Eucharia Anunobi: Ọnwụ nwa ya, ijere Chukwu ozi na ihe ndị ọzọ gbasara ndụ ya ị maghị

Ebe foto si, Instagram/EuchariaAnunobi
Eucharia Anunobi bụ 'odogwu' n'ihe gbasara ime ejije na Nollywood nyere BBC Igbo ohere ibanye na ndụ ya.
Site na nkata ya na BBC Igbo kpara n'ihe nkiri 'Gịnị na-afịọ', ọ kọwara maka ọnwụ nwa ya, etu o si gbabuo ọsọ ịgara Chukwu ozi, etu o si ka na-eme ejije n'agbanyeghị na ọ bụ ụkọchukwu, nakwa ihe ndị ọzọ.
N'ọnwụ nwa ya nwoke nwụrụ n'afọ 2017 ka ọ dị naanị afọ 15, o kwuru sị "Nwa m bụ SS ma na ọ bụghị ya gburu ya, ọ bụ mmeghie ndị ụlọọgwụ".
"E tinyerem ezigbote ego n'ahụ nwa m tupu ọ nwụọ."
Ọ gara n'ihu dụọ ndị mụtara ụmụ nwere ọrịa nwa ya rịara bụ 'sickle cell disease' (SS) nke a na-akpọ ọrịa ọbara nko n'Igbo.
Na ndụmọdụ ya o kwuru sị "Onye nwa ya bụ SS, a ga na-agba mbọ inye ya ezigbote nri."
O kwukwara sị "Ị bụrụ nwaanyi ị bụru nwoke, mmadụ sị gị bịa ka m lụo gị, nyochakwa ihe Bekee n'akpọ genotype."
Ihe ndị ọzọ o kwuru:
Maka etu o si malite ijere Chukwu ozi, ọ sị "Nna m gbara mbọ hụ na anyi gụsiri akwụkwọ ike. Agụrụ m akwụkwọ dị iche iche.
"A gụrụ akwụkwọ nsọ ka m hụ ebe o dere na ndị kwesiri ị na-akpagbu ụmụ ya.
"Etu a ka akwụkwọ nsọ na ọbara Chineke siri banye anyị n'ime.
"Ọ bụ otu ọyị m nwaanyi kpọ m gaa ụlọụka n'Abụja.
"Agara m ọtụtụ ụka were hụ na ihe gbasara chukwu na-atọ m ụtọ."

Ebe foto si, Instagram/Eucharia Anunobi
"Agbara m ọsọ oku Chineke nọ na-akpọ m, mana e mechara m bịaghachị, e tee m mmanụ nsọ n'afọ 2012, m wee bido ijere Chukwu ozi".
"Ka m mere Glamour Girls nke abuọ m ọ bịa wuo ebe niile m were sị na m soro etu esi eto m, m ga-efu ụzọ.
Eucharia kwukwara na ọ ka na-eme ejije; o kwuru na nke o mere nso nso a bụ nke a kpọrọ "small chops".
Gere ihe ọ gwara BBC Igbo n'uju n'elu:
Akụkọ ndị a ga-amasị gị:









