Manchester City: A machiela ha n'egwuregwu Uefa afọ abụọ

Pep Gadiola nke Manchester City

Ebe foto si, Getty Images

A machiela otu egwuregwu Manchester City maka isonye n'asọmpi nke Yurop n'afọ 2020/21 ruo 2021/22 maka imebi iwu otu jikọrọ otu egwuregwu niile nke Uefa.

Iwu ndị ahụ gbasara akwụkwọ ikike ha nakwa usoro mkpata na mmefu ego nke ndị otu a.

Ọ dị ka nke ahụ ezughị, a daa ha nha ego dị Euro nde iri atọ.

Agbanyeghị, ha nwekwara ohere ịga ụlọikpe maka ịzọ isi onwe ha.

Manchester City sị na ya bụ "mkpebi wutere ha mana ọ gbagwojughị ha anya" ma sịkwa na ha "ga-aga ụlọikpe maka ya".

Ha kwuru na "otu ha na-atụkarị anya ịchọta ụzọ kwụọtọ iji leebe anya na usoro ha sị eme ihe."

N'ọnwa Disemba nke 2018 ka onyeisi nyocha nke Uefa nọ n'ọgbọ kwuputa ihe ga-abụ mpụtara nyocha ha na ntaramahụhụ so ya tupu ha ekpebie ya bụ ikpe.

Manchester City ekpesebuola otu na-ahụ maka idowe iwu maka aka enwe ha huru na ya bụ ofe gbasara ya bụ ikpe.

Ha na-ekwu na ya bụ ikpe nke naani Uefa bụ ekwuchaa ọgwụ akwụghị ọtụ ma ọlị.

Akụkọ ga-amasị gị