Igbo foods: Ori ji lee ụzọ ị ga-esi sie ji ka ọ tọwaa gị ntị

Ebe foto si, Instagram/Foodace,Utakaegbe1,Ntanta.delicacies
- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Mgbe gboo, otu n'ime ihe ndị e ji ama ọgaranya n'ala Igbo bụ onye ọba ji ya juru eju.
Ndị Igbo na-eji ji ama onye bụ dimkpa nakwa onye abụghị onye ume ngwụ.
Kedụ ihe ọzọ ị ma nwere ọnụ n'ala Igbo ka ji, mere o ji nwee emume nke ya a na-eme na mpaghara ụwa dị iche iche?
Ị maghị ihe anyị na-ekwu maka ya? Anyị na-ekwunu maka emume Iri Ji Ọhụrụ.
N'ihi etu ji sị dị mkpa nye ndị Naịjirịa nakwa ndị Igbo, e nwere ụzọ dị iche iche e si esiputa ya nakwa eri ya.
Ugbua a na-akwọcha ji akwọ ọ bụrụ flawa, gbaa ya n'akpa ka a na-eri ya ghara ịsụ ya asụ. A na-ejikwa ya eme ụrị n'ofe, a na-etinyekwa ya ebe a na-etinye achịcha Bekee (oven) ji sie ya.
Lee ụzọ ndị ọzọ e si eri ji na-adọ akpịrị:
1) Ji mmanụ nri

Ebe foto si, Chopilosbyslippery
Ji mmanụ dị ka "asa nwa" nye ọtụtụ ndị mmadụ, mere na ejirila ya gụọ egwu - "ji mmanụ na-atọ m ụtọ, akara na-eri m ego...".
Ụfọdụ na-eji naanị mmanụ na nnu eri ya bụ ji esiri esi, mana ị ma na i tinye ya ose na yabasị nakwa/maọbụ ịsha kpọrọ akpọ nakwa ụgba/ụkpaka, ọ bụrụ ịgba!
Ụfọdụ na-eghekpọkwa mmanụ nri a tupu e jiri ya rie ji e siri esi.
2) Ji ahụrụ ahụ/Ji kpachaa

Ebe foto si, Ijeuru
Onye ebee ka ị bụzị ma ọ bụrụ na ị maghị maka ji ahụrụ ahụ?
Nke a bụ nke e nwereike ịkpọ "eze ji niile", n'ihi etu ndị mmadụ anaghị eji ya egwu egwuregwu.
Ọ bụ ya ka e ji eme emume iri ji ọhụrụ.

Ama m na asọmmiri na-agụpụ gị n'ọnụ ugbua, ngwa were ọsọ were ije gaa chọta ya rie. Onye akpịrị!
3) Ji e ghere eghe

Ebe foto si, Instagram/Chopilosbyslippery
Ji eghere eghe dị ka iziga ji ụlọakwụkwọ, ka ọ gaa bụrụzịa "onye nlecha".
Nke a bụ nke ndị gara akwụkwọ na-akpọ "yam crisps" n'ihi etu e si eji mmanụ ọpụpa eghekpọ ya.
Ọ na-abụ eghechaa ya e were stu tomanto maọbụ ose nke a kpọrọ "pepper sauce" jiri subanye ya n'akpịrị.
I were mmanya ọtọ bịrị bịrị jiri kpọtuo nke a n'akpịrị gị, ọ dị gị ka ị nọ n'ụzọ eluigwe.
4) Ji akwụkwọ nri

Ebe foto si, Instagram/Utakaegbe1
Na a na-ekwu na ji bụ "carbohydrate" agbasaghị onye na-achọ ụzọ o si ata ahụ maọbụrụ na o were usoro a sie ji nke ya.
Ị na-ajụ "maka gịnị?" Ọ bụ makana a na-eji ọtụtụ akwụkwọ nri na-enye ihe ọma n'ahụ were kee ya ka nkwụcha wee na-eri ya.
A bịa n'ala Igbo gụwa ndị bụ "eze ji", a gụchaa ji ahụrụ ahụ, nke a na-esote ya tupu a gụọ ji mmiri ọkụ nwanne ha.
Ihe e ji esi ya gụnyere mmanụ nri, azụ ọkpọ, ịsha, nnu, yabasị, akwụkwọ nri masịrị gị, ose, ụfọdụ na-etinyekwa ogiri na ụgba, ehuru na ehu, nakwa ngwa nri ndị ọzọ na-eme ka nri tụ mmadụ n'ọnụ, anụ maọbụ azụ.
Etu ị ga-esi sie ya:
- Sinye ji gị n'ọkụ ma ị bachaa ma sachaa ya mmiri
- Tinye mmiri ị ma ga-eghe ya na nnu
- Wụbie mmiri ahụ tupu i wụnye ihe ndị ọzọ
- Ọ fọ obere ka o ghechaa, tinye mmanụ, ose na ngwa nri ndị ọzọ e ji esi ya
- Hapụ ya ka ọ sụkọọ ọnụ ma ghee eghe, werekwa ngaji na-akpagharị ya
- Wụnyezịa akwụkwọ nri gị, gbadaa ọkụ ma fọtuo ya ma ọ nọọ obere oge, ka akwụkwọ nri gị ghara ide oke odide
5) Ji agwọrọ agwọ

Ebe foto si, Instagram/Utakaegbe1
Ji agwọrọ agwọ dị ka nwaanyị di ya hụrụ n'anya nke ukwuu nye ndị Igbo.
Ị na-ajụ ajụ? Ị hụghị ụdịrị uwe a na-eyinye ya iji chọọ ya mma? Ụgba? Akịdị? Fịọ fịọ?
Ihe e ji esi ya gụnyere mmanụ nri, ịsha, nnu, yabasị, ose, akịdị, ụgba maọbụ fịọ fịọ.
Etu ị ga-esi sie ya:
- Sinye ji gị n'ọkụ ma ị bachaa ma sachaa ya mmiri
- Tinye mmiri ị ma ga-eghe ya nakwa obere nnu
- Ọ bụrụ fịọ fịọ, sie ya n'ọkụ ma sụtụ ya n'ikwe
- Ọ bụrụkwanụ akịdị, sikwaa ya n'ọkụ mana asụla ya asụ
- Were mmanụ nri ghekọlata ya n'ọkụ obere, tinye nnu, ose, ụgba
- Wụnyezie ya n'ime ji ma gwọkọta ya
6) Ji mmiri ọkụ

Ebe foto si, Instagram/Ntanta.delicacies
Nke a bụ "igwe" n'ihe gbasara ilekọta nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ oge ọmụgwọ.
Ọ bụghịkwa na ndị nkịtị anaghị eri ya, mana ọ na-adị onye mụrụ nwa ọhụrụ maọbụ onye na-arịa ọrịa ịba mma n'ahụ n'ihi na ọ na-arụ ọrụ dịka ọgwụ.
Ihe e ji esi ya gụnyere mkpụrụ na akwụkwọ ụzịza, azụ ọkpọ, ịsha, nnu, ose na-afụ ụfụ, ụtazị, ụfọdụ na-etinyekwa ogiri, ehuru na ehu, ụfọdụ na-etinye nchụanwụ, ụfọdụ na-etinyekwa okporoko nakwa anụ ewu, nnama maọbụ ọkụkọ.
Etu ị ga-esi sie ya:
- Sinye ji gị n'ọkụ ma ị bachaa ma sachaa ya mmiri, tinye ya nnu
- Wụnye ngwa nri na azụ ọkpọọ, ogiri na mkpụrụ ụzịza a sụrụ asụ n'ime ya ma kpuchizie ya ka ọ sụwa
- Ji gị ghee (dụtụ ya ihe ka ị mara), tinye ya akwukwọ ụzịza/nchụanwụ situ ya obere tupu i tinyekwa ya ụtazị
- Kpagharịa ya ọfụma n'elu ọkụ ma kupute ya ka ọ na-eku ezigbo ọkụ.
Ọ na-aka mma iri ya ka ọ na-apụ ọkụ.
7) Ji pọreji

Ebe foto si, Instagram/Foodace
Nke a bụ ji e ji aga mba.
E nwee onye mba na-amaghị ụtọ ji, ji pọteji bụ nke e ji adọbata ha makana ọ na-atọwa ntị ma e site ya nke ọma.
A na-esi ya ka ji akwụkwọ nri, kama mfechanye ka a na-efechanye akwụkwọ nri e ji esi nke a (ma ị chọo).
Ihe e ji esi ya gụnyere mmanụ nri, azụ ọkpọ, ịsha, nnu, yabasị, ose, ụfọdụ na-etinyekwa ogiri, nakwa ngwa nri ndị ọzọ na-eme ka nri tụ mmadụ n'ọnụ, anụ maọbụ azụ.
Etu ị ga-esi sie ya:
- Were mmiri ị ma ga-eghe ya hiri sinye ji gị n'ọkụ ma ị bachaa ma sachaa ya mmiri, tinyekwa ya nnu
- Wụbie mmiri ahụ tupu i wụnye ihe ndị ọzọ
- Ọ fọ obere ka o ghechaa, tinye mmanụ, ose na ngwa nri ndị ọzọ e ji esi ya
- Hapụ ụfọdụ ji ya ka o dee ede makana ọ ga-enyere aka imepụta ihe ụfodụ na-akpọ "pọtọpọtọ ji"
- Hapụ ya ka ọ sụkọọ ọnụ ma ghee eghe, werekwa ngaji na-akpagharị ya
8) Nri ji/Ji asụrụ asụ

Ebe foto si, Instagram/Utakaegbe1
Ewo o! Nke a bụ "olu gbajie ụmụnwoke na ụmụnwaanyị"!
Ị ma etu ụtara ji a sụrụ asụ si atọ? Ị nwekwara ike ire akpa gị ma ọ bụrụ na ị ritubeghi ya wee rie ya mgbe mbụ.
Ọ na-abụ e sichaa ji o dee ede a sụzịa ya asụ ọ dọọ adọ, tupu e were ofe nwere nturuugo (award) butuo ya.
9) Ji na stu akwa

Ebe foto si, Instagram/Foodace
Ị nụ na nri gụrụ mahadum, kedụ etu ọzọ e si akọwa ya na-abụghị etu a?
Ji na akwa dị ka ebe mmadụ yiri uwe dị mma ma gbaa tụsa tụsa na-esi usi ọma n'ahụ tupu ọ pụwa.
Na nri a dị mma abụghị naanị maka ihe ọ na-enye n'ahụ, ọ bụkwa maka na ọ bụ otu nri anaghị egbu oge isi.
Ị nwee ọbịa chọrọ iri nri ọsịsọ, nke anaghị ewe nkeji 15 isikọlata na ghekọlata, buputa.
Kedụ ụzọ ndị ọzọ e si esi ji ị ma?
Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri a ga-amasị gị:











