Nwaagbọghọ o ji ntuliaka họta dị ya n'Ugwu Awụsa?

Ebe foto si, @MUBARACK_UMAR
A na-akọ na ọgbara ọhụrụ batala n'omenala dịka tu nwaagbọghọ n'Ugwu Awụsa ejirila ntuliaka họrọ dị ga-alụ ya na Gaide dị na Bauchi steeti.
Akụkọ anyị nwetere bụ na otu nwaagbọghọ aha ya bụ Hajara nwere mmadụ abụọ na-abịara ya dị.
Hajara gbara afọ iri na anọ (14) amaghị onye ọ ga-ahọrọ n'ime mmadụ abụọ a.
Nke a mere ka ọ kpọkụọ ọhaobodo ka emere ya ntuliaka ga-enyere ya aka ịhọta dị ya.

Ebe foto si, @MUBARACK_UMAR
Eze obodo ahụ akpọrọ Giade bụ Mohammed Sabo Abdulkadir hiwere kọmiti ga-eme ya bụ ntuliaka nke Umar Saleh nọ n'isi ya.
Ọtụtụ mmadụ pụtara ya bụ ntuliaka, ọkachasi ụmụnotorobịa nakwa ụmụaka.
Ya bụ kọmiti mechere ya bụ ntuliaka nwoke aha ya bụ Yunusa merie.
Mana onye nke abụọ aha ya bụ Ibrahim ekweteghị na mpụtara ya bụ ntuliaka maka ọ sị na ọ bụ n'ihu be Yunusa ka anọ mee ya, nke mere ọtụtụ ndị be ha jiri pụta n'igwe bịa tụọrọ ya vootu.
Ibrahim were mkpesa gaa n'ihu eze Giade bụ Mohammed Sabo Adbulkadir.

Ebe foto si, @MUBARACK_UMAR
Eze obodo na ndị otu ya nọ ugbua elebe ya bụ okwu anya ịmata ka ha aga emegharị ya bụ ntuliaka.
Mana ka ọ dị ugbua, nwanne nne Ibrahim ya na ya bi sị na ya akwadoghị Ibrahim na ya bụ ihe ọ na-eme maka na nke ahụ bụ mmechu ihu dịịrị ezinaụlọ ya.
Ọ sị na Ibrahim bụ onye gbara afọ iri na asatọ (18) akana azụ nri etorubeghị ime ụdị ihe dị otu a na-agwaghị ha.
Ọ sị na ya anọghị n'ụlọ mgbe ihe niile a na-eme.
Na ya bata, na ya ga-atupuru Ibrahim ngwogwo ya ezi.
Ihe nkiri a maka nwaanyị lụrụ di na nka ga-amasị gị:









