World Kidney Day: Lee ụzọ ị ga-esi chutee ọrịa akịrị (kidney) na ndụ gị

Nri na-amasị ahụ

Ebe foto si, Foodace/Insta

    • Onye dere ya, Adline Okere
    • Ndị mere akụkọ a, Editor, BBC Igbo

BBC Igbo jụrụ onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ahụike bụ Patience Chimah gbasara nri ga-enye mmadụ ahuike.

Ọ kọwaara anyị ọtụtụ ihe e kwesịrị iri bụ nke ga-inye akịrị (kidney) gị ahụike.

Aha onyonyo, Nri ogbenye ọgalanya na-erizi

Na mbido, Chimah kọwara na akịrị bụ akụkụ ahụ mmadụ na-ewepụ atịtị maọbụ ụyi dị na mmiri n'ime ahụ mmadụ.

Nri ndị ga-enye akịrị aka nwee ahụike

Ọ sị na akịrị bụkwa ihe na-enye aka n'ịhụ na mmiri, nnu na mịneralụ na-edozi ahụ dị nhatanha n'ahụ.

Mịneralụ ndị dịka; sodiọm, kalshịọm, fosforọs na potashịọm dị n'ọbara.

Chimah bidoro nkọwa ya sị, "nri ụfọdu na-adịrị ndị nwere ọrịa kidney mma nwereike agaghị adịrị ndị ọzọ mma nihi ụdị erimodo ha nweburu n'ahụ ha."

Chimah kwuru na, "tupu anyị aga n'ihe gbasra nri dịrị akịrị mma, ka m kwusie ya ike na nri kachasị akịrị mma na nri niile n'ụwa bụ mmiri."

Mmiri ọṅụṅụ na-arụrụ akịrị omimi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mmiri ọṅụṅụ na-arụrụ dị omimi n'akịrị mmadụ site n'ispụ atịtị nọ na mmiri

Mmiri na-enye akịrị mmadụ ikikere ikwapụ atịtị nọ n'ahụ.

Nrị ndị ọzọ na-enye akịrị aka ịrụ ọrụ ọfụma:

Ndị ndị nwere Omega 3 ma nwekwa nwere abụba na mmanụ (fatty acid): Azụ titus, salmon na-eso ebudata ọgbụgba ọbara nke Bekee kpọrọ 'blood pressure' ma na-egbochikwa ọrịa akịrị.

Azụ ndụ na-enye akịrị ahụ ike

Ebe foto si, Reuters

Potato: Nwere potashiọm na odoma ndị ọzọ, mana potatoes nwereike inwe potashiọm agaghị adịrị ndị potashiọm karịrị ahụ ha mma, ha ga-akpacha anya iri potato.

Potato na-atọ ụtọ

Ebe foto si, Getty Images

Akwụkwọ nri dịka ọ na-achatụ ojii dịka ụgụ, akwukwọ nri spinach na-enye mmadụ ikikere iwepụ atịtị nri ụfọdụ na-ebute nke Bekee kpọrọ 'anti oxidant' na 'fiber', na ndị ọzọ.

Ụgụ na-enye aka echekwa akịrị gị

Ụgụ na-enye aka echekwa akịrị gị
Nkọwa foto, Ụgụ na-enye aka echekwa akịrị gị

Apples na-enye aka iwepụtụ nsogbu na-eso ọrịa akịrị.

Mkpụrụosisi apple

Nwada Patience Chimah sị na mkpụrụosisi deti (date) dịkwara ndị na-arịa ọrịa akịrị.

Gee akụkọ mere n'ụwa niile n'otu nkeji:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile