What is food: Ọkụ ngaji n'eze, lee ụzọ dị iche ị nwereike isi eri osikapa gị

Ebe foto si, Instagram/Foodace/Chefmide
- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Ọtụtụ ndị mmadụ nwereike iluso gị ọgụ ma ị kparịa osikapa n'ihi etu o si amasị ha iri ya.
Osikapa bụ otu nri ọ na-abụ ego kọgodu gị elu kọọ gị ala, e nwee etu i si hụ obere ego jiri gote ya, ị ga-atụkwasịnwu ya ihe ọbụla were rie ya.
N'ihi etu o si amasị ndị mmadụ, a chọpụtala ọtụtụ ụzọ dị iche iche e si esi nakwa eri ya bụ nri ọ dị mma n'ọnụ, n'afọ nakwa n'anya.
Ụfọdụ ụzọ e si eri osikapa gụnyere ịsụ ya asụ dịka ndị Ugwu Awụsa si eme nke a kpọrọ 'tuwo shịnkafa" nakwa Sịnasịr (ha na-eghe ya eghe ma a kwọchaa ya), ndị Yoroba na-esi nke ha na-akpọ osikapa ọfada, ndị ọcha na-eji nke ha eme ihe a kpọrọ 'pudding', nke bụ osikapa e siri esi dere ede ma wụnye mmiri ara ehi na shuga ma sikọta ya n'ite ka akamụ.
Ụfọdụ ihe mere e ji na-eri osikapa bụ makana ọ na-eju afọ, ọzọ bụkwa na ọ bụ nri i nwereike isi o zuoro ọha.
Ụzọ dị iche iche i nwereike iji sie ya
Osikapa Jọlọf

Ebe foto si, Instagram/FoodAce
Ị mewela emume ma ọ bụrụ na ị buputebeghị osikapa jọlọf n'emume gị?
Nri a so n'ihe mere ụfọdụ ndị mmadụ ji ekwe aga emume, n'ihi na ọ bụ mgbe ahụ ka ndị mmadụ na-ejikarị nkụ esi ya; mere ka a na-akpọ ya 'party jollof' na Bekee.
Ihe e ji esi ya gụnyere: nnu, ose, tomanto, mmanụ ọpụpa, mmiri anụ, anụ maọbụ azụ, yabasị, ngwanri na-eme ka nri tụ n'ọnụ dịka taịm na kọrị, osikapa e siri sọsọ ya.
Ụfọdụ na-aga n'ihu tinye ya ihe dị ka karọt, ose na-atọ ụtọ, agwa ndụ ndụ wdgz.
Etu ị ga-esi sie ya:
- Situ osikapa gị n'ọkụ mana ekwela ya ghee eghe tupu i fọtuo ya n'ọkụ. Wụpụ mmiri dị na ya.
- Ghee stu gị n'ite ọzọ, (ị ga-eji mmanụ ọpụpa, tomanto, nnu na ose na yabasị na ngwa nri ndị ọzọ eghe ya) tinye ya mmiri anụ gị
- Hapụ ha ka ha sụkọta ọnụ.
- Wụnye osikapa gị n'ime ya; gbado anya ka ị ghara ịwụbọ ya mmiri.
- Kpuchie ite gị ma gbadaa ọkụ i ji esi ya obere. Hapụzie ya ka o ghee nakwa ka mmiri ahụ takpọọ
- Ụfọdụ na-etinye nnu ha mgbe ha wụnyechara mmiri anụ.
Osikapa e ghere eghe

Ebe foto si, Instagram/Foodace
Ị bụ onye Naịjirịa ma ọ bụrụ na ị maghị na osikapa e ghere eghe na nke jọlọf na-azọ 'nwunye di'?
Ọ bụkwa nri ọzọ a na-ahụ ma e mewe emume na Naịjirịa; ọ bụ agbamakwụkwọ o, ikupute nwa, maọbụ akwamozu.
A na-eri ya ọsịsọ makana a hapụ ya ka o tee aka, ọ na-agbakarị ụka ọsịsọ ụfọdụ oge.
Ihe e ji esi ya gụnyere: nnu, ose, mmanụ ọpụpa, mmiri anụ, yabasị, ngwanri na-eme ka nri tụ n'ọnụ dịka taịm na kọrị, osikapa e siri sọsọ ya, anụ maọbụ azụ.
Karọt na ose na-atọ ụtọ e biri ebi, agwa ndụ ndụ, kọrị na-adịrịrị ya; a na-etinyekwa ya ọka dị ụtọ, umeji anụ e biri ebi ma sie n'ọkụ, wdgz.
Etu ị ga-esi sie ya:
- Situ osikapa gị n'ọkụ mana ekwela ya ghee eghe tupu i fọtuo ya n'ọkụ. Wụpụ mmiri dị na ya.
- Were mmanụ ọpụpa ghekọlata karọt, ose na-atọ ụtọ, kọrị na ihe ndị ọzọ ahụ i biri ebi gụnyekwara yabasị
- Wụnye mmiri anụ n'ime ite osikapa ahụ i situru esitu; hapụ ha ka ha sụkọta ọnụ
- Etinyekwala nnukwu mmiri n'ime ya ka ọ ghara ịgwọ agwọ
- Kpuchie ite gị ma gbadaa ọkụ i ji esi ya obere.
- O situ obere, wụnye ya ihe ndị ahụ i ghere eghe
- Hapụzie ya ka o ghee nakwa ka mmiri ahụ takpọọ
Osikapa na stu tomanto

Ebe foto si, Instagram/Chef Mide
Nke a mechara bụrụ ihe a na-akpọ 'osikapa ụbọchị ụka' maka etu e si esikarị ya ụbọchị ụka.
Tupu ụwa asaa anya etu ọ dị ugbua, ọ rara ahụ ịhụ ezinaụlọ ọ ga-abụ ị garuo ị hapụ ịhụ osikapa na stu tomanto ụbọchị ụka.
Ọ naghị ara ahụ isi ma ncha. Ọ naghị egbukwanụ oge.
Ihe e ji esi ya gụnyere: nnu, ose, mmanụ ọpụpa, mmiri anụ, yabasị, ngwanri na-eme ka nri tụ n'ọnụ dịka taịm na kọrị, osikapa e siri sọsọ ya, anụ maọbụ azụ.
Etu ị ga-esi sie ya:
- Sie osikapa gị ka o ghee eghe, mana etinyekwala ya ihe ọbụla (ụfọdụ na-eji nnu esi ya)
- Were mmanụ ọpụpa, tomanto, nnu na ose na yabasị na ngwa nri ndị ọzọ na-eme ka nri tọọ ụtọ ghee ya.
- Tinye ya mmiri anụ ma tomanto gị kpọtụ akpọ
Osikapa na ofeakwụ

Ebe foto si, Instagram/Foodace
Nke a bụ otu nri ndị Igbo anaghị eji egwu egwu ma ncha.
O so na nri ndị Igbo bi na mba na-eji ama na ha alọtala ma ha tinyehaala ya n'ọnụ.
Ihe e ji esi ya gụnyere: nnu, ose, mkpụrụ nkwụ, mmiri anụ/azụ, yabasị, nchanwụ, ịsha, ngwanri na-eme ka nri tụ n'ọnụ, osikapa e siri sọsọ ya, anụ maọbụ azụ.
Etu ị ga-esi sie ya:
- Sie osikapa gị ka o ghee eghe, mana etinyekwala ya ihe ọbụla (ụfọdụ na-eji nnu esi ya)
- Sie ma sụọ mkpụrụ nkwụ gị mgbe o ghere, pịpụta mmiri na mmanụ n'azụ ya ma tinye ya bụ mmiri na mmanụ ị pịpụtara n'ite, tinyekwa ya mmiri anụ/azụ ka ha sụkọta ọnụ
- Tinye ya ngwa nri ndị ahụ i kwadoro (nke e dere n'elu) ma ose ma nnu, kpuchie ya
- Chere ka ọ rọtu arọ; nke a mee i tinye ya nchanwụ ma gbadaa ọkụ
- Hapụtụ ya obere tupu i butuo ya
Osikapa na stu 'curry'

Ebe foto si, Instagram/Foodace
Nke a bụ nke a mụtara n'aka ndị mba ofesi mana ndị Naịjirịa na-esite ma na-erite ya ọnụ ha ugbua.
Ọ na-atọwa ntị ma i rie nke onye ma esi siri.
E nwereike ịkpọ nke a nri 'di m ji ego' n'ihi ụdịrị ihe ndị e ji esi ya.
Ihe e ji esi ya gụnyere: nnu, ose, mmanụ ọpụpa, mmiri anụ, yabasị, ngwanri na-eme ka nri tụ n'ọnụ dịka taịm na kọrị, osikapa e siri sọsọ ya, anụ maọbụ azụ.
Ụfọdụ na-etinyekwa karọt, ose na-atọ ụtọ, kabeeji nakwa akwụkwọ nri ndị ọzọ.
Etu ị ga-esi sie ya:
- Sie osikapa gị ka o ghee eghe, mana etinyekwala ya ihe ọbụla (ụfọdụ na-eji nnu esi ya)
- Sie anụ (tinye ya kọrị, galiki, taịm, jinja, nnu)
- Were obere mmanụ ọpụpa ghekọlata yabasị na karọt na ụmụnne ya (gbadaa ọkụ)
- Ụfọdụ na-etinye flọọ ka o nwee ike rọọ arọ
- Wụkọta ihe ị ghere eghe na anụ ahụ i siri ma kpuchie ya ka ọ sụkọta (gbadaa ọkụ gị ọfụma)
Osikapa mmanụ ndụ

Ebe foto si, Instagram/Chef Mide
I ritula osikapa mmanụ ndụ nke e ji nkụ sie? Kwuo eziokwu - ọkwa ọ fọrọ obere ka ị were ire rachaa efere gị?
Osikapa a na-atọ ụtọ mana ọ na-akacha mma iji nkụ sie ya makana ụtọ nkụ ahụ na-eme ka ọ tọwaa ntị.
Ihe ndị e ji esi ya gụnyere: mmanụ nri/ndụ, azụ ọkpọ, ịsha, nnu, yabasị, nchanwụ, ose, ụfọdụ na-eji ogiri, ehuru na ehu, nakwa ngwa nri ndị ọzọ na-eme ka nri tụ mmadụ n'ọnụ, anụ maọbụ azụ.
Etu ị ga-esi sie ya:
- Situ osikapa gị n'ọkụ mana ekwela ya ghee eghe tupu i fọtuo ya n'ọkụ. Wụpụ mmiri dị na ya.
- Sikọta mmanụ nri, azụ ọkpọ, ịsha, ose na ngwa nri ndị ọzọ ọnụ ka ọ sụkọta (ụfọdụ na-eghe mmanụ eghe tupu ha esiwe)
- Ihe ndị a sụkọchaa ọnụ, wụnye osikapa ahụ tinyezie ya mmiri ga-ezu ime ka o ghee
- Tinye ya nchanwụ na nnu ga-atụ ya ma mmiri tawa; kpuchikwaa ya
- Gbadaa ọkụ ma ọ tawa, ka ọ ghara ịgba ọkụ
Osikapa mmiri akịoyibo

Ebe foto si, Instagram/Foodace
Ị ma na a na-eji akị oyibo esi osikapa?
A na-akwọ akị oyibo ahụ, pịpụta mmiri ya were ya sie osikapa.
Ihe ndị e ji esi ya gụnyere: mmiri akị oyibo, nnu, ose, yabasị, ụfọdụ na-etinye ya tomanto, mmiri anụ/azụ nakwa ngwa nri ndị ọzọ na-eme ka nri tụ mmadụ n'ọnụ, anụ maọbụ azụ.
Etu ị ga-esi sie ya:
- Situ osikapa gị n'ọkụ mana ekwela ya ghee eghe tupu i fọtuo ya n'ọkụ. Wụpụ mmiri dị na ya.
- Ghekọlata stu, jiri obere mmanụ, wụnye ya mmiri akị oyibo nakwa mmiri anụ
- Ọ sụkọọ ọnụ, wụnye osikapa ahụ ma kpuchie ya
- Gbadaa ọkụ ma ọ tawa, ka ọ ghara ịgwọ
Osikapa na stu akwụkwọ nri

Ebe foto si, Instagram/Foodace
Nke a ga-amasị ma ndị chọrọ ịta ahụ, ndị chọrọ ọbara n'ahụ ha nakwa ndị iri akwụkwọ nri nwereike ị na-ara ahụ.
Ọ naghị egbu oge isikọlata ma ncha.
Ihe ndị e ji esi ya gụnyere: akwụkwọ nri e biri ebi, mmanụ ọpụpa, nnu, ose, yabasị, ụfọdụ na-etinye ya tomanto nakwa ịsha, nakwa ngwa nri ndị ọzọ na-eme ka nri tụ mmadụ n'ọnụ, anụ maọbụ azụ.
Etu ị ga-esi sie ya:
- Sie osikapa gị ka o ghee eghe
- Were obere mmanụ ọpụpa ghekọlata akwụkwọ nri, ị nwereike itinye ya tomanto, tinyezie ya ngwa nri ndị ọzọ
- Hapụ ya ka ọ sụkọo ọnụ ihe dị ka naanị otu nkeji maọbụ abụọ n'elu ọkụ ị gbadara agbada
Osikapa na agwa

Ebe foto si, Instagram/Matsecooks
Ọ bụrụ na ị toro n'ụlọ, nke a ga-edo gị anya ọfụma.
Ụtọ osikapa na agwa e sikọtara ọnụ ọkacha nke jọlọf, abụghị ihe a na-akọrọ mmadụ, ọ kaara gị mma na ị jiri aka gị detu ya ọnụ.
Ihe ndị e ji esi ya gụnyere: agwa, mmanụ ọpụpa, nnu, ose, yabasị, ụfọdụ na-etinye ya tomanto nakwa ịsha, nakwa ngwa nri ndị ọzọ na-eme ka nri tụ mmadụ n'ọnụ, anụ maọbụ azụ.
Etu ị ga-esi sie ya:
- Sie osikapa na agwa gị ka o ghetu eghe (ka agwa gị ka osikapa gị ghee)
- Ghekọlata stu gị
- Wụnye mmiri ga-ezu ime ka osikapa na agwa ahụ ghee
- Wụkọọ ha ọnụ n'ime ite ahụ ma kpuchie
- Tinye nnu etu o si tụ gị n'ọnụ ma hapụ ya ka o ghee ma takwaa mmiri
Ugbu a ị mụtara, kedụ nke ị ga-aga ịnwa n'usekwu gị?
Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri a ga-amasị gị:









