụwa sekọndrị
Nke a na-esikarị n'ihe dị ka arahụghị ụra ọfụma nakwa aṅụghị mmiri ọfụma.
O kwukwara na ọrịa mkpọnwụ ahụ ma ọrịa ọbara mgbali elu nwereike ị butekwa isi ọwụwa nke a.
O kpuchiri sọsọ pasentị iri n'isi ọwụwa niile na-awa mmadụ.
Ọrịa ndị a nwereike ịgosipụta dịka isi ọwụwa:
- Maleria
- Tyfọd
- Glaucoma (ọrịa mkpụrụ anya)
- Meningitis
- Encephalitis
- Ọrịa ụbụrụ
- Azụzụ.
Ihe ị ga-eme i gbochi maọbụ kwụsị isi ọwụwa

Ebe foto si, Getty Images
Dọkịta Abdullahi kwuru na ọ dị mma iri nri ga-enye ihe ọma n'ahụ dịka akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi na mmiri ọṅụṅụ.
O kwukwara na ezumike na ihi ụra ọfụma dị oke mkpa iji hụ na isi ọwụwa na ihe mmekpa ahụ belatara.
Ọ sị "Ọ bụrụ na ị na-enwekarị isi ọwụwa ọ ga-abara gị uru ma ị detuo mgbe o ji eme gị na oge o ji aka njọ tupu ị ga hụ dọkịta gị"
"O nwekwa ọgwụ ọbụla ị na-aṅụ gosi ya dọkịta na-agwọ gị ka ị nweike nata ọgwụgwọ zuru oke" ka dọkịta Abdullahi kwuru.
Ihe onyonyo ga-amasị gị












